Child Abuse: Ihe mere mmetọ ụmụaka ụmụnwọke ji arị elu

Ebe foto si, Getty Images
Dịka mwakpo ụmụnwaayị bụ akụkọ a kpụ n'ọnụ ugbua na Naịjirịa, ọ dịkwa mkpa na e tinyere anya na mwakpo ụmụnwoke ọkachasị ụmụaka.
Ugboro ole na ole ka akụkọ mwakpọ na mmetọ ụmụaka ụmụnwoke na-apụta mana a naghị etinyechara ya anya dịka ọ dị na nke ụmụnwaanyị.
Nke a mere anyị ji sị ka e lebanye n'ụfọdụ ihe na-ebu nke a, ihe ndị mere o ji arị elu, ihe nne na nna kwesịrị ime gdz.
Chimezie Elekwachi bụ onye nchịkọta ọrụ n'ụlọọrụ na-ebuagha megide mwakpo ụmụaka a kpọrọ 'African Network for Prevention and Protection of Child Abuse and Neglect' nyere aka n'ịsa ajụjụ ndị a.
O kwuru na-abịa n'ime mkpesa mwakpo ụmụaka ise batara n'ụlọọrụ ha na otu n'ime ha bụ nke metụtara ụmụnwoke.
Ihe ndị na-ebute mmetọ ụmụaka ụmụnwoke
Chimezie Elekwachi sị na e nwere ọtụtụ ihe na-ebute mwakpo na mmetọ ụmụaka bụ ndị gụnyere;
Ọ sị na otu ihe na-ebutekatị ya bụ ihe a mụtara a mụta, na nwata e metọrọ mgbe ọ dị obere ga-achọ imetọ nwata ọzọ ma ọ bụrụ na o too.
O kwuru na ndị ọkachamara kọwara na ụfọdụ na-amụta ụdị agwa a n'onwe ha dịka ha na-etolite a kpọrọ 'Developmental homosexuality'.
Ụmụaka ndị ga-ebido na-amụ ya n'etiti ụmụaka ibe ha, si zie ebe ahụ mere na-aga n'ihu.
Gịnị mere o ji arị ibe ya elu?
Elekwachi sị na ihe mere akụkọ ịwakpo ụmụaka ji arị ibe ya elu ugbua bụ maka ịntanet nke nyere aka n'iji agbasa ozi n'ụwa.
Nke bụ na onye pụta kwuo nke ya n'ịntanet, ndị ọzọ ewere ohere ahụ pụta kwuo nke ha, akụkọ a na-agbasa.
O sị na mwakpo na mmetọ ụmụaka bụ ihe na-eme kamgbe gboo mana o nweghi etu e si ekwupụta ya.
Kedụ ọrụ dịrị nne na nna banyere nke a?

Elekwachi sị nne na nna kwesịrị ịṅa ntị n'ụfọdụ okwu ụmụaka ha na-akwa ha, na mgbe ụfọdụ na ọ bụ ihe banyere onye metọrọ ha.
Na ha kwesiri iji nka chọpụta nke ọjọọ ma na-enyocha ahụ ụmụaka ha kwa mgbe kwa mgbe, iji chọpụta ma o nwere ihe dị iche n'ahụ ha.
Ọ gara n'ihu kwuo na ha chọpụta na a wakporo nwa ha, ka ha akatọla nwa ahụ, a mala ya ikpe maọbụ taa ya ụta.
Kama ka ha jiri nwayọọ kwado nwata ahụ site n'iti ya aka n'obi, ikpesara ndị uweojii maọbụ ụlọikpe.
Ọzọ bụrụ na ha ga-akuziri nwata ahụ ụfọdụ ihe ndị a, ihe ọ pụtara, ọghọm dị na ya, mee ka ha mata na ọ bụ ihe ọjọọ.
Nke ka nke bụ ka nne na nna gwa nwata ahụ ka ọ kpọọ aha onye ọbụla meturu ya n'ebe nakwa n'ụzọ na-adịghị mma.








