Kwankwaso Chatham House: 'Andrew Liver salt' na ihe ndị ọzọ Kwankwaso kwuru n'ọgbako na Briten

Ebe foto si, Chatham House
Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala na 2023 n'aha otu 'New Nigerian People's Party(NNPP) bụ Rabiu Kwankwaso ekwuola na ihe dị iche na pati ya na 'Labour Party' (LP) bụ na pati ya bụ nke Naijiria ebe nke labour bụ maka otu agbụrụ.
Kwankwaso kwuru nke a n'ọgbakọ ya na ndị gụwaraisi nwere na Chatham House dị na mba Briten n'ụbọchị Wenezde.
N'ọsịsa nke otu onye so na ndị bịara gwara ya ka ọ rituoro onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha Labour Party, Kwannkwaso kwuru sị, " E nwee pati nke kwudoro n'agbụrụ nakwa ụka onye na-ekpe ya bụ ihe dị iche n'etiti Labour Party na pati anyị nke bụ o-zuru-Naijiria-ọnụ."
“Dịka anyị na-ebo ndị ndu ebubo ime otu ihe maọbụ nke ọzọ na adịghị mma, e chere m na ndị na-eso ha kwesịrị ịmụta etu e si abụ ndị Naijiria ,karịa ịbụ ndị si n'otu mpaghara."
O kwuru na onye jụrụ ya ajụjụ kaara ịjụ ya ihe mere na o ritughị ka ya na APC maọbụ PDP rụkọọ ọrụ kama ịjụ ya naanị maka Labour Party
“A chọrọ m ị gwa gị na pati anyị , NNPP, bụ naanị pati toorola na Naijiria taa. Anyị ahụla ebe pati ọbụla ọkachasị nke ị kpọrọ aha ya nwere ike itoru."
“N'ebe anyị nọ, ọ dịka Andrews Liver Salt. Ọ nọkatara tipụta, ugbua , ọ na-agbada. Nke a bụ nke bụ eziokwu i kwesịrị ịmata.
"N'aka nke ọzọ, NNPP, bụ pati anyị bụ naanị pati na-enweta nkwado."
Ihe ndị ọzọ Kwankwaso kwuru
Lee ihe ndị ọzọ Kwankwaso kwuru nke ụfọdụ n'ime ha na-akpọtụ na soshal midia:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
- “Eso m na otu ndị chọburu ka mụ na Labour Pati rụọ mana oge ahụ, Labour Party nọ na iti mkpu na sohsal midia, nke mere na ha aghọtaghị ihe m na-arụtụ aka."
- "Anyị ejichiela vootu ndị Ugwu Naijiria taa. Ugbua, ihe anyị na-arụzi bụ iweta nkwado ndị Ndịda Naijria."
- “N'ebe anyị nọ, ndịiche dị n'Ugwu na Ndịda bụ na Ugwu ma anyị karịa ndị Ndịda Naijiria. "
- "I tulee ihe m bụ, nwanne m nwoke, e nwere m 'PhD' na Civi Engineering. I tulee onye nke ị na-akwado,Arụọla m ọrụ oyibo afọ 17, abụghị onye mgbere ahịa."
- Anyị nwere ike ị na-atụ aka n'ihe ndị kpatara ọnọdụ anyị nọ na ya, coronavirus, ọtanisi mbaụwa na ihe ndị ọzọ. Mana n'uche nke m, ebe anyị nọ ugbua bụ ndahịe nakwa ụkwụ nke ndị anyị tinyere ọchịchị n'aka kemgbe afọ 24 dajọrọ."
- "Aghọtara m ihe ndị bu nsogbu, ebe anyị si dahie, mụ na ndị otu ghọtara ọfụma ihe ụmụ Naijiria na-atụ anya marakwa etu anyị ga-esi egbo nsogbu ndị chere ala anyị aka mgba."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2















