Gịnị na-esere onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele na ndị DSS?

Ebe foto si, DSS/AFP
Ụlọakụ etiti Naịjirịa ekwuola na onyeisi ha bụ Godwin Emefiele amalitela ọrụ ọzọ dịka ọ gachara ezumike, mana asịrị na-efegharị ebe niile na ndị ọrụ nchekwa nzuzo bụ 'Department of State Service' na-achọ ijichi ya.
N'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru CBN bụ Osita Nwanisobi wepụtara, o kwuru na Emefiele dị uchu ịrụ ọrụ ya dịka a na-atụ anya ọgbakọ nke otu a kpọrọ 'Monetary Policy Committee' n'ụbọchị 23 na 24 nke ọnwa Jenụwarị 2023.
Mana n'aka nke ọzọ, ndị DSS wepụtakwara akwụkwọ ozi ma kwuo na ọbụghị eziokwu na ha gara n'isiụlọọrụ ndị CBN ịga jide Emefiele dịka akụkọ si efesa.
Mana kedụ ka okwu nwụchi Emefiele si ruo ebe a?
Ebe akụkọ ijichi Emefiele si malite

Ebe foto si, AFP
N'ọnwa Disemba afọ 2022 ka akụkọ pụtara na-ekwu na ndị DSS na-achọ ijide Emefiele.
Nke a na-abịa dịka otu ụlọikpe n'Abuja jụrụ inye ndị DSS ikike ka ha jide Emefiele n'agbanyeghị ebubo ndị DSS boro na Emefiele na-eji ego akwado ndị na-eyi ndụ egwu.
Mana Ọkaikpe John Tsoho kụchapụrụ mkpesa ahụ ndị DSS wetara ma kwuo na ha egosighi ihe akaebe ọbụla iji kwadoo ebubo ha na-ebo Emefiele.
Tsoho kwukwara na Onyeisiala Muhammadu Buhari, onye nyere Emefiele ọrụ dịka onyeisi CBN, kwesịrị ịma maka atụmatụ ndị DSS ijide ya.
N'akwụkwọ ikpe ahụ nke BBC hụrụ, Ọkaikpe Tsoho gwara ndị DSS sị: "Onye ụnụ na-ebo ebubo a bụ nwoke aha ya bụ Godwin Emefiele, mana ụnụ edeghị ma ọ bụ Godwin Emefiele nke bụ onyeisi ụlọakụ etiti.
"Ọ bụrụ na ọ bụ ya, ọ pụtara na ọ bụ onye welitere isi na gọọmentị Naịjirịa, mana ụnụ etinyeghị ihe akaebe ọbụla nke gosiri na Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere nkwado maka ihe a ụnụ chọrọ ime."
Tsoho gara n'ihu kwuo sị: "Ọ na-adị m ka ụnụ achọrọ iji ụlọikpe a wee nata ohere ime ihe ezighi ezi. Agaghị m anabata ya."
Okwu gbasara naịra ọhụrụ

Ebe foto si, Presidency
Kamgbe ụlọakụ etiti kwupụtara maka mgbanwe ego naịre ochie na mwebata naịra ọhụrụ, Godwin Emefiele aṅụbeghị mmiri tọgbọ iko.
Nke mbụ bụ na ndị ụlọ omeiwu Sineti anabataghị atụmatụ ahụ, ọ kachasị mgbe Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed kwuru na ya amaghị maka mgbanwe ego ahụ.
Ọzọkwa, ndị omeiwu nta kpọrọ Emefiele oku ka ọ bịa zaa ajụjụ ụfọdụ gbanere ego naịra ọhụrụ nakwa etu ọ ga-esi metụta ọnọdụ akụnụba Naịjirịa.
Ụfọdụ ndị otu na-agba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ, nakwa ndị pati na-anọghị n'ọchịchị, mere ngagharịiwe iji gosi nkwado ha maka ihe Emefiele na-eme.
Ndị a jikọrọ ọnụ n'otu a kpọrọ 'Coalition of National Interest Defenders (CNID) boro DSS ebubo na ọ bụ maka ihi atụmatụ ndị a Emefiele wepụtara ka ha ji achọgharị ya ka ha jide.
Otu a kpọkwara onyeisiala Buhari nakwa ọkaiwu gọọmentị bụ Abubakar Malami ka ha tinye ọnụ na ya bụ okwu.
Okwu a metụtara nchekwa obodo Naịjirịa - DSS
Ndị DSS kọwara na ihe ha na-eme bụ nnyocha n'okwu gbasara nchekwa Naịjirịa.
Ha kwukwara na ha ga na-arụ ọrụ ha n'ụzọ ọ ga-adịrị Naịjirịa mma.
Peter Afunanya bụ ọnụ na-ekwuru DSS kwuru na ha agaghị ege ntị n'asịrị maọbụ akụkọ dị icheiche ndị mmadụ na-agbasa megide ha.
"Anyị agaghị enye ohere ka ndị okwu asị na ndị aghụghọ megharịa ọha obodo anya, ọ kachasị n'okwu gbasara nchekwa Naịjirịa," Afunanya kwuru.
Ihe ndị a niile mere tupu Emefiele amalite ọrụ n'ụbọchị Mọnde, abalị iri na isii nke ọnwa Jenụwarị 2023, dịka akụkọ na-ekwu na ndị DSS gara n'ụlọọrụ Emefiele ijide ya - mana ha mechara kwuo na ọ bụghị eziokwu.








