Ọ bụ eziokwu na dọkịta Bekee ọ kpụpụrụ mmadụ n'ihu 'arụsị? Lee ihe anyị ma

Ihu arụsị

Ebe foto si, Other

Akụkọ na-ekwu na otu dọkịnta ahụike nke na-arụ ọrụ n'Anambra Steeti kpụpụrụ otu nwaanyị bụ onye nkuzi n'ihu arụsị maka akwụghị ya ụgwọ o ji ụlọọgwụ ahụ kamgbe afọ 2019.

Nwaanyị aha ya bụ Christiana Chukwuka kwuru na dọkịnta aha ya bụ Walter Igbokwe kpụpụrụ ya n'ihu arụsị maka ọ kwụghị ya ụgwọ oji ụlọọgwụ Igbokwe.

N'aka nke ọzọ ka Dọkịnta Igbokwe na-ekwu na enweghị mgbe o jiri yijaa Chukwuka maọbụ gaa kpese ya n'ụlọ arụsị.

Kedụ ka okwu si malite?

Foto Chukwuka sị na-egosi ozi iyi egwu Igbokwe zigara ya

Ebe foto si, Chukwuka Christiana

Nkọwa foto, Foto Chukwuka sị na-egosi mgbe dọkịta Igbokwe sị na ọ ga-akpọpụ ya n'ihu arụsị.

Chukwuka gwara BBC Igbo "nne m nwere ọrịa mkpọnwụ ahụ nke mere ka mmadụ tuziere m ka m gaa n'ụlọọgwụ Dọkịnta Igbokwe nke bụ Fertile Health Foundation.

"Akpọrọ m dọkịnta gwa ya etu ahụ nne m sị eme ya ọ si m na-enweghị nsogbu ọbụla."

Chukwuka kwuru na ọ bu ụzọ kwụọ otu puku naịra dịka ego e ji edebanye aha n'ụlọọgwụ ahụ.

"O mechara gwa m sị na m ga-akwụnye otu puku narị naịra na puku iri ise dịka ego a ga-eji bido ọgwụgwọ nne ya.

"Ka ịzụụka ọzọ ruru ha kpọrọ m sị na ọ bụ m ga-egote ọgwụ agbanyeghị na m nyere ha N150,000. Agbagharịrị m chọta N75,000 ọzọ kwụnye ya.

"N'ime ihe niile a m mere ahụ anaghị adị nne m mma".

Foto Chukwuka sị na-egosi ozi iyi egwu Igbokwe zigara ya (2)

Ebe foto si, Chukwuka Christiana

Nkọwa foto, Foto Chukwuka sị na-egosi ozi iyi egwu Igbokwe zigara ya

O gara n'ihu si, " M jụrụ ya maka dọkịnta na-agba ọkpụkpụ, ọ kpọta otu onye sị m na ọ bụ N25,000 ka a ga-akwụ ya.

Dokịnta ahụ mechara bịa otu ụbọchị sị na dọkịnta akwụbeghị ya ụgwọ. Akpọrọ m dọkịnta Igbokwe jụọ ya maka ihe dọkịnta na-agba ọkpụkpụ kwuru maka ụgwọ eji ya kama dọkịnta Igbokwe sị m emela ka dọkịnta ahụ mara na ọ nọ nso".

Chukwu sị na ọ bụ otu nọọsụ na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ ahụ gwara ya ka ọ kpọọla nne ya n'ihi na ọ bụ naanị ọgwụ 'Paracetamol' ka a na-agba nne m.

"Ọ bụ mgbe ahụ ka m jiri kpebie ịkpọla nne m.

"Mgbe m gwara dokịnta na m chọrọ ịkpọrọ nne m, ọ sị m kwụọ ya ihe ruru puku narị naịra isii tupu m nwee ike kpọrọ nne."

Foto Chukwuka sị na-egosi ozi iyi egwu Igbokwe zigara ya (3)

Ebe foto si, Chukwuka Christiana

Nkọwa foto, Foto Chukwuka sị na-egosi ozi iyi egwu Igbokwe zigara ya (3)

O kwuru na o bidoro bewe akwa ma jụọ dokịnta na ọ bụ n'ọnọdụ dị etu a nne ya dị ka ọ ga-akwụ ya bụ ego.

O kwuru sị ,"agbagharịrị m were N150,00 nye ya mana o kweghi.

"Arịọgidere m ya ruo otu izuụka tupu o kwere hapụ anyị.

"Mana dịka izuụka ole na ole gachara anyị si ụlọọgwụ ahụ lọta, nne m anwụọ.

Chukwu kwuru na kamgbe ahụ ka nwoke a bidoro na-eyi ndụ ya egwu.

O kwuru sị , "ọ na-akpọ m iyi na-eyija m. Kamgbe ahụ, enwetebeghi m onwe m, etu a ka m na-esi n'otu ụlọọgwụ aga n'ụlọọgwụ ọzọ".

Chukwu kwuru na ọ bụghị eziokwu na ọ zaghị Igbokwe mgbe ọ kpọrọ ya n'ekwentị.

Akwụkwọ nkwekọrịta Christiana na Walter Igbokwe maka ị kwụ ụgwọ ya, dịka Chukwuka siri gwa BBC Igbo

Ebe foto si, Christiana Chukwuka

Nkọwa foto, Akwụkwọ nkwekọrịta Christiana na Walter Igbokwe maka ị kwụ ụgwọ ya, dịka Chukwuka siri gwa BBC Igbo

Ihe Dọkịta Igbokwe sara n'ebubo na ọ kpụpụrụ Christiana n'ihu arụsị.

Dọkịta Igbokwe gara BBC Igbo na o nweghi mgbe o jiri kpụpụ Chukwu n’ihu arụsị ọbụla.

Ọ sị na ihe a mere n’ihe dịka afọ ise gara aga na kamgbe ahụ na ha ahụbeghi Chukwuka anya.

“Tupu ọ kpọrọ nne ya lawa mụ na ya tinyere akwụkwọ n’aka maka mgbe ọ ga-akwụcha ụgwọ o ji anyị”

“kamgbe ahụ anyị kpọọ ya n’ekwentị ọ na-aghị azazi ekwentị ya.”

Igbokwe gara n’ihu sị na ọkaiwu ya kpọrọ Chukwuka kama na ha ahụbeghi anya kamgbe ahụ.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na o nweghi mgbe onye ọbụla yiri ya egwu igbu ya maọbụ ịkpọ ya aga n’ihu arụsị.

Igbokwe sị na o nweghi ihe na-esere ya na Chukwuka, na ọ bụrụ na o jighi ego ka o kwuo ka ha hapụrụ ya ego ahụ.