Ihe mere mgbe ndị uweojii na ndị ojiegbe kwara mgbọ n'Aba

Otu onye uweojii anwụọla mgbe ndị uweojii ngalaba Ndiegoro dị n’Aba na ndị ekperima kwatara mgbọ n’ụbọchị Tuzde 17 Jenụwarị 2023.
Otu onye ntaakụkọ kwuru na ndị uweojii gbukwara mmadụ abụọ n’ime ndị otu ahụ ebe ndị ọzọ bu mmerụ ahụ gbaa ọsọ.
A sị na ndị ojiegbe weere egbe AK47 nke onye uweojii ahụ e gburu nakwa na mgbọ egbe ya.

Ebe foto si, Getty Images
Kepukepu kwuru na nke a mere mgbe ndị uweojii nọ n’ọrụ n’ogbe ahụ gara ebe a na-ere ọgwụike ị ga nara ‘oke ruru’ ha.
Ndị ojiegbe bu ọgbatumtum chụrụ ha bịa ebe ahụ ma malite ịgba ha egbe nke mere ha jiri na-akwakọrịta onwe ha mgbọ.
Nke a mere ndị niile bi n’ogbe ahụ nakwa ndị na-ere ihe n’ahịa Ihie Orji dị nso ebe ji gbaa ọsọ ma zọrọ isi onww ha.
Otu onye hụrụ ka ihe si mee sị na “e gburu otu onye uweojii nakwa mmadụ abụọ ndị ọzọ a sị bụ ndị ojiegbe ahụ”.
Mgbe nke a mechara ndị no n’ogbe ahụ ehighi ụra n’abali dịka a sị na ndị uweojii bịara na-anwuchi ndị mmadụ n’ike

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abia Steeti bụ Geoffrey Ogbonna boro ebubo na ọ bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) kpara arụ ahụ.
Ogbonna gọrọ sị na ndị uweojii ahụ agaghị ebe a na-ere ọgwụike ịnara ego kama na ọ bụ ọrụ mkpagharị ka ha na-arụ mgbe a wakporo ha.
Ọ gara n’ihu kpọpụta akara nakwa njirimaara egbe AK47 onye uweojii ahụ ndị ojiegbe a weere.
Nke a abụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme na mpaghara Aba, n’afọ 2019 ndị uweojii si na Ndiegoro wuchikwara n’ebe a kpọrọ Oko Jumbo ma mebie ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ.









