Etu ndị 'unknown gunmen' si dulaa ndị uweojii abụọ mmụọ n'Enugwu

Ndị uweojii nọ na 'checkpoint'

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ awakpola ma gbuo ndị uweojii abụọ si n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Uwani, Enugwu, n'ụbọchị Sọnde, bụ ụbọchị 26 nke ọnwa Maachị 2023.

Ọ bụ n'okirikiri 'Osadebe street' nke dị nso n'ụlọakwụkwọ Mahadum UNEC ma dịkwa nso n'ahịa a na-akpọ 'Kenyatta' ka ya bụ ihe mere, dịka ndị uweojii ahụ nọ n'ọrụ.

Ndị bi nso ebe ahụ kwuru na mwakpo a mere n'ebe elekere iri na otu n'ọkara nke ụtụtụ. Ndị ojiegbe ahụ bu ụgbọala SUV gafeta wee malite ịkwa ndị uweojii mgbọ.

Ha gbagburu ndị uwe ojii abụọ, mana ndị ụwojii busokwara ha agha dịka ndị nọ nso n'ebe ihe a mere si kwuo.

Ọnụ na ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Daniel Ndụkwe wepụtara akwụkwọ ozi ma kwuo na ya bụ ihe mere eme n'ezie; "anyị ebugala ndị Uweojii abụọ ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ ebe a na-edobe ozu".

Ndukwe kwuru na ndị uwe ojii gbatara ndị omekome ahụ egbe nke oma, ma kpọkuo ndị ọha obodo ka onye ọbụla mepee anya ya na ntị ya ma wetara ha ozi ma ha hụ onye ọbụla bụ mgbọ egbe gaa ụlọọgwụ ọbụla ịnara ọgwụgwọ.

"Anyị na-arịọkwa ndị ụlọ ndobe ozu niile nọ n'Enugwu ka ha gwa anyị maka ozu ọbụla bụ apa mgbọ egbe ebutere na nke ha."

"Kọmishiona Uweojii n'Enugwu bụ Ahmed Ammani enyela iwu ka a malite nnyocha ngwangwa iji chọta ndị kpara ike ọjọọ a na-atụfughị oge."

Ndukwe gara n'ihu kwuo na ndị uwe ojii chụrụ ndị ojiegbe ahụ ọsọ, ha wee hapụ ụgbọala ha ji mee mwako ahụ gbaa ọsọ.

"Ọbara juputara n'ụgbọala ahụ oge anyị hụrụ ya gosiri anyị n'ezie na mgbọegbe tụrụ ọtụtụ n'ime ha, ma rụtụkwa aka na ụfọdụ nwereike ịnwụ," Ndukwe kwuru.

Ndị ojiegbe ịwakpo ndị ọrụ nchekwa abụzighị akụkọ ọhụrụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa dịka ọnọdụ nchekwa na-akwanye njọ.

Mana ụdị akụkọ ahụ kwụsịtụrụ kamgbe ihe dịka otu ọnwa ugbua dịka a na-eme ntuliaka ọkwa Onyeisiala, ndị omeiwu etiti, gọvanọ steeti nakwa ndị omeiwu steeti dị icheiche.

Ntuliaka a malitere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị ma kwụsị n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị afọ a.

Ndị uweojii na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu 'Independent People of Biafra' (Ipob) - ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara Biafra - na-eme mwakpo ndị a.

Mana ugboro ugboro ka ndị Ipob gọrọla na ọ bụghị ha.