Ndị omekome egbuola ndị uweojii atọ n'Anambra Steeti

mgbe awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Obosi

Ebe foto si, ABS

Nkọwa foto, Foto a bụ mgbe awakporo ụlọọrụ ndị uweoji n'Obosi n'afọ 2021

Ndị uweojii Anambra Steewti ekwuola na ndị omekome egbuola ndị otu ha mmadụ atọ dịka ha wakporo ụlọọrụ ndị uweojii nke dị n'obodo Ogidi nke nọ n'okpuruọchịchị Idemmili Nọt nke steeti ahụ.

Mwakpo a mere n'isi ụtụtụ ụbọchị Fraịde, abalị 18 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Tochukwu Ikenga kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara iji kọwaa etu ya bụ mwakpo si mee.

O kwuru sị: "Ndị omekome a bidoro gbawa egbe aghara aghara dịka ha bịarutere ụlọọrụ ndị uweojii, ha tụrụ ogbunigwe akpụrụakpụ, ya na ogbunigwe eji mmanụ ụgbọala rụọ. Ọ bụ ya mere ha jiri nwe ohere bata ogige ndị uweojii a. Dịka o siri dị, ụfọdụ ụlọ nọ n'ogige gbara ọkụ."

Ikenga kwuru na obi dị ha mwute maka ndị otu ha nwụrụ nakwa ihe e mebiri, ma rịọ ndị Anambra Steti ka ha ghara ịtụ ụjọ n'ihi na ndị uweojii dị njịkere igbochi ndị omekome a imezu uche obi ha.

Mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Anambra Steeti nakwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile bụ ihe na-eme kwa mgbe kwamgbe n'ọdị nso a.

Ọnọdụ nchekwa akawanyela njọ dịka ndị ojiegbe a na-akpọ 'unknown gunmen' na-awakpo ndị ọrụ nchekwa n'ebe dị icheiche.

Ndị ọchịchị Naịjirịa na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob n'ịchafụ na-eme mwakpo ndị a, mana Ipob agọọla naọ bụghị ha.

Nke a bụ maka na mwakpo ndị ọrụ nchekwa kawanyere njọ kamgbe gọọmentị Naịjirịa nwụchiri onyeisi ndị Ipob bụ Mazi Nnamdi Kanu na mba Kenya n'ọnwa June 2021.

A kpọlatara Kanu na Naịjirịa ma debe ya n'ụlọ mkpọrọ dị n'isi ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa nzuzo a na-akpọ 'Department of State Services', ebe ọ nọ ruo ugbua.

Gọọmentị etiti kpọpụrụ Kanụ ụlọikpe ebe a na-ebo ya ebubo ịbụ onyeisi otu na-eyi ndụ egwu, nakwa ịchọ ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.