Ndị uweojii anọ, ndị ojiegbe atọ lara mmụọ na mwakpo n'Awada 'police station'

Ndị uweojii Anambra

Ebe foto si, Anambra Police

Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii Anambra Steeti bụ Echeng Echeng (onye kpu ugogbe anya) gara n'Awada ebe mwakpo a mere

Ndị uweojii Anambra egbuola mmadụ atọ n'ime ndị ekperima wakporo ụlọọrụndị uweojii n'Awada obosi, Anambra Steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Toochukwu Ikenga kwuru na mwakpo a mere n'isi ụtụtụ taa bụ Mọnde, ụbọchị 20 nke ọnwa Febrụwarị 2023.

"Ebumnuche ha ji mee mwakpo a bụ ịmebi ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ma gbaa ya ọkụ, mana ndị uweojii busoro ha agha ma gbatuo mmadụ atọ n'ime ha," Ikenga kwuru.

"Anyị nwụchikwara mmadụ abụọ ọzọ ndị anyị na-enyo na ha so mee mwakpo ahụ."

"Ọ bụ ihe mwute na ndị uweojii anọ tufuru ndụ ha na mwakpo a, ụfọdụ akụkụ ụlọọrụ ndị uweojii gbara ọkụ ebe otu ụgbọala ndị uweojii na ụgbọala atọ dị n'ogige ụlọọrụ ahụ gbara ọkụ."

Ikenga kwuru na ndị uweojii nwetara n'aka mmadụ atọ a egbe AK47 atọ, otu egbe 'pump action', otu ụgbọala Lexus, otu ọgbatumtum Kymco, ọtụtụ ọgwụ ha kere n'ukwu.

Mwakpo nke a na-abịa dịka ndị ojiegbe wakpokwara ụlọọrụ ndị uweojii dị na mpaghara 3-3 Nkwelle-Ezunaka, n'okpuru ọchịchị Oyi, Anambra steeti, n'isi ụtụtụ ụbọchị Sọnde, Febrụwarị 19.

Etu ndị ojiegbe si wakpo mpaghara 3-3, Onitsha n'ụtụtụ Sọnde

Unknown gunmen

Ndị bi na mpaghara 3-3 n'Onitsha, Anambra Steeti ji ụjọ na obi mmapụ bilite n'ụra n'ụtụtụ Sọnde, Febrụwarị 19, dịka ụdaegbe na-ada aghara aghara na mpaghara ahụ.

Dịka ndị bi na mpaghara ahụ si kọọrọ BBC Igbo n'ebe elekere ise nke isi ụtụtụ ka ha malitere ịnụ ka ụdaegbe na-ada, nke mere ka ụjọ jide onye ọbụla.

"Mụ onwe m na-agakarị ụka isi ụtụtụ n'ụbọchị ụka ọbụla, mana oge egbe maliere ịda ebe niile, enweghị m ike ịga ụka," otu nwaanyị na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya kwuru.

"Ọ bụ oge chi fosara nke ọma ka anyị nụrụ na ọ bụ ụlọọrụ ndị uweojii dị na mpaghara '3-3 junction' ka ndị ojiegbe ahụ wakporo."

Nwaada a kwuru na ndị bi nso n'ụlọọrụ ndị uweojii ahụ kwuru na ha hụrụ ebe ụfọdụ ụmụ okorobịa e jibu na mkpọrọ n'ebe ahụ gbapụtachara dịka ndị ojiegbe ahụ wakporo.

Mwakpo a na-abịa dịka ọ gafere naanị otu ụbọchị ndị ojiegbe wakpokwara ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogidi, Anambra Steeti, gbuo ndị uweojii atọ.

Anyị gburu ndị ojiegbe isii wakporo anyị na 3-3 - Ndị uweojii

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Toochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ha dị na 3-3, Nkwelle-Ezunaka n'ụtụtụ ụbọchị Sọnde, mana ndị uweojii busoro ha agha ma gbuo mmadụ ise n'ime ha.

Ikenga kwuru sị: "Taa bụ ụbọchị 19 nke Febrụwarị 2023, n'ebe elekere 5:58 nke ụtụtụ, otu ndịọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii na ndị agha gburu ndị ojiegbe isii, napụta ha egbe AK47 abụọ, otu ụgbọala Sienna, ọgwụ dị icheiche na ihe ndị ọzọ."

"Ndị ojiegbe isii a wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na 3-3, Nkwelle-Ezunaka, n'okpuru ọchịchị Oyi.

"Ha ji egbe na ogbunigwe dị icheic ma malite ịgba egbe aghara aghara iji banye n'ime ụlọọrụ ndị uweojii ahụ, mana ndị ọrụ nchekwa busoro ha agha.

"Dịka a na-akwa mgbọ, mgbọ tụgburu otu onye uweojii, otu ụlọ n'ime ụlọọrụ ndị uweojii na otu ụgbọala gbakwara ọkụ.

"Ebe niile ederela jụụ ugbua dịka ndị ọrụ nchekwa na-agagharị ịhụ na nsogbu ọbụla adịghị."