Pastọ anwụọla dịka ọ na-ebu ọnụ abalị 40 ka Jisọs

Ebe foto si, Barajah family
Pastọ anwụọla dịka ọ na-ebu ọnụ abalị 40 ka Jisọs
Ụkọchukwu anwụọla dịka ọ na-agbalị ibu ọnụ abalị 40 dịka Jisọs Kraịstị. ka e siri dee n’Akwụkwọ Nsọ.
Pastọ Francisco Barajah, ụkọchukwụ nwe ụlọụka “Santa Trindade Evangelical Church’ dị na mba Mozambique nwụrụ n’ụlọọgwụ dị n’obodo Beira bụ ebe e bugara ya ka ọnọdụ ya kara njọ.
Barajah gbara afọ 39 buru ọnụ rue abalị 25 na-erịghị maọbụ ṅụọ ihe ọbụla nke na o nwezighị ike ịkwụli ọtọ.
Ndị ezinaụlọ ya na ndị na-eso siri ọnwụ buga ya ụlọọgwụ bụ ebe a chọpụtara na o nwere oke ụkọ ọbara nakwa ndakpọ akụkụ ahụ ya na-ahụ maka nri
Mmiri adịghịkwa ya na-ahụ. Agbara mbọ inye ya nrị dị mmirimmiri mana ọ ge agala dịka ọ nwụrụ ụbọchị Wenezde.
Ndị ụka ya kwuru na ha na-ebubu ọnụ mana ọ bụghịogologo oge etua.
Nwanne ya bụ Marques Baraja kwuru na “nke bụ eziokwu bụ na nwanne m nwoke nwere ọrịa ọbara mgbadaala(low blood pressure) nke a chọpụtara ka ọ nwụchara.
Nke a abụghị mbụ mmadụ na-anwụ dịka ọ chọ®ọ iṅomie Kraist n’ibu ọnụ abalị 40.
N’afọ 2015, out nwoke onye Zimbabwe nwụrụ ka o buru ọnụ abalị 30. N’afọ 2006, ndị nnyocha ihe gburu onye na Briten chọpụtara n’out nwaanyị nwụrụ ka o ruru abalị 20 na London.











