Buhari's broadcast today: Mgbati oge iji N200 ochie azụ ahịa abalị 60 na ihe ndị ọzọ Buhari kwuru n'ụtụtụ taa

Ebe foto si, Nigerian Govt
Onyeisiala Naijirua bụ Muhammadu Buhari agbatiela ohere iji oge ochie azụ ahịa ruo abalị 60 na-abịa.
Buhari nyere CBN ntuziaka ka ha wepụtakwa N200 ochie ọzọ iji belata ụkọ ego ma hapụ N200, 500 nakwa N1000 ọhụrụ ka e jiri ha ncha eme azụmachịa ruo abalị 60.
Buhari kwuru nke a na mgbasaozi o mere n'ikuku ụtụtụ Tọzde.
Ọ sịrị, "Iji mee ka ọ dịrị ụmụamala mfe, enyela m nkwado ka CBN wepụtakwa ego N200 ochie ka ya na ego N200,N500 nakwa N1000 ọhụrụ bụrụ ego a ga-eji azụ ahịa ruo abalị 60, malite na Febụwarị 10 rue April 10,2023 bụ oge N200 ochie agaghị abụkwa ego ọzọ."
Buhari kwuru na ọ bụ ndị aka ha adịghị ọcha nọga n'ụlọakụ na-ekponye aja na garị nke mere na atụmatụ ịgbanwe ego agaghị ka e siri hazie ya.
"Ọ bụ ndị aka ha adịghị ọcha bụ ndị na-eme m ihe a."
Ọgbaghara tara isi mmadụ ole na ole ma merụọ ọtụtụ ahụ dara na ụfọdụ steeti ọkachasị Delta, Edo, Enugwu na nsonso a, dịka ndị mmadụ enweghị ike ịgbanwe oge ochie ha maọbụ nweta nke ọhụrụ.
Ya bụ tigbuo-zogbuo nke butere ọgbụgba ọkụ nụfọdụ ụlọakụ nakwa mmebi igwe na-enye ego rịị elu abalị 15/02/2023 dịka ụfọdụ ụlọakụ jụrụ ịnabata ego ochie dịka Ụlọikpe Kachasị si nye n'iwu.
Ihe ndị ọzọ dị mkpa o kwuru

N'ozi ya ya Bụharị kwuru na atụmatụ ahụ amịtawala mkpụrụ dịka ego karịrị naira abụọ(N2.1trillion) nke bụ ego e jichiri anọbụghị n'aka ụlọakụ na ọ batakwara n'aka ha ọzọ.
Buhari gara n'ihu sị,
- "Ohere ka dị ndị mmadụ iweghachi ego N1000 na N500 ochie na CBN nakwa ebe ndị ọzọ e hiwere maka ịgbanwe ya."
- "CBN tinyekwuo uchu na ha na ụlọọrụ ndị na-abu agha megide rụụ aka ijichiri onye maọbụ ụlọrụ ọbụla na-agba atụmatụ ka iwu siri dị."
- "N'abalị 25 nke Febụwarị, afọ 2023, a ga-eme ntuliaka ịhọpụta onyeisiala nakwa ụlọomeiwu Etiti. I were m anya na atụmatụ mgbanwe ego a ka enye aka belata iji ego eme ndọrọndọrọ ọchịchị."
- "Onye ọbụla pụta ga tụọ vootu na enweghị egwu n'ihi na a ga-enwe ezigbo chekwa zuru oke, vootu ga-abụ ihe e jiri kpọrọ ihe."
- "Gbara tigbuo-zogbuo ọsọ na agwa ọbụla nwere ikpe ikpossa usoro ntuliaka."












