'Ihe anyị gabigara afọ asatọ tupu anyị mụta ejima anọ'

Aha onyonyo, Quadruplets: 'Anyị kwadoro maka ejima atọ mana ọ bụrụ anọ'
'Ihe anyị gabigara afọ asatọ tupu anyị mụta ejima anọ'
Ndị mụrụ ejima anọ

Maazị Ephraim Anam na nwunye ya bụ Vivian Anam chọrọ nwa afọ asatọ tupu ha mụọ ụmụ Ejima anọ.

Di na nwunye gwara BBC Igbo na ha chere na ọ bụ ụmụ ejima ajọ dịka nnyocha e mere n'ụlọgwụ gwara ha, mana oge o ruru ịmụ nwaa, ya abụrụ ụmụ anọ.

Vivian kwuru na ọ gabigara ọtụtụ akọmọnụ mgbe ha nọrọ afọ ole na ole na-amụbeghi nwa. Ọ gara n'ihu kwuo na ihe ịrịbama a meere ha bụ site n'usoro ọgwụgwọ ahụike a kpọrọ, 'ferility treatment' nke ha mere n'ụlọọgwụ nakwa amara Chineke.

Ọ gwara ụmụnwaanyị na-amụbeghi nwa ka ha nwee ndidi ma gaa n'ụlọọgwụ dị mma ka e nyochaa ya ahụ ma chọpụtara ụdịrị ọgwụgwọ 'fertility treatment' gaa akara ha mma one.

N’otu aka ahụ di ya bụ Ephraim sị na ha mefuru nnukwu ego mgbe ha na-achọ nwa kama na obi dị ya ụtọ na ego ndị ahụ abụghị n'efu. O nyekwara ụmụnwoke ndụmọdụ ka ha kwadoo nwunye ha n'oge ọbụla ọ kachasị n'ọnọdụ amụbeghi nwa.

Gee ihe ndị ha kọwara n'uju n'ihe onyonyo a nke Ikechukwu Kalu mere ma Vining Ogu haziri ya: