Ihe mere ntuliaka 2023 ga-eji atụ ndị mmadụ n'anya - Rabiu Kwankwaso
Na mkparịtaụka a pụrụiche nke BBC na-eweta, onye ji ọkọtọlọ pati New Nigeria People's Party (NNPP) azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023 bụ Rabiu Kwankwaso akọwaala ihe ya na pati ya jiri bụrụ ‘egwu eji’ n'ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ọ zara ajụjụ banyere ntụala ya n’ọrụ a ma kwuo etu ihe ya na pati ọ nọbụ bụ People’s Democratic Party (PDP) siri gaa.
Kwankwanso gara n'ihu kwuo na ntuliaka afọ 2023 agaghị adị ka o si adị n'oge mbụ. Ọ sị na ihe ga-eme ga-atụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya ọkachasị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chere na ha nwere agba na Naịjirịa.
O kwuru na anya ụmụ Naịjirịa emepeela na nke ikpeazụ, nke bụ na o nweghi onye ga-agwa ha ihe ha ga-eme maọbụ onye ha ga-atụnyere vootu.

Ọ kọwara na esemokwu dapụtara na pati ahụ malitere mgbe ha hụrụ na ụfọdụ ndị nọ na pati ahụ ekwesịghị isonye ha n’ihi na ha bụ ọgbatauhie dịrị atụmatụ ọma ha nwere.
O kwuru okwu banyere ndụ ya nakwa atụmatụ ndị o nwere ma o nweta ọchịchị a ọ na-azọ.
O kwupụtara echeche ndị o nwere banyere ọnọdụ nchekwa Naịjirịa, mwulite akụnụba Naịjirịa, agụmakwụkwọ, ọnọdụ enweghị ọrụ nakwa mwulite ndụ ndị mmadụ n’akụkụ Naịjirịa niile.
Ọrụ nchekwa doro m anya nke bụ na m nwete mmeri nchekwa ga-adị na Naịjirịa - Rabiu Kwankwaso
Kwankwaso kwuru na ọrụ nchekwa doro ya anya n’ihi ọ rubuola ọrụ na ngalaba ahụ.
N’okwu, ọ kọwara na otu n’ime ihe kacha akpata ndakpu nchekwa bụ ọnọdụ ndụ ndị ọrụ nchekwa dịka o kwere nkwa ịhụ na a kwalitere ọnọdụ ndụ ha n’ụzọ ọma.
Ọ sara ndị na-akwa ya emu maka atụmatụ mmeri ya ma kwuo na ha ga-eji anya ha hụ na ọ pụtaghị iti mmanwụ a na-akwa aka.
Ọ gara n’ihu kọwa na akwụkwọ depụtara nkwa ndị ha na-ekwu n’ọchịchị ha ga-apụta n’oge na-adịghị anya iji kwuo hoo haa ihe ndị mmadụ kwesịrị ịtụanya n’aka ha.
Kirie ihe onyonyo a ka ị gere ihe o kwuru n'uju.



