Ihe mere ndị mmadụ ka ji ekwu maka Bishọpụ sekpuuru Peter Mba ala

Ebe foto si, Nike Diocese/Peter Mbah/Facebook
Ọtụtụ ndị mmadụ ka na-ekwu maka onyonyo gosiri ebe otu Bishọp na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ sekpuru ala n'ihu otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ihe a ka bụ okwu ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ n'agbanyeghị na o mere kamgbe ụbọchị 29 nke ọnwa Jenụwarị afọ a, ihe dịka izuụka abụọ gara aga.
Ụfọdụ mmadụ na soshal midịa katọrọ Bishọp a bụ Christian Onyia nke ụka Anglịkan dayosis Nike, Enugwu Steeti, onye a sị sekpuru ala n'ihu onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti n'otu 'Peoples Democratic Party' (PDP) bụ Peter Mba.
Mana ụfọdụ ndị ọzọ na-ekwu na ya bụ okwu erijughị afọ maka na ọ bụ umeala na nkwanye ugwu ka Bishọp Onyia gosiri Mbah.
Nke a na-abịa dịka onyonyo pụtara maka ihe mere n'ụlọụka 'Cathedral Church of St Cyprains' Nike, Enugwu Steeti, n'ụbọchị 29 nke ọnwa Jenụwarị 2023.
Onyonyo gosiri ebe Bishọp Christian Onyia na-agwa Peter Mba okwu n'ime ụlọụka, bịa sekpuo ala n'ihu ya, nke mere ka Peter Mba n'onwe ya sekpurukwa ala.
Akụkọ kwuru na Bishọp Onyia na-arịọ Peter Mbah ka ọ gaa nọdụ ala n'ihu oche mana Mba rịọrọ ka ọ nọdụ n'azụ ebe ọ nọ n'ihi na ọ bịaghị n'oge na ya bụ mmemme.

Ebe foto si, Screengrab
Otu onye akara Twitter ya bụ @Gah_bbrielle katọrọ ya bụ ihe ma kwuo: "Naanị na Naịjirịa ka Bishọpụ maọbụ ụkọchukwu ga-esekpuruala n'ihu onye na-azọ ọkwa ọchịchị. Maka gịnị? Tụfịa!"
Onye ọzọ aha ya bụ Raymond Arinze kwuru na bishọp ahụ "emechuola ndị ụka Anglịkan niile ihu" n'ihi ihe o mere.
Mana otu onye aha ya bụ Buchi Nnaji kwuru na ya bụ ihe "gosiri umeala nakwa nkwanye ugwu Bishọpụ na Mbah nwere nye onwe ha".
Ụka Anglịkan nke Enugwu ekwubeghị ihe ọbụla maka nke a, mana otu ụkọchukwu Anglịkan bụ Canon Alex Uzor dere akwụkwọ ozi iji kọwaa ihe o che mere n'ụbọchị ahụ.
"Bishọp (Onyia) isekpu ala n'ihu Peter Mba abụghị maka ndọrọndọrọ ọchịchị, kama ọ bụ nsọpụrụ na ngosipụta enyi na enyi. Ugwu ya dịka Bishọp emetọghị n'ihi ihe o mere," Canon Uzor dere.
"Site n'igosipụta umeala na nsọpụrụ, Bishọp ahụ egosila na o nweghị mpako n'ebe ndị ọ na-elekọta nọ, ma bụrụkwa onye dị njikiere ịgụnye ndị ọzọ tupu ọ gụnye onwe ya."

Ebe foto si, AFP
Nke a abụghị nke mbụ onye isi ụka welitere isi ga-esekpu ala n'ihu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'ọnwa Eprel 2019, Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis sekpuru ala ma susuo ụkwụ ndị ọchịchị mba South Sudan ọnụ, iji rịọ ha ka ha kwụsị esemokwu nakwa ọgbaaghara dị n'etiti ha.
Ndị ọchịchị ahụ bụ Onyeisiala South Sudan bụ Salva Kiir na onyeisi ndị ọgụ nnupuisi na mba ahụ bụ Riek Machar.
Oge ha gara njem nleta na Vatican na 2019, Pope Francis gburu ikpere n'ala, susuo ụkwụ ha ọnụ ma rịọ ha sị: "Ana m arịọ ụnụ dịka nwanne ka ụnụ biri n'udo. Esi m n'obi m na-arịọ ụnụ, ka anyị gaanụ n'ihu."









