Ọ bụ eziokwu na dọkịta Bekee ọ kpụpụrụ mmadụ n'ihu 'arụsị? Lee ihe anyị ma

Ebe foto si, Other
Akụkọ na-ekwu na otu dọkịnta ahụike nke na-arụ ọrụ n'Anambra Steeti kpụpụrụ otu nwaanyị bụ onye nkuzi n'ihu arụsị maka akwụghị ya ụgwọ o ji ụlọọgwụ ahụ kamgbe afọ 2019.
Nwaanyị aha ya bụ Christiana Chukwuka kwuru na dọkịnta aha ya bụ Walter Igbokwe kpụpụrụ ya n'ihu arụsị maka ọ kwụghị ya ụgwọ oji ụlọọgwụ Igbokwe.
N'aka nke ọzọ ka Dọkịnta Igbokwe na-ekwu na enweghị mgbe o jiri yijaa Chukwuka maọbụ gaa kpese ya n'ụlọ arụsị.
Kedụ ka okwu si malite?

Ebe foto si, Chukwuka Christiana
Chukwuka gwara BBC Igbo "nne m nwere ọrịa mkpọnwụ ahụ nke mere ka mmadụ tuziere m ka m gaa n'ụlọọgwụ Dọkịnta Igbokwe nke bụ Fertile Health Foundation.
"Akpọrọ m dọkịnta gwa ya etu ahụ nne m sị eme ya ọ si m na-enweghị nsogbu ọbụla."
Chukwuka kwuru na ọ bu ụzọ kwụọ otu puku naịra dịka ego e ji edebanye aha n'ụlọọgwụ ahụ.
"O mechara gwa m sị na m ga-akwụnye otu puku narị naịra na puku iri ise dịka ego a ga-eji bido ọgwụgwọ nne ya.
"Ka ịzụụka ọzọ ruru ha kpọrọ m sị na ọ bụ m ga-egote ọgwụ agbanyeghị na m nyere ha N150,000. Agbagharịrị m chọta N75,000 ọzọ kwụnye ya.
"N'ime ihe niile a m mere ahụ anaghị adị nne m mma".

Ebe foto si, Chukwuka Christiana
O gara n'ihu si, " M jụrụ ya maka dọkịnta na-agba ọkpụkpụ, ọ kpọta otu onye sị m na ọ bụ N25,000 ka a ga-akwụ ya.
Dokịnta ahụ mechara bịa otu ụbọchị sị na dọkịnta akwụbeghị ya ụgwọ. Akpọrọ m dọkịnta Igbokwe jụọ ya maka ihe dọkịnta na-agba ọkpụkpụ kwuru maka ụgwọ eji ya kama dọkịnta Igbokwe sị m emela ka dọkịnta ahụ mara na ọ nọ nso".
Chukwu sị na ọ bụ otu nọọsụ na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ ahụ gwara ya ka ọ kpọọla nne ya n'ihi na ọ bụ naanị ọgwụ 'Paracetamol' ka a na-agba nne m.
"Ọ bụ mgbe ahụ ka m jiri kpebie ịkpọla nne m.
"Mgbe m gwara dokịnta na m chọrọ ịkpọrọ nne m, ọ sị m kwụọ ya ihe ruru puku narị naịra isii tupu m nwee ike kpọrọ nne."

Ebe foto si, Chukwuka Christiana
O kwuru na o bidoro bewe akwa ma jụọ dokịnta na ọ bụ n'ọnọdụ dị etu a nne ya dị ka ọ ga-akwụ ya bụ ego.
O kwuru sị ,"agbagharịrị m were N150,00 nye ya mana o kweghi.
"Arịọgidere m ya ruo otu izuụka tupu o kwere hapụ anyị.
"Mana dịka izuụka ole na ole gachara anyị si ụlọọgwụ ahụ lọta, nne m anwụọ.
Chukwu kwuru na kamgbe ahụ ka nwoke a bidoro na-eyi ndụ ya egwu.
O kwuru sị , "ọ na-akpọ m iyi na-eyija m. Kamgbe ahụ, enwetebeghi m onwe m, etu a ka m na-esi n'otu ụlọọgwụ aga n'ụlọọgwụ ọzọ".
Chukwu kwuru na ọ bụghị eziokwu na ọ zaghị Igbokwe mgbe ọ kpọrọ ya n'ekwentị.

Ebe foto si, Christiana Chukwuka
Ihe Dọkịta Igbokwe sara n'ebubo na ọ kpụpụrụ Christiana n'ihu arụsị.
Dọkịta Igbokwe gara BBC Igbo na o nweghi mgbe o jiri kpụpụ Chukwu n’ihu arụsị ọbụla.
Ọ sị na ihe a mere n’ihe dịka afọ ise gara aga na kamgbe ahụ na ha ahụbeghi Chukwuka anya.
“Tupu ọ kpọrọ nne ya lawa mụ na ya tinyere akwụkwọ n’aka maka mgbe ọ ga-akwụcha ụgwọ o ji anyị”
“kamgbe ahụ anyị kpọọ ya n’ekwentị ọ na-aghị azazi ekwentị ya.”
Igbokwe gara n’ihu sị na ọkaiwu ya kpọrọ Chukwuka kama na ha ahụbeghi anya kamgbe ahụ.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na o nweghi mgbe onye ọbụla yiri ya egwu igbu ya maọbụ ịkpọ ya aga n’ihu arụsị.
Igbokwe sị na o nweghi ihe na-esere ya na Chukwuka, na ọ bụrụ na o jighi ego ka o kwuo ka ha hapụrụ ya ego ahụ.









