Gịnị butere ngagharịiwe maka ego Naịra ọhụrụ ebipụtara

Ndị uweojii
    • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu & Victor Ezeama
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalists

Ngagharịiwe dapụtara n'ụfọdụ obodo na Naijirịa dịka izuụka olemaole gara ndị mmadụ ji anya ha hụ ntị ha maka ụkọ akwụkw ego.

Ndị mmadụ na-akwụ ruo passenti 20% ego ha chọrọ ị were n'aka ndị ji POS agba mgbere ego. Naịjirịa bụ mba echere na akụnụba ya kacha n'Afrịka ka POS a bụ ụzọ ọzọ mmadụ nwereike isi were maọbụ zipụ ego.

Ndị Naijirịa iwe na-ewe pụtara n'okporoụzọ nke Ibadan, Bini, Warri, Portharcourt na Ilorin na-eme ngagharịiwe iji gosipụta iwe ha

Ọtụtụ ndị Naijirịa akwadoghị mbipụta ego ọhụrụ mgbe onyeisiala Muhammadu Buhari gosipụtara ya n'ọnwa Nọvemba afọ 2022 na nzụkọ Executive Council e mere n'Abuja.

Kama nke a erughị nghọtaghe dapụtara n'ụbọchị 15 nke ọnwa Nọvemba mgbe ebidoro ịkesa ya bụ egọ ọhụrụ.

Gịnị mere ego ọhụrụ a ji kọọ ụkọ?

Ego naịra ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images

Ndị mmadụ tụrụ anya na ọ bụ ha nye ego ochie ha, enye ha nke ọhụrụ, kama CBN hiwere iwu nke kwuru na ọ bụ N100,000 ka otu onye nereike ị were kwa izuụka ebe ụlọọrụ nwereike ị were N500,000 kwa izuụka.

Kama ụlọakụ na Naijirịa anaghị enye ndị mmadụ ego ọhụrụ kama ha ka na-enye ha ego ochie. Etu a ka ọ dị tupu CBN enye iwu n'ọnwa Jenụwarị ka ha kwụsị inye ndị mmadụ ego ochie.

Mana dịka o siri dị,ụlọakụ enweghị ike inye ndị mmadụ ego etu ha siri chọọ ya. Nke a mere na ụkọ ego ndị mmadụ chere ga-anọ ụbọchị olemaole, banyere izụụka olemaole.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ma ọbụladị ọkwa gọọmentị nyere ka adọọtịa inye ego ochie n'ụọchị 31 nke ọnwa Jenụwarị 2023 akwụsịghị ụkọ ego ọhụrụ a.

Mary Temitope bị n'Oshogbo nke bụ isi obodo Osun steeti gwara BBC sị, "Ahụhụ ndị mmadụ na-ata karịrị akarị n'ihi ha enweghị ike ịnweta ego ọhụrụ. A kwụrụ m n'ahịrị n'ụlọakụ dị iche iche n'ihi a chọrọ m ịdọrọ ego n'ATM ha. Ụfọdụ mgbe, a na m akwụ mmadụ ụgwọ ka ọ nnọchite anya m ma kwụrụ n'ahịrị maka na o siri ike ịkwụ n'ahịrị naanị ka ị dọrọ opekete mpe N5,000 maọbụ N10,000. Ihe nke a akarịala ".

N'aka nke ọzọ atụmatụ CBN wepụtara nke kwadoro ịbelata ego nọ n'aka ndị mmadụ nke bụ Cashless Policy bịara di ire n'oge a agbanyeghị na ndị mmadụ na-ekwu na enweghị Network ebe ụfọdụ mgbe ego ezipụrụ agaghị aga na-echere ha aka mgba ụfọdụ mgbe.

Steve Odumukwu, onye bị n'obodo Ọka nke dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa kwuru ihe ọ gabigara iji ekwentị ya kwụọ ụgwọ. Odumukwu kwuru sị, " E ji m app nọ n'ekwe ntị m kwụọ ụgwọ njem Keke nke pụtara naanị N100. Emetubeghị m nke a na ndụ m mbụ. Ihe ọ pụtara bụ na ego adịghịzị ebe ọbụla. Nke a pụtara na ihe ọbụla ha chọrọ iji ihe a rite amitaghị mkpụrụ".

Gịnị kpaliri iwe ndị mmadụ

NDị nọ ebe a na-eme ngaghariiwe

Dịka ndị mmadụ were iwe pụọ ezi bido ngagharịiwe n'ụfọdụ mpaghara ndịda anyanwụ dịka ụbọchị 10 nke ọnwa Febụwarị nke Central Bank of Nigeria hiwere ka ndị Naijirịa nyeghachi ego ochie nke 200, 500 na 1000 naira.

N'ụbọchị 8 bụ wenesde, ụlọikpe elu na Naịjirịa kpere ikpe nke Kaduna, Kogi na Zamfara gbara n'isi gọọmentị Naijirịa nke ụlọikpe kpebiri sị ka akwụsị ịmachi ego ochie tutu ruo ụbọchị 15 nke Febuwarị, ma sị ka ụlọakụ gaa n'ihu na-enye ma na anabata ego ochie.

Ebe Godwin Emefieli onyeisi ụlọakụ kachasị bụ CBN ekwuola na ha amahachila ịtarị naịra 1.9 ego ochie.

Kama n'ụbọchị 14 nke ọnwa Febụwarị ka okwu na CBN kwuru an anaghịzị anabata ego ochie wuru na soshal midịa.

Dịka chi na-efo n'ụbọchị 15 nke ọnwa Febụwarị, ka akụkọ na a na-eme ngagharịiwe na pọtakọtụ n'ihi na ndị ọkwọọ ụgbọala kwuru na ha agaghị anara ndị njem ego ochie.

Otu onye ọrụ ntaakụkọ BBC Igbo kwuru na ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe mechiri okporoụzọ Ozuoba na nke Rumuosi dị na pọtakọtụ.

N'aka nke ọzọ ka ụmụnwaanyị na-ere ahịa mere ngaghariiwe maka ụkọ ego naịra ebe igwe mmadụ ọzọ chọrọ ịwakpo ụloakụ CBN kama ndị nchekwa ekweghị ha mee uche obi ha.

Ebe ihe onyonyo gosiri otu nwoke agbara egbe nke BBC chopụtara na ọ bụ na mpaghara ya bụ ngaghariiwe mere, ihe onyonyo a gosiri ka ebu ya agba ọsọ ịzọ ndụ ya. Ebe ihe onyonyo ọzọ gosiriotu nwoke agbara egbe n'afọ. Amaghị ma ọ nwụrụ ma ọ nwụghị.

Ngaghariiwe a rutekwara Ilorin nke bụ isi obodo Kwara Steeti nke dị na mpaghara ugwu Naịjirịa.

Kama mpagharta ugwu ndị ọzọ dere duu.

Pambari Jen onye bị na Lafia gwara BBC na-enweghị nsogbu ụkọ ego na mpaghara ugwu n'ihi na ndị ọrụ POS na-agbalị irubere ntụzịaka a isi.

Pambari kwuru sị, "Ndị ụlọakụ abụghị ndị anyị ga-atụkwasị obi. Ụbọchị Frịde gara aga ka m gara n'igwe ATM were N5000, ka ụbọchị mọnde na-eru , ha ekwuo na enweghịzị ego fọrọ na ya bụ ụlọakụ. Ihe isiike nọ n'obodo ya mere na ndị mmadụị anaghị achọ nnukwu ego. Ihe ha chọrọ bụ naanị N2000 maọbụ N5000".

Ọ gara n'ihu kwuo, "Gọọmentị Naijirịa na CBN na-arụ ndị Naijirịa aka n'anya. A ga m adụ ha ọdụ ka ha hapụ iche tupu ya bụ ihe akanwanye njọ".

Kedụ ihe gọọmentị na-eme maka ihe a niile?

Onyeisiala Naijirịa Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Muhammadu Buhari/Twitter

Dịka a na-eche na ngaghariiwe a ga akanwanye njọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari mere mgbasaozi kwuo ka ndị mmadụ dere duu ma kwee nkwa na ụkọ ego a ga-ebelata.

Buhari kwuru ka eweghachi ego ochienke N200 ma sị ka ejiri ya na nke ọhụrụ na-egbo mkpa tutu ụbọchị 10 nke ọnwa Aprel afọ 2023.

O rụtụru aka maka ikpe nke nọ na ụlọikpe elu, mana ọ kwughị okwu ọbụla maka mkpebi ụloikpe nkwkwuru ka ego ochie ka dị ire.

Ebe ụfọdụ Naijirịa na-ahụta nke a dịka inmupu isi n'iwu ụloikpe a nyere.

Steeti ndị ọzọ nke gụnyere Legọs steeti esorola n'ikpe megidere gọọmentị Naijirịa maka atụmatụ ego ọhụrụ a.

Legọs steeti esorola Kaduna na Kano ndị kwuru na ego naịra ochie ka dị ire.

Ebe e nwere ihe onyonyo nke gosiri gọvanọ Kadụna Steeti bụ Nasir El Rufai ka ọ na-agwa ndị nọ na steeti ya ka ha ka jiri ego ochie egbo mkpa ha n'ihi na mgbe Bola Ahmed Tinubu batara n'ọchịchị dịka onyeisiala na ọ ga-agbanwe ihe ndị a.

Bola Tinubu na-ekwu na ọ bụ ya ka achọrọ iji atụmatụ ego a megide ebe ndị ọnụ na-eru n'okwu n'otu pati All Progressive Congress dịka El Rufai kwadoro ihe Tinubu kwuru.

Kama otu onye ọkaiwu gwara BBC na ihe onyeisi CBN na onyeisiala kwuru na N500 na N100 ochie abụghịzị ego dị ire na Naịjirịa bụ mkparị nye ụlọikpe ukwu.

"ekwesịrị irubere mkpebi ụlọikpe ọbụla belụsọ ma ụlọikpe ka ya ekwugharịrị ihe o kwuru. Onyeisiala Naijirịa ekwesịghị ịtụhapụ ihe ụlọikpe a kwuru na mgbasa ozi ya".