Anyị anabataghị abalị iri CBN ji gbatịa oge a ga-akwụsị naịra ochie - Ndị Omeiwu

Ebe foto si, Frontline
Kọmiti ndị ụlọ omeiwu nta ehibere maka ileba anya n'okwu gbasara mgbanwe ego naịra ekwuola na ha anabataghị abali iri onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele ji gbatịa ụbọchị a ga-akwụsị iji naịra ochie eme ihe.
Onyeisi kọmiti a bụ Alhassan Ado Doguwa kwuru na ha bụ ndị ụlọ omeiwu nta ga-aga n'ihu binye aka n'akwụkwọ ka ejichie Godwin Emefiele ma manye ya ka ọ bịa zaa ndị omeiwu oku ha na-akpọ ya.
Ado-Doguwa kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Sọnde, Jenụwarị 29, dịka Emefiele kwupụtara na CBN agbatịala ụbọchị ha nyere iji kwụsị naịra ochie.
Emefiele kọwara na ọ bụ onyeisiala Muhammadu Buhari nyere nkwado ka e nyekwuo ndị mmadụ ụbọchị iri - malite n'ụbọchị 31 nke Jenụwarị ruo ụbọchị 10 nke Febrụwarị 2023 - ka ndị mmadụ gaa gbanwee ego ochie ha n'ụlọakụ ma nweta ego ọhụrụ.
Mana Ado Doguwa kwuru na inye naanị ụbọchị iri agaghị amịta mkpụrụ ọbụla
Ihe mere Buhari ji kwete mgbatị ụbọchị a ga-akwụsị naịra ochie - Godwin Emefiele

Ebe foto si, @GODWIN EMEFIELE/TWITTER
Ụlọakụ etiti nke Naịjirịa agbatịala oge ha tinyere maka ịkwụsị iji ego naịra ochie atụ mgbere ahịa.
Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara taa bụ Sọnde abalị 29 nke ọnwa Jenụwarị 2023.
O wepụtara akwụkwọ ozi a dịka ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari nwechara ọgbakọ na Daura, Katsina Steeti.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Emefiele kwuru na obi dị ha ụtọ na atụmatụ mgbanwe naịra mịtara mkpụrụ maka na ihe ruru pasentị 75 ego niile dịbu n'aka ndị mmadụ alọghachila n'ime ụlọakụ dịka ha tụrụ anya.
Mana ọ kọwara na Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere nkwado ka ha gbatịa oge a ga-akwụsị iri ego ochie "iji nye ohere ka ndị ka nwere ego naịra ochie n'ụlọ ha nwee ike ịga tinye ya n'ụlọakụ".
"Anyị na-enyekwa ụbọchi iri ọzọ, malite n'ụbọchị 31 nke Jenụwarị 2023 ruo ụbọchị 10 nke Febrụwarị 2023, ka ndị mmadụ, ọ kachasị ndị bi n'ime obodo nwee ohere ịgbanwe ego ochie ha ma nweta nke ọhụrụ," Emefiele kwuru.
"Ọ gafee ụbọchị ahụ (Febrụwarị 10), mmadụ agaghị enwezi ike iji ego ochie tụọ mgbere ahịa na Naịjirịa.
"Ndị ọrụ anyị na ndị ọrụ EFCC na ICPC na-agba mbọ ugbua ịhụ na atụmatụ a gara n'ihu."
Emefiele kwukwara na CBN nyekwara ohere ụbọchị asaa ọzọ, malite n'ụbọchị 10 nke ọnwa Febrụwarị ruo ụbọchị 17 nke Febrụwarị iji nye ohere ka ndị ka nwere ego ochie gaa tinye ya n'ụlọọọrụ ụlọakụ etiti, mana ha agaghị enwe ike iji ya tụọ mgbere ahịa.
Ndị mmadụ akwụnyela ego ruru otu tarị naịra na ụma kamgba CBN malitere ịnakọ ego ochie
Dịka Emefiele si kọwaa n'akwụkwọ ozi ya, kamgbe CBN kwupụtara maka naịra ọhụrụ nakwa nkwụsị naịra ochie, ndị mmadụ akwụnyela ego dị otu tarị naịra na ụma itoolu (N1.9 trillion) n'ụlọakụ dị icheiche.
Ihe fọdụrụ n'aka ndị mmadụ ugbua bụ ihe dịka ijeri naịra narị itoolu (N900 billion).
"N'afọ 2015, ego niile a na-eri na Naịjirịa dị otu tarị naịra na ụma anọ (N1.4 trillion), mana n'ọnwa Ọktoba 2022, ego niile na-akpagharị na Naịjirịa dị tarị naịra atọ na ụma (N3.23 trillion), mana ọ bụ sọ naanị ijeri naịra narị ise dị n'ụlọakụ dị icheiche.
"Ihe ruru tarị naịra abụọ na ụma asaa (N2.7 trillion) ka ndị mmadụ dobere n'ụlọ ha dị icheiche."
Ọ bụ nke a kpatara CBN ji gbanwee ego naịra iji mee ka ndị niile debere ego n'ụlọ ha dị icheiche weghachi ya n'ụlọakụ ebe o kwesịrị ịdị.
Gịnị bụ 'naira redesign policy'?
N'ụbọchị 26 nke ọnwa Ọktoba 2022 ka ụlọakụ etiti kwupụtara atụmatụ ịgbanwe ego naịra nke N200, N500, na N1000.
Godwin Emefiele bụ onyeisis CBN kwuru na ha na-eme nke a n'ihi na ego dị n'aka ndị mmadụ nkịtị na Naịjirịa karịrị ego dị n'ụlọakụ, nke na-abụghị etu ihe kwesịrị ịdị.
Ọzọkwa bụ iji gbochie ndị na-ebipụta naịra adịgboroja iji ya na-aghọgbu ndị mmadụ, nakwa igbochi mpụ dị icheiche a na-eji ọkpụrụkpụ ego eme.
N'ihi nke a, CBN chọrọ ka ndị mmadụ gaa kwụnye ego ochie ha n'ụlọakụ iji nara ego ọhụrụ.
CBN kwukwara na mmadụ agaghị enweike ịdọrọ ego karịrị N100,000 kwa izuụka, maọbụ N20,000 kwa ụbọchị; mana ha mechara bulie ya ka ọ bụrụ N500,000 kwa izuụka maọbụ N50,000 kwa ụbọchị.
Ha kwuru na ọ bụ malite n'ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba ka a ga-amalite ikesa ego naịra ọhụrụ ahụ ruo n'ụbọchị 31 nke ọnwa Jenụwarị oge a ga-akwụsị iji ego ochie ere maọbụ azụ ahịa.
Mana ọtụtụ kwuru na ha ahụbeghị ego ọhụrụ ahụ n'agbanyeghị na ụbọchị e kwuru na a ga-akwụsị ego ochie eruola nso.
Ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị katọkwara ya bụ atụmatụ, na-ekwu na ọ ga-etinye ndị mmadụ n'ahụhụ.
Ndị ụlọomeiwu nta Naịjirịa kpọrọ Godwin Emefiele oku ka ọ bịa kọwaara ha maka atụmatụ mganwe ego a, mana Emefiele agaghị dịka ndị ọrụ CBN kwuru na ọ nọghị na Naịjirịa n'oge ahụ.
Dịka Emefiele lọghachiri Naịjirịa, ndị omeiwu kwuru na ọ bụrụ na ọ bịaghị za ha oku, na ha ga-enye onyeisi ndị uweojii ikike ka o jichie ya ma manye ya ka ọ bịa kọwaara ha maka atụmatụ ahụ.
N'ọdị nso a, ndị ụlọ omeiwu sineti kpebiri na CBN ga-ebugharị ụbọchị a ga-akwụsị ego naịra ochie ruo ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa June 2023.
Mana n'ụbọchị Sọnde, Jenụwarị 29, 2023, Emefiele gara Daura, Katsina Steeti, bụ obodo Onyeisiala Muhammadu Buhari, ebe ha abụọ nọrọ nwee ọgbakọ gbasara atụmatụ mgbanwe ego naịra nakwa oge e tinyere iji mee ya.
Ọ bụ dịka ha nwechara ọgbakọ ahụ ka Emefiele kwupụtara na Buhari nyere nkwado ya ka CBN gbatịa oge a ga-akwụsị iri ego naịra ochie, malite n'ụbọchị 31 nke Jenụwarị ruo ụbọchị 10 nke Febrụwarị.
Kama ọ dị ka mgbatị a ejughị ndị omeiwu afọ.








