Simon Ekpa: Ohaneze, Pandef, Afenifere na ndị ọzọ ewegarala Gọọmentị Finland mkpesa

Ohaneze na Simon Ekpa

Ebe foto si, BBC/Simon Ekpa

Ka ọ fọrọ abalị ole na ole ka e mee ntuliaka 2023, otu ndị jikọrọ agbụrụ dị iche iche na Naijiria gụnyere Ohaneze, Pandef, Afenifere, Northern Elders Forum, Middle Belth Forum, Middle Belt Forum,Igbo Elders Forum na NEF na ndị ọzọ ewegarala gọọmentị mba Finland mkpesa na nwafọ Naijiria bi mba ahụ bụ Simon Ekpa chọrọ ikposa ntuliaka ahụ n'Ọwụwa Anyanwụ

Ekpa, onye ndu alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha “Autopilot”, ji soshal midia agbasa ozi iji tigbo-zogbuo nweta nnwereonwe Biafra nọrọ na nsonso a kpoo oku ka ndị nọ n'Ọwụẁa Anyanwụ ghara ịpụta ama n'ụbọchị ntuliaka onyeisiala afọ 2023 e tinyere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ a.

Ndị nnọchite anya otu ndị a weghara akwụkwọ ozi mkpesa a oge ha gara hụ onye nnọchite anya mba Finland bụ Leena Pylvanainen n’Abuja na nsonso a.

Ndị gara ije ahụ nke Ichie Simon Okeke bụ onye nọchitere Odeakwụkwọ Ukwu Ohaneze bụ Okey Emuchay nọ n'isi ya, rụtụrụ aka na "o(simon Ekpa) nyere iwu ka a nọrọ n'ụlọ n'Ọwụwa Anyanwụ nile tupu , oge nakwa me emecha ntuliaka (2023)."

Ha boro ebubo na “ogologo oge ka aka ọ (Simon Ekpa) na-akwado mgbasa ozi iyi ndụ egwu megide ndị Ọwụwa Anyanwụ,”

Ha tụrụ arịrị na "e gbuola ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ n'Ọwụwa Anyanwụ, emebie ọtụtụ ihe dara nde kwuru nde naira' site na ntuziaka o nyere ma rịọ Gọọmentị mba ahụ ka ha lebanye anya na ya."

N'ọsịsa ya, Pylvanainen gosiri obi mwute ihe ndị Ọwụẁa Anyanwụ nakwa ndị Naijiria na-agabiga n'ihi nke a.

O kwuru na gọọmentị Finland nwere mmasị ịhụ na Ekpa zara ọnụ ya dịka iwu si dị ma ọ bụrụ na e nwere ihe akaebe were anya banyere ihe ndị a na-ebo ya.

Ihe Finland kwuru maka akwụkwọ ozi sị na ha sị ka a nwụchie Simon Ekpa

Akwụkwọ adigboroja na Simon Ekpa

Ebe foto si, Screengrab/Simon Ekpa

Gọọmentị mba Finland ekwuola na akwụkwọ ozi ịdọ aka na ntị na-efegharị nke a sị ha degara Simon Ekpa bụ nke adigboroja, na o sighị n'aka ha.

Otu akwụkwọ ozi nke a si Praim Minista mba Finland bụ Sanna Mirella Marin degara Simon Ekpa,na-ewu na soshal midia na Naijiria.

Mana ọnụ na-ekwuru ụlọnnọchiteanya mba ahụ n'Abuja gwara BBC Disinformation Unit na akwụkwọ ozi ahụ bụ akpụrụ akpụ, n'osighị n'aka ha pụta.

N'akwụkwọ ozi ahụ fegharịrị nke e dere n' abalị 15 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023, nke boro Ekpa ebubo "isi mba iyi ndụ egwu na mba ọzọ", ọ gwara Ekpa bụ onye na-akpo oku ka ndị bi n'Ọwụwa anyanwụ nọrọ n'ụlọ ka ọ kagbuo oku ahụ ọ kpọrọ.

Akwụkwọ ozi adigborja ahụ gara n'ihu sị, "Simone Ekpa, ọ bụrụ n'imeghị nke a awa 48 agafee, a ga-anwuchi gị, kpụbụ ụlọikpe maka isi mba na-eyi ndụ egwu na mba ọzọ."

O nweghị onye ma ebe akwụkwọ ozi adịgboroja ahụ si nke ọtụtụ ndị mmadụ kesara na ọbaozi Twitter. Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọ gọọmentị Naijiria na nke Finland ka ha kwụsị ozi akpọmasị nakwa nnubuisi nke nwa amadi ahụ na-ezi na soshal midia.

Akwụkwọ ozi adigborja a sị si n'aka Gọọmenti Finland

Ebe foto si, Unknown

Na nsonso a, Gọọmentị Naijria kpọrọ onyennochite anya mba Finland oku ebe ha kpara maka okwu Simon Ekpa, bụ onye Naijiria nwekwara ikike dịka nwaafọ Finland ji soshal midia na-eyi ndị Naijiria bi n'Ọwụwa Anyanwụ ka ha ghara ịpụta mee ntuliaka 2023.

N'ihe onyenyo YouTube ọgbasara , Ekpa kpọrọ oku nọrọ n'ụlọ abalị abụọ tupu ụbọchị ntuliaka, ụbọchị ntuliaka nakwa abalị atọ so ntuliaka onyeisiala nke ga-eme n'abalị 25 nke ọnwa Febrụwarị.

O kwuru na nani ma a tọhapụrụ Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Ipob e ji na mkpọrọ bụ na emee ntuliaka na mpaghara ahụ.

Ihe Gọọmentị Naijiria na onye nnochiteanya Finland kpara maka Simon Ekpa

Zubairu Dada gwara Leena Pylvanainen

Ebe foto si, Ministry of Foreign Affairs

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dịka ntuliaka 2023 na-atụnye n'ụkwụ, Gọọmentị Naijiria agwala ogbo ha nke mba Finland ka ha mara ihe ha mere maka iyi egwu nke Simon Ekpa, nwa afọ Naijiria bi na mba ahụ na-eyi ụmụ Naijiria bi n'Ọwụwa Anyanwụ Naijria.

Nke a pụtara ihe oge onye nnochiteanya mba Finland na Naijiria bụ Leena Pylvanainen zara oku Gọọmentị Etiti kpọrọ ya n'Abuja na nsonso a banyere Simone Ekpa.

Simon Ekpa, onye ndu alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha "Autopilot" ji akara ya na sochal midia nakwa intanetị na-akpo oku iji tigbuo-zogbuo nweta nnwereonwe Biafra nke ụfọdụ na-ebo ebubo na o butela ọnwụ ụfọdụ ndị mmadụ nakwa mmebi ihe ndị ọzọ.

Mịnịsta Nta na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ bụ Zubairu Dada gwara Pylvanainen n'Abuja ụbọchị Tuzde na Ekpa nọpịara onwe ya n'ụlọ ya na Finland, si ebe ahụ anyụ ihe na-esi na Naijiria.

O kwuru na "o kwesịrị na Gọọmentị Finland ga-arụ ọrụ dịịrị ha" n'isi nwa amadi ahụ.

Ekpa, onye kpọrọ onwe ya ọkaiwu na onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị onwe nọrọ na nsonso a kpọ oku a ka ndị Ọwụwa Anyanwụ nọrọ n'ụlọ ghara ịpụta ama n'ụbọchị Ntuliaka 2023 ma yie egwu na ihe ga-eso ndị emeghị nke a.

Naijiria ga-eme ntuliaka onyeisiala n' abalị 25 ọnwa Febụwarị ,afọ 2023 maka ọkwa onyeisiala nakwa Ụlọomeiwu nke Etiti, ebe a ga-enwe ntuliakagmaka ọkwa Gọvanọ nakwa ụlọomeiwu steeti n'abalị 11 nke ọnwa Maach, afọ 2023.

Pylvanainen, onye rụtụrụ aka mkpa ọ dị ka e mee ntuliaka n'udo kwuru na " ngalaba na-ahụ maka nnyocha nke mba Finland nakwa ndị ọrụ nchekwa Naijiria na-ejikọ aka ime nnyocha' banyere Simone Ekpa.

Leena Pylvanainen na Geofrey Onyema

Ebe foto si, Ministry of Foreign Affairs

Nkọwa foto, Onye nnochiteanya mba Finland bụ Leena Pylvanainen na Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ bụ Geofrey Onyema nweburu ọgbakọ na Jenụwarị afọ 2023 tupu ọgbakọ ọzọ nke Minista Nta nke ministri ahụ bụ Zubairu Dada na Pylvanainen nwere ụbọchị Tuzde

Cheta na ọtutụ otu gụnyere otu Ohaneze Ndigbo nakwa ụfọdụ ndị Igbo nwere agba akatọọla oku ahụ Ekpa na ndị otu ya kpọrọ ka a nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị ntuliaka.

Ha kporo Gọọmentị Naijiria na ndị ọrụ nchekwa oku ka a nwuchie nwa amadi ahụ ma lebanye ya anya n'ebubo mkpamkpa ndị ọ na-akpalite n'Ọwụwa anyanwụ dịka ha boro ebubo na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị achọghị ka Peter Obi nke Labour Party' nweta mmeri ji ya bụ Ekpa kwara ngwaọrụ iji hụ na o jiri iyi egwu welata ọnụọgụgụ ndị ga-apụta maka ntuliaka ahụ n'Owụwa Anyanwụ.

N'ọnwa Disemba afọ 2022, Simon Ekpa na ndị otu ya kpọrọ oku nọrọụlọ abalị 14.

Ọtụtụ ndị mmadụ egeghị ntị n'oku. Mana ụfọdụ ndị egeghị oku ahụ ntị tụnyere ndụ ha dịka ndị ojiegbe wakporo ha na steeti dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ.