Ihe Finland kwuru maka ebubo na Simon Ekpa na-akpalite tigbuo-zogbuo n'Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Simon Ekpa/Facebook
Gọọmentị mba Finland akatọọla oku tigbuo-zogbuo nke onye ndu alaka otu Indigenous People of Biafra (Ipob) kpọrọ onwe ha 'auto-pilot' bụ Simon Ekpa na-akpọ n'Ọwụwa Anyanwu Naịjirịa.
Mba Finland kwuru nke a n'akwụkwo ozi ha ziteere BBC n'ọsịsa ajụjụ banyere ebe ha kwụ n'okwu oku 'iyi ndị mmadụ egwu' nke Ekpa na-akpọ na mpaghara ahụ.
Ozi a nke Hanna Nykanen nke Mịnịstrị mba ahụ na-ahụ maka ihe na-eme n'ụlọ binyere aka, o kwuru sị, "Finland na-akatọ tigbuo-zogbuo n'ụzọ ọbụla; iji ya maja mmadụ, ịkwado ya maọbụ ịgọtara ndị na-eme ya n'ihi ihe abụla ihe."
Nke a na-eso okwu 'nọrọ n'ụlọ' (sit at home) abali ise nke Ekpa kpọrọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'ọnwa Disemba afọ 2022 (site n'abalị itoolu ruo abalị 13 nke ọnwa Disemba afọ 2022.)
Ekpa, onye na-akpọ onwe ya nwa azụ onye ndu otu Ipob (Nnamdi Kanu), nọ n'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia n'ọnwa Disemba ahụ sị ndị Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa 'apụtala ama'.
Ụmụ Naijrịa karịrị otu puku na narị ise binyere aka n'akwụkwọ mkpesa na soshal midia bekuoro gọọmentị mba Finland na nke Naijiria ka ha jiri ndị uweojii nwụchie Ekpa maka ebubo na ọ bụ ya kpalitere ọnwụ ndị e gburu maka inupuru iwu nọrọ n'ụlọ abalị ise ahụ.

N'akwụkwọ mkpesa ahụ nke ha tinyere n'intanetị ha boro ebubo sị, "Simon Ekpa ji ebe o bi na mba Finland mere ebe o ji agbasa ozi ịkpalite tigbuo-zogbuo site n'ịmanye ndị mmadụ iwu nọrọ n'ụlọ nke megidere ndị Igbo nakwa ụmụamala Naijiria ndị ọzọ. Ọkachasị ndị kwenyere ka ha na ndị ọzọ jikọọ ọnụ maka ọdịmma ụmụamala Naịjirịa na ibe ha."
Mana Gọọmentị Finland kwuru na ha amaghị maka mkpesa ọbụla megidere Ekpa.
"Ka o sila dị, Mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme n'ụlọ amaghị maka okwu metụtara ndị mmadụ maọbụ onye ọbụla."
"Ọ bụ ọrụ ndị uweojii ka ọ dịịrị itinye anya na mkpesa ọbụla e nwere megide onye ọbụla."
Ha gara n''ihu sị onye nwere mkpesa megide onye ọbụla na mba ahụ wegara ndị uweojii mba ha ozi site n'aka ọba ozi ndị uweojii mba ahụ ọkachasị okwu ọbụla metụtara ndị mmadụ maọbụ onye ọbụla"
Cheta na otu ndị bu egbe gburu ọtụtụ ndị mmadụ n'akụkụ dị iche iche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bido na abalị itoolu na iri na anọ nke ọnwa Disemba afọ 2022. Ọtụtụ ndị nwere agba katọrọ ya bụ iwu mana Ekpa na ndị otu ya gara n'ihu mezuo ya bụ atụmatụ.
Onye bụ Simon Ekpa?

Ebe foto si, Simon Ekpa/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
A malietere nụwa aha Simon Ekpa n'ọnwa Julai afọ 2021 dịka otu Ipob họpụtara ya ka ọ bụrụ onyeisi mgbasaozi n'igwe mgbasaozi ha bụ 'Radio Biafra,' ka Gọọmentị Naijiria nwụchiri Nnamdi Kanu bụbu onyeisi mgbasaozi ụlọ mgbasaozi ahụ.
Mana ka izuụka ole na ole a họpụtara ya gachara, otu Ipob chụdara ya n'ọkwa ahụ dịka ha kwuru na ọ naghị agbaso iwu mgbasaozi nke ụlọọrụ ahụ.
Mana nwamadi ahụ na-akpọ onwe ya, "nwa azụ" onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu gara n'ihu were akara ya na soshal midia agbasaozi banyere nnwereonwe Biafra.
O jikwa akara ya arịọ ego ọ sị na ọ bụ maka nkwado otu Eastern Security Network (ESN) nke bụ alaka ọgụ nke otu Ipob ma na-agbasakwa akụkọ ụgha, dịka ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ nyochara ha si kwuo.
Onye Ohaukwu dị n'Ebonyi steeti, a mụrụ ya n'afọ 1985.
Ekpa bi mba Finland na-akpọ onwe ya ọkaiwu nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.
O kwuru na ya gụrụ maka iwu na mahadum 'Aberystwyth University', dị na Wales, mba Briten.
Ekpa, onye jirila asọmpi athletics ritere Naijiria ọla nchara na-alụ nwaanyị majide nwa.












