‘Supreme Court’ o nwere ikike itinye ọnụ n’iwu mgbanwe ego naịra? Lee ihe iwu Naịjirịa kwuru

Ebe foto si, CBN
N’ọnwa Ọktoba 2022, Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ụlọakụ etiti bụ ‘Central Bank’ nke Naịjirịa iwu ka ha gbanwee akwụkwọ ego naịra 1000, 500 na 200.
Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele kwuru na atụmatụ ga-enye aka belata ego ndị mmadụ kpachiri, belata ịtụ mgbere ego nakwa wulite akụnaụba Naịjirịa dgz.
Ụlọakụ etiti nyere ndị mmadụ site mgbe ahụ ruo 31 Jenụwarị 2023 itinye ego ochie N1000, N500 na N200 ha nwere n’ụlọakụ ma were nke ọhụrụ.
Ha mechara gbatịa oge arụ ruo ụbọchị 10 Febụwarị 2023, mgbe ọ na-esiri ndị mmadụ ike inwete akwụkwọ ego ọhụrụ ndị a.
Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa bụ ‘Supreme Court jiri tinye ọnụ ma nye Gọọmentị etiti na CBN iwu ka ha gbara ịkwụsị ndị mmadu iji ego ochie azụ ahịa
Ọ bụ gọọmentị Kaduna, Kogi na Zamfara steeti kpụkpụrụ Gọọmentị etiti na Ụlọakụ etiti n’ụlọikpe kachasị n’ụbọchị 3 Febụwarị ka e gbochie ha imanye iwu ahụ.
Na Wenezde 15 Febụwarị ụlọikpe lebara okwu ahụ anya ọzọ ma yigharịa ya okwu n’ụbọchị 22 Febụwarị, 2023 ka ọ fọrọ ụbọchị atọ ka e mee ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa.
Nke a mere ka ọtụtụ ndị Naịjirịa nọrọ na mgbagwoju anya banyere ma ego ochie ndị ọ ka-adị ire, tinyekwara ụkọ ego ọhụrụ.
Mana Onyeisiala Muhammadu Buhari gbasara ozi n’ụbọchị Tọzde ma kwuo na N200 ochie ka ga-adị ire ruo ụbọchị 10 Eprelụ ebe N1000 na N500 agaghịzi adị ire.
Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị ọkaiwu katọrọ iwu a Onyeisiala Buhari nyere na mgbasaozi ya ma sị na ọ na-enupuisi n’iwu Ụlọikpe Kachasị nyere.
Ndị ọzọ na-ekwu na Ụlọikpe Kachasị enweghi ikike itinye ọnụ n’okwu banyere iwu na mkpebi metụtara ego (financial policy) na ọ bụ Ụlọakụ etiti na Gọọmentị etiti ka ọ dị n’aka.
Kedụ ihe ndị ọkaiwu kwuru?

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ajụjụ dị ọtụtụ mmadụ n’ọnụ ugbua bụ ma Ụlọikpe Kachasị onwere ikike itinye ọnụ n’iwu a Gọọmentị etiti na ụlọakụ etiti nyere maka mgbanwe ego ochie.
Otu onye ọkaiwu bụ Chidi Ikeotuonye gwara BBC Igbo na Ụlọikpe Kachasị nwere ikike ikpe ikpe banyere ihe niile dị n’iwu Naịjirịa maka na ọ bụ ebe ike ha si.
O kwuru na Ụlọikpe Kachasị na-achabi ikpe n’okwu ụlọikpe ukwu (High Court) na ụlọikpe mkpegharị (Appeal Court) tinyekwara ọnụ na ya.
Ọ gara n’ihu kwuo na ikpe ụlọikpe Kachasị na-ekpe bụ nke dịịrị gọọmentị etiti na gọọmentị steeti kama n’ihe banyere iwu metụtara ego a bụ ụlọakụ etiti ka ọ dị n’aka na-agbanyeghi na ha bụ otu n’ime ngalaba na-arụrụ gọọmentị etiti ọrụ.
Ikeotuonye kwuru na akwụkwọ gọọmentị steeti atọ ndị a gbara Gọọmentị etiti na ha etinyeghi Ụlọakụ etiti na ya, na nke a mere mkpebi ọbụla ụlọikpe kachasị mere agbasaghị ụlọakụ etiti.
Ọ sị na ụlọikpe ọ dị n’aka ileba anya nakwa ikpe ikpe gbasara iwu metụtara ego na akụnaụba bụ ụlọikpe ukwu.
Ọkaikpe ọzọ bụ Joseph Eboigbe sị na Ụlọikpe Kachasị mechuru onwe ha ihu itinye ọnụ n’okwu na-agbasaghị ha.
“Ha kwere ka ụfọdụ ndị ọkaiwu megharịa ha anya ma mee ka ha tinye kpee ikpe doro anya na ọ gbasaghị ha.”









