Ihe Fr Mbaka kwuru maka ego Naira ọhụrụ,Nnamdi Kanu

Ebe foto si, AMEN TV
Ụkọchukwu Katọlik a ma ama na Naịjiria bụ Ejike Mbaka akpọkuola gọọmentị Naịjirịa ọzọ ka ha tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu, bụ onyeisi otu na-azọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob).
Fada Mbaka katọrọ ụkọ ego Naira ọhụrụ si na o butere ụmụ Naijiria nnukwu ahụhụ nke o kwuru nwere ike immetụta ntuliaka na abịa.
Mbaka kpọrọ oku n'ọgbakọ ekpere o nwere n'ọdịnso a dịka o kwuru na "ọ bụ naanị na Naịjirịa ka ụlọikpe ga-atọhapụ mmadụ, gọọmentị asị mba ma ka jichie onye ahụ".
"Ya mere na maasị a, anyị na-eweli aka anyị na-ekpe ekpere maka ntọhapụ Nnamdi Kanu n'uju."
Mbaka kwuru na njichi Kanu emeela ka ndị mmadụ na mpaghara ala Igbo na-ata ahụhụ ihe na-agbasaghị ha.
"Ụmụ akwụkwọ anaghị agazi akwụkwọ, ndịọrụ anaghị aga ọrụ, ụbọchị Mọnde akpọchie ebe niile."

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu Nigeria
Cheta na kemgbe gọọmentị Naịjirịa jichiri Nnamdi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa n'ọnwa June 2021, ndị otu Ipob tinyere iwu na onweghị onye ga na-apụta iro na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa niile kwa ụbọchị Mọnde ọbụla iji gosipụta iwe maka ihe gọọmentị mere.
Ipob mechara kwuo na ha ewepụla iwu a ma gwa ndị mmadụ ka ha pụtawa n'ụbọchị Mọnde, mana ụfọdụ ndị otu Ipob ekwetaghị n'iwu a.
Ndị a kewapụrụ ma kpọọ onwe ha 'autopilot'. Ha na-aga n'ihu na-amanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị Mọnde ọbụla.
Ọtụtụ akụkọ apụtala etu e si wakpo ndị pụtara ụbọchị Mọnde, mebie ụlọahịa nakwa ngwa ahịa ha, ụfọdụ ka a kpọrọ ụgbọala ha ọkụ, ụfọdụ kwa ka e gburu egbu.
N'ihi nke a, na steeti ise niile dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ụbọchị Mọnde na-abụzi ụbọchị ezumike maka na onweghị onye ụjọ na-ekwe ka ọ pụọ iro.
Fada Mbaka katọrọ etu ndị ọchịchị Naịjirịa si na-akpa agwa ka a ga-asị na ihe na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa agbasaghị ha.
'Judiciary' Naịjirịa bụzị ihe egwuregwu

Ụkọchukwu Mbaka kwukwara na etu gọọmentị si kachie ntị jide Mazi Kanu n'agbanyeghị na ụlọikpe atọhapụla ya, gosiri na ngalaba 'executive' nke gọọmentị Naịjirịa na-eleda ngalaba 'judiciary' anya.
"Ebe ọ bụ na ụlọikpe ga-enye iwu, gọọmentị ajụ ime ya, ọ pụtara na ngalaba ikpe ziri ezi na Naịjirịa enweghịzi isi," Mbaka kwuru.
"Taa ọ bụ Nnamdi Kanu ka e ji, echi o nwereike ịbụ gị ka a ga-ejide, ụlọikpe sị ka a hapụ gị, gọọmentị asị mba."
"Ijichi Nnamdi Kanu dịka ịmetụ aka na 'trigger' ebe e si agbapụ egbe."
"Ebe ọ bụ na ụlọikpe ekwuola ka a tọhapụ Kanu, gịnị mere na gọọmentị agaghị atọhapụ ya, ọ kachasị maka ọnọdụ ahụike ya?" Mbaka jụrụ.
Etu Ikpe Nnamdi Kanu dị ugbua

Ebe foto si, Reuters
Ka ọ dị ugbua, ikpe Nnamdi Kanu dị n'ụlọikpe kachasị, dịka gọọmentị Naịjirịa na-agbagha mkpebi ụlọikpe mkpegharị nyere ka a tọhapụ ya.
N'ụbọchị 13 nke Ọktoba 2022 ka ụlọikpe mkpegharị Naịjirịa nyere iwu ka gọọmentị hapụ Mazi Kanu.
Ụlọikpe kpebiri na etu e si nwụchie Mazi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya n'ike na Naịjirịa megidere iwu, nke pụtara na onweghị ebubo ọbụla gọọmentị ga-ebo ya n'ọnọdụ ahụ nke ga-achịta aja.
Mana ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami kwuru na gọọmentị agaghị ahapụ Kanu, kama ha ga-ewepụ ikpe ahụ n'ụlọikpe kachasị.
Kamgbe ahụ, ụlọikpe kachasị etinyebeghị ụbọchị a ga-ekpe ikpe ahụ iji mara ma a ga-ahapụ Mazi Kanu ka ọ ka ga-anọ na mkpọrọ.
Gọọmentị na-ebo Nnamdi Kanu ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Gọọmentị machikwara otu Ipob ma kpọpụta ya dịka otu na-eyi ndụ egwu.









