Chatham House: Ụmụ Naijiria ga-eji 'Green Passport' eko ma m bụrụ onyeisiala -Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi/Facebook
Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naijiria n'aha Labour Party bụ Peter Obi ekwuola na ya agaghị agharịpụ ndị ntorobia dịka o kwere nkwa na Naijiria ga--adịkwa mma ọzọ nke na ụmụamala ga-eji akwụkwọ njirimara Naijria eko na mba ụwa.
Peter Obi kwuru nke a n'ụlọ mmụta okaibe n'ihe gbasara ihe na-eme na mba ụwa a kpọrọ 'Chatam House' dị na mba Briten ụbọchị Monde dịka ọ na-akọwa ebumnobi ya ịzọ ọkwa onyeisiala Naijiria na ntuliaka 2023.
" Anyị agaghị agharịpụ ndị ntọrọbịa , ndị na-eto eto na-agbapụ ga-alaghachi."
" Akwụkwọ njirimara ụmụamala Naijitria ga-abụ ihe ndị mmadụ ji eko."

Ebe foto si, Peter Obi/Facebook
"Anyị ga-esi ebere. A nyị ga-egosi ịhụnanya."
"Apụla maka na Bayelsa bụ.."
"E kwula na ị gaghị aga Borno n'ihi na e nwere tigbuo-zogbuo."
"Enwe nsogbu ndị gbara ọsọ ndụ, mata na anyị nile bụ ndị gbara ọsọ ndụ."
N'okwu nsogbu ndakpọ akụnaụba, nsogbu nchekwa, Obi rụtụrụ aka na ndị ji okwu okpukperechi nakwa agbụrụ were chụọ vootu, gbahapụziri ndị a nyere ha mmeri dịka ha banyere n'ọkwa.
Ihe ndị ọzọ Obi kwuru:
"Ọ bụ nkuzi nne m nyere m ka m kpachapụ anya etu si emefu ego m maọbụ ego nke ndị mmadụ e nyere m n'aka.
"Ọ bụ nkwenye a ka m tinyere n'ọrụ oge bụ gọvanọ Anambra steeti."
- "Ntuliaka bụ usoro e ji ewepụ ajọ ndị ọchịchị."
- "Anyị ga-ahọpụta ụmụ Naijiria ndị tozuru si mpaghara dị iche iche hiwe ọchịchị ga-ejikọ onye ọbụla."
- “Aga m ebu nsogbu ọkụ latrik agha ma gboo ya bụ ọgụ, onye nọchie ụzọ, ya awụrụwa."
Akụkọ ka na-abịa.









