A nwụchiela ụkọchukwu'House on the Rock' maka ji egbe AK-47 mee nkuzi ụka

Pastor Uche Aigbe na Ụlọụka House on the Rock

Ebe foto si, House on the Rock

Ndị uweojii Abuja ekwuola na ha anwụchiela ụkọchukwu ụka ‘House on the Rock ngalaba Abuja na mmadụ abụọ ndị ọzọ maka ebubo ibu egbe na anataghị ikike.

A nwuchiri Pastọ Uche Aigbe, na onyeisi nchekwa Ụka ahụ nakwa otu inpector ndị uweojii a kpọrọ Musa Audu n' Abuja ụbọchị Monde, abalị 13 nke ọnwa Febụwarị, afọ 2023.

Nke a na abịa dịka Aigbe ji egbe kuzie nkuzi n’ụlọụka ụbọchịụka ebe ọ kpọrọ ndị nke Kraistị oku ka ha "chee okwukwe ha nche’".

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abuja bụ Josephine Adeh kwuru n’ozi o wepụtara ụbọchị Monde na ha "nwuchiri pastọ ndị soshal midia kwuru na ozi ya na ngosi ya ga-akpalite ọgbaghara n’ụzọ ụtụtụ Monde, abalị 13 nke ọnwa Febrụwarị ya na onyeisi nche ụlọụka ha nakwa otu Inpectkọ Musa Audu nọ ọrụ ụbọchị ahụ nke hapụrụ ụkọchukwu ahụ egbeb na anataghị ikike ndị uweojii.”

Adeh gara n’ihu gbaa ama na ndị uweojii na-eme nnyocha maka ya bụ okwu ma dọọ ọha mmadụ aka na ntị ka ha gbaara agwa maọbụ okwu nwere ike imegide iwu Naijiria ọsọ.

Ihe mere ụkọchukwu ji buru AK47 bata n'ụlọụka n'Abuja
Ụkọchukwu Uche Aigbe

Ebe foto si, House on the rock

Otu ụkọchukwu ụlọụka House on The Rock n'Abuja, aha ya bụ Uche Aigbe, mere ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya n'ụbọchị Sọnde, dịka o bu egbe AK47 bata ikwu okwuchukwu.

Nke a gbara ọtụtụ ndị ụka gharịị n'ihi na egbe esoghi na ngwaọrụ e ji mara ndị ụkọchukwu maọbụ ndị na-ekwusa oziọma.

Dịka ọ malitere ikwu okwu, ụkọchukwu Aigbe gwara ndị ụka na isiokwu okwuchukwu ya bụ "Chee okwukwe gị nche".

"Anyị na-ebi n'oge anyị niile kwesịrị iche okwukwa anyị nche n'aka ndị omekome, ndị 'bandits' ndị obi ọjọọ ndị na-achọ ime ka okwukwe anyị pụọ n'ebe Chukwu nọ iji kwụsị ihe Chineke chọrọ ime na ndụ anyị," Ụkọchukwu Uche Aigbe kwuru.

BBC Igbo enweghị ike ikwu ma egbe ahụ ụkọchukwu Aigbe bu, ọ bụ AK47 nke ezigbo ka ọ bụ nke adigboroja.

Onye ọrụ ụka House on the Rock Abuja zara oku ekwentị BBC Igbo kpọrọ kwuru na ya enweghị ikike ịsa ya bụ ajụjụ, mana ya ga-ezitere anyị akara onye ga-enweike ịkọwa ya nke ọma.

O zibeghị akara ahụ ruo mgbe anyị wepụrụ akụkọ a.

Mana dịka foto ebe ụkọchukwu a bu egbe na-ezi oziọma pụtara na soshal midia, ọtụtụ katọrọ ya, ebe ụfọdụ ndị ọzọ kwuru na ọ bụ nkuzi ka ọ na-akụzi.

Ebee ka ụkọchukwu si weta egbe AK47?

Twitter

Ebe foto si, Screengrab

Ọtụtụ jụrụ ajụjụ ebe ụkọchukwu ahụ si bute egbe AK47, nke bụ egbe naanị ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa nwere ikike ibu.

Otu onye aha ya bụ Bright Nnadozie na Twitter jụrụ sị: "Gịnị kpatara ụkọchukwu ji buru egbe AK47 bịa ikwu okwuchukwu? Kedụ ka anyị si rute ebe a n'obodo anyị nke a?"

Mana otu onye ọzọ aha ya bụ Uzoma Ehiemere kwuru na ọ bụ iji mee ka nkuzi ya doo anya ka ụkọchukwu ahụ ji buru egbe.

"Ihe a bụ iji kọwaa nkuzi ya nke ọma, ọ gbasaghị okpukperechi maọbụ ọnọdụ nchekwa Naịjirịa n'ụzọ ọbụla. Pastor Uche bụ ụkọchukwu nwere obi ọma ma bụrụkwa otu n'ime ndị ezigbo ụkọchụkwu ị ga-ahụ," ka nwa amadị ahụ dere na Twitter.

Ihe ụlọụka 'House on the Rock' kwuru

Ụlọụka House on the Rock wepụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Mọnde iji rịọ mgbaghara, ma kwuo na ha na-erubere ndị ọrụ nchekwa isi na nnyocha ha na-eme.

"Pastor Uche bụ onye ndu na 'House on the Rock' Abuja kamgbe afọ 1999, o gosikwala na ọ bụ onye ndu kwesịrị nṅomi, mana ugbua ọ chọpụtala na ibu egbe iji kọwaa ozi ọ chọrọ izi abụghị ihe kwesịrị ekwesị," akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

"Na-egbughị oge o kwetala na ihe o mere adịchaghị mma, ọ rịọkwala mgbaghara maka ya.

"Dịka ụlọụka, House on the Rock anaghị akwado ọgbaaghara n'ụdị ọbụla, anyị kwụsiri ike n'ozioma nke Jesus Christ nke na-anabata udo na ọdịmma maka mmadụ niile."

Ihe ndị uweojii kwuru

Olumuyiwa Adejobi

Ebe foto si, Screengrabs

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjirịa bụ Olumuyiwa Adejobi kwuru na ndị uweojii ngalaba Abuja ga-amalite nnyocha maka ya bụ ihe n'ihi na ọ tụrụ ha n'anya.

"Mana ọ bụrụ na ya bụ ihe bụ eziokwu, ụkọchukwuahụ ga-aza ajụjụ. AK47 so na ngwaọgụ a machiri amachi na Naịjirịa, onweghị onye nwere ikike ibu ya ma ọ bụghị onye ọrụ nchekwa.

"Ọ bụghịkwanụ ndị ọrụ nchekwa niile nwere ikike ibu ya, naanị ụfọdụ n'ime ha nwere ọzụzụ maka ya. Mana onweghị onye nkịtị ọbụla nwere ikike ibu egbe ahụ."

Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka mmadụ inwe egbe

Onye bu egbe

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Iwu na-achịkọta inwe egbe na Naịjirịa bụ iwu a na-akpọ 'Firearm Act' nke e hibere n'afọ 1990.

Iwu a kwuru na onweghị onye ọbụla nwere ikike inwe egbe na Naịjirịa ma ọ bụrụ na ọ nataghị ikike ahụ site n'aka onyeisi ndị uweojii.

"Onyeisi ndị uweojii bụ 'Inspector General' ka ọ dị n'aka inye maọbụ ịnapụ onye nkịtị ọbụla ikike ibu egbe..." iwu ahụ kwuru.

Mana iwu a kwukwara ihe a ga-elekwasa anya tupu a mara ma a ga-enye mmadụ ikike ibu egbe gụnyere:

  • Onye gaferela afọ 17
  • Onye uche zuru oke
  • Onye na-enweghị nsogbu anya ọbụla
  • Onye nwere ike ijide onwe ya aka
  • Onye a na-amaghị ikpe maka ibute ọgbaaghara n'ime afọ ise gara aga

N'afọ 2018, ndị uweojii kwupụtara na ha akagbuola ikike niile ha nyere ndị nkịtị inwe egbe nke aka ha.

Ha kpọrọ oku ka onye ọbụla nwere egbe n'ụlọ ya bughachiri ya ndị uweojii maka na a ga-anwụchi onye ọbụla a hụrụ egbe n'aka ya, ma o nwere ikike ma o nweghị.

Mana n'afọ 2021, ndị omeiwu kpọrọ Onyeisiala Muhammadu Buhari oku ka ọ kagbuo iwu ahụ ka ndị mmadụ nkịtị nwee ohere inwe egbe iji chekwaa onwe ha.

N'ọnwa Septemba afọ 2021, otu onye ọkaiwu aha ya bụ Malcolm Omirhobo gbara akwụkwọ n'ụlọikpe na-arịọ ka ụlọikpe kụchapụ iwu ahụ ndị uweojii nyere nke gbochiri ndị mmadụ inwe egbe nke aka ha.