Chrisland school viral video: 'Chee aka ghọrọ iga mkpọrọ rụọ afọ 14 ma i kesaa ihe onyonyo aramara gosiri ụmụaka' - Gọọmentị Legọs steeti

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Legọs steeti agbarụọla ihu maka etu ndị mmadụ si ekesa ihe onyonyo gosiri mmekọ ụmụaka.
Nke a na-abịa dịka akụkọ ihe mere n'etiti ụmụaka ụlọakwụkwọ Chrisland school pụtara ihe na soshal midia na nso nso nke kpalịtere nkesa na nfegharị ihe onyonyo gosiri mmekọ ụmụaka na soshal midia.
Legọs steeti chetere ndị mmadụ na iwu ala Naịjirịa megidere nke a me kwuo na ntaramahụhụ ga-eso onye ọbụla ejidere ka ọ na-ekerị maọbụ na-ekesa ihe onyonyo gosiri ụmụaka ga-aga nga ruo afọ 14.
Ntaramahụhụ so iwu a metụkwara mmepụta ihe onyonyo gosiri ụmụaka, inata ihe onyonyo ahụ, izigara ya ndị ọzọ maọbụ ikesa ya.
Cheta na na ngwụcha izu a gara aga, akụkọ pụtara na soshal midia na ụmụaka ụlọakwụkwọ a nwere mmekọ mgbe ha gara njem ịnọchịte anya ụlọakwụkwọ ha na asọmpị e mere na Dubai.
Nne otu nwata n'ime ha na-ebo ebubo na ụmụakwụkwọ ibe ya nke ụmụnwoke iji ụzọ aghụghọ mee ya nwa ya nwaanyị dị afọ 10 dịna ha.
Ọtụtụ mbaụwa nwere iwu megidere ikesa ihe onyonyo gosiri ụmụaka mana usoro na iwu ntaramahụhụ so nke a dị iche na mba na mba.
Ndịịche iwu ndị a gụnyere ogogo afọ mmadụ ga-adị tupu agụnye ya dịka nwata na mba, itu e si kesa ya, etu e si mepụta ihe onyonyo ahụ.
Ngalaba mba ụwa nke International Centre for Missing & Exploited Children nakwa ECPAT International nọ n'isi ọrụ ichekwa ụmụaka nakwa imanye iwu ntaramahụhụ ndị mmadụ kwesịrị iweta ma ha tinye aka na iwakpo ụmụaka, ire ha, ikesa ihe onyonyo gosiri mmekọ na ihe ndị ọzọ.
Gọọmentị Legọs steeti emechiela ụlọakwụkwọ Christland High school

Ebe foto si, Chrisland School/Website
Gọomentị Legọs Steetị emechiela ụlọakwụkwọ Christland dị na VGC make ebubo mmetọ ụmụakwụkwọ nke pụtara.
Nke a dị n'ozi ha wepụtara site na ngalaba na-ahụ maka mwakpo nakwa mmetọ ụmụaka a kpọrọ 'Lagos State Domestic & Sexual Violence Agency'.
Mmechi ụlọakwụkwa a na-abịa dịka ihe ebubo banyere mmetọ na mwakpo ụmụakwụkọ malitere wuwe na soshal midia.
Ha kwuru na ngalaba gọọmentị dị iche iche na-eme nyocha banyere okwu a n'ụzọ pụrụiche.

Ebe foto si, Gọọmentị Legọs
Gịnị butere okwu a?
Akụkọ na-ekwu na o mere na nso nso a mgbe ụmụakwụkwọ Chrisland gara ịnọchita anya ụlọakwụkwọ n'obodo Dubai n'ihe dịka otu ọnwa gara aga.
Kama nne nwata nwaanyị nọ n'ihe onyonyo a na-efegharị apụtala kwuo okwu maka etu ya bụ ihe siri mee.
O kwuru ya n'ihe onyonyo Ubi Franklin bụ ọnye ndụmọdụ pụrụiche nke Gọvanọ Krọs Riva steeti bụ Ben Ayade wepụtara n'Instagram ya.
Nwaanyị a kọwara onwe ya dịka nne nwata akwụkwọ nwaanyị egosiri n'ihe onyonyo ebe a sị na ụmụakwụkwọ a na-edina onwe ha.
Nwaanyị a kwuru sị, "Ana m akpọ oku ka ndị Naijirịa gbatara m ọsọ enyemaka".
O kwuru na ọ bụ onyeisi ndị nkuzi n'ụlọakwụkwọ kpọrọ ya were sị na ọ chọrọ ịhụ ya.
O gara n'ihu sị, "mgbe m mechara hụ ya, ya na ndị nkuzi abụọ ọ ebe ahụ, ha gwara m na nwa m nwaanyị na nwata akwụkwọ nwoke ọzọ susuru ọnụ".
Nne nwata akwụkwọ nwaanyị a kwuru na ha gwara ya na ihe ha chọrọ bụ ka ọ napụ nwa ya nwaanyị ekwe ntị ya ka ọ hapụ ịna amụta agwa ọjọo ndị a.
O kwuru sị, "A jụrụ m ha ma e nwere ihe ọzọ, ha a sịm mba".
Nwaanyị a kwukwara na ha sị ya agwala di ya n'ihi na ọ bụghị ihe niile ka ọ kwesịrị ịgwa di ya.
Ọ gara n'ihu kọwaa na n'ihe dịka izuụka abụọ maọbụ atọ ha nwechara nzukọ na Azike kpọrọ ya ka ha nwee nzụkọ ọzọ n'igwe Zoom.
O kwuru sị, " Ndịọchịchị ụlọakwụkwọ nọ na nzụkọ nke a buru ibu, ọ bụ otuonye sị na aha ya bụ Akin dịka ya bụ onye na-achịkọta nzụkọ a".
O kwuru na ha sị ya na ha chọrọ ịmata etu ihe dị kamgbe ya na ha nwechara nzụkọ.
O kwuru sị, " ka anyị mechara nzụkọ a ha agwaghị m ihe ọbụla, kama ka otu ụbọchị gachara ka otu nne na nna kpọrọ m sị ka mụ na ya hụ nke taa nke echi".
Ọ gwara m sị, "lekwa ihe onyonyo a na-ewu n'ụlọakwụkwọ Chrisland School, ma sị m na nne na nna ndị ọzọ ma maka ya".
Ebubo nne nwata akwụkwọ na-ebo ndị ụloakwụkwọ Chrisland
Nne nwata akwụkwọ a kwuputara iwe ya na ụfọdụ ihe ọ na-ebu ndụ ụlọakwụkwọ Chrisland
- Nwaanyị a kwuru na ha bidoro tiwe nwa ha ihe, o mechaa kwuo na onyeisi nkuzi ha yiri ya egwu sị ya ekwula okwu.
- O kwuru sị, "nwa m gwara m etu ndị ụlọakwụkwọ siri hapụ naanị ha n'ụlọ ndina mgbe ha nọ na Dubai bụ ebe ihe a mere.
- O kwuru na ha gbara nwa ya ajụjụ ọnụ na-agwaghị ya.
- Na ha yiri nwa ya egwu na ha ga-egbu ya ma ọ gwa onye ọbụla
- O bo kwara ebubo na ndị ụlọ akwụkwọ a kpọ nwa ya mee nyocha maka ịmata ma ọ dị ime na-agwaghị ya.
Ihe nwata akwụkwọ nwaanyị a kọọrọ nne ya maka etu ihe siri mee
O kwuru sị, "mgbe m sị nwa m kọwaara m ihe mere, o sị m na otu nwata nwoke bụ Kachi si ya nye ya ihe oji a charge ekwe ntị ya".
O kwuru na Kachi kpọrọ ya ka ọ bịa were charger ya.
Na mgbe ọ batara ebe ha nọ na otu onye si ya banye n'ụlọ mposi ka ọ gaa were charger ekwenti ya.
O kwuru na mgbe ọ banyere ka ha jidere ya were jiri ike mee ka ọ ṅụọ otu ihe.
Na mgbe ọ ṅụchara ya na ọmaghịzị ihe ọ na-eme.
O kwuru sị, "Nwa m sị na ha sị ya rịkwasị ha n'elu ha ejiri ekwe ntị na ese ihe mere".
Ihe ndị uweojii kwuru
Ndị uweojii Legọs Steetị ekwuola na ha amalitela ileba anya n'ebubo mmetọ a sị mere n'ụlọakwụkwọ Christland.
Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Benjamin Hundeyin wepụtara ma sị na ha ga-agba mbọ hụụ na-enwetere ikpe ziri ezi.
Kedụ ihe ndịụlọ akwụkwọ Chrisland na-ekwu maka ebubo a?
E nwebeghi ihe ụlọakwukwọ Chrisland kwuru banyere ebubo nne nwata a buru ha.
Mana ha dị na mbụ wepụta akwụkwọ ozi bụ nke ha zigaara nne na nna ụmụaka ndị o metụtara.
N'akwụkwọ ozi ahụ, ha sị na ha achụọla ụmụakwụkwọ ndị so na ndị o metụtara gụnyere nwa nwaanyị n'ụlọakwụkwọ.

Ebe foto si, Christland Schools

Ebe foto si, Christland Schools
Ụlọakwụkwọ ndị ọzọ aha wuru na soshal midia
Nke a bụghị mbụ a na-anụ akụkọ banyere mmetọ, mwakpo nakwa ihe ọjọọ banyere ụmụakwụkwọ nso nso a.
Ụlọakwụkwọ Dowen College dị na Legọs wuru ewu maka ebubo na ụmụakwụkwọ tiri nwata ibe ha ihe nke butere ọnwụ ya.

Ebe foto si, Sylvester Oromoni
Ndị isi ụlọ akwụkwọ Dowen College kwuru na ọ bụ ebe Sylvester Oromoni na-agba bọọlụ ka ọ nọrọ merụọ ahụ, nke butere ọnwụ ya.
Mana nna nwata ahụ, aha ya bụkwa Sylvester Oromoni, kwuru na akụkọ ahụ bụ ụgha.
Mazi Oromoni kwuru na nwa ya gwara ya tupu ọ nwụọ na ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ya tiri ya ihe ma merụọ ya ahụ.
Mgbe gọọmentị tinyere ọnụ ma mee nyocha, ha sị na ọ bụ ọrịa oyi Sylvester na-arịa mere o jiri nwụọ.
Nna Sylvester anabataghị mpụtara nyocha ahụ na-agbanyeghi na e liela ozu ya.
Nke mere na Deeper Life High School
Ọ bụ n'ụlọikpe dị n'Uyo isi obodo Akwa Ibom ka e kpere ikpe ụmụ akwụkwọ sekọndịrị abụo maka ebubo na ha wakporo nwata akwụkwọ ibe ha dị afọ iri na otu n'ime ọnwa abụọ.
Nke a bidoro dịka Nne nwata ahụ pụtara n'onyonyo soshal tie mkpu na a wakporo nwa ya n'ụlo akwụkwọ ahụ.
Ndịisi nchịkọta ụlo akwụkwọ a mechara chụọ onyeisi ndị nkuzi n'ụlọakwụkwọ ahụ.









