New Naira crisis: "Ndị uweojii gbagburu nwanne m nwoke ebe ọ gara ịgbanwe ego ochie na POS"

Ebe foto si, Anabike family
Ndị uweojii Anambara steeti ekweghị atụpụ ọnụ n'ebubo na ndị otu ha gbagburu otu nwoke na Nnewi, Anambra steeti n'ebe nkwụsị na nnyocha ndị uweojii dị n’ihu ogige ndị uweojii 'Area Command' Umudim ,Nnewi na enweghị ihe ọbụla o mere.
A gbagburu Christopher Obidi Anabike, gbara afọ 38, onye Okpuneze, Nnewi n'ihu ogige ndị uweojii 'Area Command' dịka o bu ọgbatumtum ya aga ịgbanwe ego naịra ochie n'aka otu nwoke nwere ọdọ iwere ego n’igwe 'POS' na mgbede ụbọchị Tuzde, abalị 14 nke ọnwa Febụwarị, afọ 2023.
Akụkọ na-ekwu na ọ bụ ka Anabike, onye gụrụ ‘Agricultural Engineering’ na mahadum Michael Okpara University of Agriculture Umudike rutere nkwụsị ihu ogige ndị uweojii ‘Area Command’ gbochiri ndị mmadụ ịgafee ka ndị uweojii nọ n’ebe ahụ gbara ya egbe,
O ji ọgbatumtum ya gbara gawa ụlọọgwụ a na-akpọghị aha ya bụ ebe ndị dokinta nwara ịzọta ndụ ya tupu ọ laa mụọ.
Anabike alụọla nwaanyị, mụta ụmụaka abụọ bụ ndị ọ hapụrụ nwunye ya na ụmụaka abụọ wee laa mmụọ.

Ebe foto si, Anabike Family
Nwanne Christopher bụ Okwuchukwu Anabike gwara BBC Igbo, na nwanne ya nwoke bu ọgbatumtum ya gaa ịgbanwe ego naira ochie fọrọ ya n'aka tupu mmachi naịra ochie amalite oge ndị uweojii gbagburu ya na-enweghị ihe ọbụla o mere.
"N'ụbọchị Valentine, ebe elekere 7.36 nke mgbede ka otu nwanne m nwoke kpọrọ m n'ekwentị sị m na Obidi kpọrọ ya n'ekwentị ugbua sị na ndị uweojii gbara ya egbe, na ya na-anwụzị anwụ."

Ebe foto si, Anabike family
" N'ihi oge ikpeazụ e nyere maka iweghachi ego naira ochie, o nwere nwa obere ego fọrọ nwanne m nwoke n'aka, ihe dịka N70,000."
" Ọ kpọrọ onye POS, ya agwa ya weta ya bụ ego ."
"Ọ gawara ebe ahụ ebe n'elekere 7.30 nke mgbede."
"Ka o rutere ebe ndị uweojii 'Area Command' tinyere mgbochi okporoụzọ."
"Ndị mmadụ nọ ebe ahụ na-ekwu na-oge e ji egbochi ihu ebe ahụ erubeghi."
"Ọ kwụsịrị ọgbatumtum ya n'akụkụ, kpọzie onye POS n'ekwentị ka ọ bịa were ego ahụ."
" Ọzọzị bụ ọ kpọọ nwanne m nwoke nke obere n'ekwentị sị ya na ndị uweojii gbara ya egbe."
"Okwudili Anabike kwuru na ihe gbagwojuru ya anya bụ na ndị uweojii mere ihe ahụ "Ọ ma ha, ha makwa ya ọfụma"

Ebe foto si, Anabike Family
O gara n'ihu kwuo na ha enyela mkpesa n'ogige ndị uweojii nke 'Area Command', e bugala okwu ahụ na ngalaba nnyocha mpụ 'state CID' dị n'Ọka, isiobodo Anambara steeti.
Mbọ BBC igbo gbara ịnụta olu ndị uweojii Anambra steeti amịtaghị mkpụrụ,
Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga, ọ zaghị ekwentị ya, ọ sabeghi ozi e zigaara ya n'ekwentị maka ọnwụ nwamadi a rue oge e wepụtara akụkọ a.

Ebe foto si, Christopher Anabike/Facebook
Ndị ha na Anabike gụkọrọ akwụkwọ na mahadum nakwa ndị ogbe ya n'Okpuneze Nnewi kọwara ya dịka onye anaghị achọ nsogbu.
Anabike tupu ọ nwụọ bụ odeakwụkwọ otu ndị ntoroọbia Okpuneze, Nnewi.
Onye otu ha bụ Obinna Nkeanyimuo tụrụ arịrị maka ọnwụ Anabike sịrị, "Ọ bụ nnukwu kpakpando ka a lara n'iyi."
Nkeanyimuo, onye kwuru na Anabike bụ ezigbo enyi ya sịrị, "Ọ naghị achọ nsogbu. "
"Ọ bụ otu na ndị ndu ntoroọbia n'Ọkpuneze. Ọ kpọrọ mmegbu asị.
"O kwesịghị ịnwụ."














