Chrisland school: A kpụpụla ụfọdụ n'ụlọakwụkwọ a ụlọikpe maka ọnwụ otu nwata akwụkwọ ha

Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ikpe gbasara amaghị ama gbuo mmadụ nakwa iji omume nleghara anya metụta onye ọzọ adanyela n’isi ụfodụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọakwụkwọ Chrisland dị na Legọs nke ha mechiri ka otu nwata akwụkwọ nwụrụ ebe ahụ n’ebe mbido afọ a.
Ozi gọọmentị kwukwara ndị ozọ ikpe a metụtara bụ ụfọdụ ndị na-ere ihe n'ụlọakwụkwọ a.
Ngalaba mgbasaozi nke ministri ikpe Lagọs wepụtara ozi a n’ụbọchị Fraịdee ma kwuo na a ga-akpụpụ ndị a a na-enyo n’okwu ụlọikpe maka ịda iwu nke akụkụ iwu Legọs (2015) akara 224 na 251.
Cheta na nwata akwụkwọ a aha ya bụ Whitney Adeniran dara ma kubie n’oge ụlọakwụkwọ na-eme emume egwuregwu. Nnyocha ụlọụgwọ mere n’ozu ya gosiri na ọ bụ ọkụ latrịk dogburu nwata ahụ dị afọ 12.
Dịka ọtụtụ akụkọ nakwa okwu pụtara n’ihe ndị mmadụ gburu nwata ahụ, onye ọkaikpe gọọmentị Legọs steeti bụkwa kọmịshọna ikpe steeti aha ya bụ Moyosore Onigbanjo nyere iwu ka enyocha ihe gburu ya kpọm kwem.
Ihe mere tupu e mechie ụlọakwụkwọ Chrisland a
Gọọmentị Legọs steeti mechiri ụlọakwụkwọ Chrisland nke dị na mpaghara Opebi-Ikeja, n'ihi ọnwụ nwata akwụkwọ ha n'ọnwa Febrụwarị a.
Nwata nwaanyị a dị naanị afọ 12 nwụrụ n'emume egwuregwu 'Inter-house sports' nke ụlọakwụkwọ ahụ haziri n'ama egwuregwu dị n'Agege, Legọs, n'ụbọchị Tọzde, Febrụwarị 9, 2023.
Ozi si n'aka Kọmishọna agụmakwụkwọ nke Legọs Steeti bụ Folasade Adefisayo n'oge ahụ kwuru na a ga-emechi ụlọakwụkwọ Chrisland Opebi nwa mgbe nta ruo mgbe e mechara nnyocha ihe butere ọnwụ nwata akwụkwọ ahụ.
"Anyị na-ekwe nkwa na anyị ga-agba mbọ niile anyị nwere ike iji hụ na e nyochapụtara ihe kpatara ọnwụ Whitney," Kọmishọna ahụ dere.
Ọ bụ ọkụ latrik dọgburu nwa m - Nna Whitney Adeniran

Ebe foto si, DR ADENIRAN
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nna Whitney Adeniran bụ nwata akwụkwọ dị afọ 12 nke ụlọakwụkwọ Chrisland International School nwụrụ nsonso a gwara BBC Pidgin na ọ bụ ọkụ latrik dọgburu nwa ya nwaanyị.
Ọ bụ na ya bụ mkparịtaụka ka nna nwatakịrị a bụ Michael Adeniran kwuru nke a taa bụ ụbọchị ụka.
Mazi Adeniran kwuru sị, "Ọ bụ ọkụ latrik sitere n'igwe na-ewepụta cotton Candy dọgburu nwa m. Ọ bụ ozugbo ahụ ya metụrụ ya ka ọ dọgburu ya".
O kwuru sị, " Edenyela m ya n'akwụkwọ na ọ bụ ọkụ latrik dọgburu nwa m, ọ bụghị nkụchi obi gburu ya".
O gara n'ihu na-ekwu sị, " Ahụ siri ya ike, ọ naghị arịa ọrịa ọbụla. Ka m kwuo ya ka ụwa niile mara na mgbe m hụrụ ozu nwa m, egbere ọnụ ya na ire ya na-eji oji".
Adeniran kwuru na ụmụ akwụkwọ ogbe nwa ya gwara ezinụlọ ya na ọ bụ ọkụ latrik dọgburu ya.
O kwuru na ọ bụ na Snapchat nke ụlọ akwụkwọ ahụ ka ha hụrụ ya bụ ịgba ama.
Mazi Adeniran kwuru na ya na-arịọ ngalaba ahụike nke ụlọọgwụ LASUTH ka ha mee nnyocha kwụ aka ọtọ gbasara ọnwụ nwa ya iji chọpụta n'ezie ihe butere ọnwụ ya.
Ihe ụlọakwụkwọ Chrisland kwuru

Ebe foto si, Chrisland
Akwụkwọ ozi si n'aka ụlọakwụkwọ Chrisland kwuru na mmadụ niile hụrụ oge Whitney koropuru, maka na onweghị ihe ọbụla e zoro ezo gbasara ya.
"Ihe mbụ anyị mere bụ ibuga ya n'ụlọọgwụ kacha nso, ebe ndị dọkịta nyere ya ikuku 'oxygen' nakwa enyemaka niile iji mee ka o bilie," ụlọakwụkwọ Chrisland dere.
"Oge ndị ezinụlọ ya chọrọ iburu ya ga lie, anyị rịọrọ ha ka e nye ohere iji mee nnyocha n'usoro sayensị iji chọpụta ihe butere ọnwụ ya.
"Dịka anyị na-eche maka mpụtara nnyocha ahụ, anyị na-ekwe nkwa inye ndị ezinụlọ nwata a nkwado niile ha chọrọ, ma na-ekpekwa ekpere ka ha kasie obi n'ihi ọnwụ a.
Ihe anyị ma maka ọnwụ nwatakịrị a
Nne na nna nwata nwaanyị a bụ Whitney Adeniran na-eti mkpu enyemaka gbasara ọnwụ nwa ha nwaanyị na-agụ n'ụlọakwụkwọ Chrisland International School dị na Opebi, Legọs.
Akụkọ kwuru na Whitney Adeniran koropụrụ ma nwụọ n'emume asọmpi egwuregwu nke ụlọakwụkwọ ahụ na-eme kwa afọ, a na-akpọ 'inter-house sports'.
Nne nwata ahụ bụ Blessing Adeniran kwuru na ya gara emume 'inter-house-sports' ahụ ịga lelee nwa ya nwaanyị, mana ọ hụghị nwa ya dịka ụmụakwụkwọ ibe ya kwụ n'ahịrị na-apụta.
Oge ahụ ka ọ jụụrụ ese gaa ebe ụmụakwụkwọ ndị ọzọ nọ, ha wee gwa ya na otu nwata akwụkwọ koropuru e wee buru ya gawa ụlọọgwụ.
"Oge m na-abịarute n'ụlọọgwụ, ọ bụrụ na nwa m anwụọla. Rute ugbua, onweghị onye gwarala mụ na di m kpọmkwem ihe mere nwa anyị," Oriaku Adeniran kwuru n'ihe onyonyo o tinyere n'akara Instagram ya.
"Ihe anyị chọrọ ịma bụ, 'gịnị gburu Whitney Adeniran'? Ụlọakwụkwọ Chrisland ga-azarịrị anyị ajụjụ a."
Ihe ndị uweojii kwuru
Ndị uweojii Legọs steeti kwuru na ha enwetala mkpesa gbasara ihe a merenụ ma kwuo na ya bụ okwu dị n'aka ngalaba a kpọrọ 'State Criminal Investigation Department'.
Benjamin Hundeyin, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs kwuru na a ga-eme nnyocha 'autopsy' iji mata ihe butere ọnwụ nwata ahụ.









