Gịnị ga-eme ka nwoke a bekachaa ụmụ ya atọ?

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii n'Ebonyi steeti anwụchiela otu nwoke ji mma ekwu wakpo ụmụ ya atọ.
Ụmụaka abụọ n'ime atọ anwụọla ebe nke atọ na-alụ ọgụ ọnwụ na ndụ.
Nwoke ahụ aha ya bụ Chinasa Ogbaga gbara nwunye ya alụkwaghịm kemgbe ọnwa Febụwarị afọ a.
Nne ya kwuru na ọ chere na ọ bụ Ogbanje na-enye nwa ya nsogbu.
Onye na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Loveth Odeh gwara ụlọ ntaakụkọ Punch na ha ebidola ịnyocha ya bụ okwu.
Kedụ ihe na-akpata ụdịrị omume a?

Ebe foto si, Getty Images
Otu dọkịta na-ahụ maka ahụike ụbụrụ bụ Aroyewu Afolabi kọwara BBC Igbo ụfọdụ ihe na-akpata ụdiri omume a.
O kwuru na onye na-anọkata mee ihe atụghị anya n'aka ya dịka nke a nwere nsogbu ahụike ụbụrụ.
Maazị Afolabi kọwara na nsogbu ahụike ụbụrụ anaghị egosiputa onwe ya n'omume mmadụ mgbe niile.
Mana lee ụfọdụ ụzọ e nwereike ịsị chọpụta na mmadụ na-enwe nsogbu ahụike ụbụrụ.
- Mgbe ọ rara mmadụ ahụ ịhi ụra n'abalị
- Mgbe ọ dị mmadụ ka ihe a na-arịgharị ya n'ime ahụ maọbụ n'ụbụrụ.
- Mgbe mmadụ na-anụ olu sọsọ ya na-anụ maọbụ hụ ihe sọsọ ya na-ahụ.
- Mgbe mmadụ bidoro ịhụta onwe ya dịka ihe ọ bụghị ịmaatụ mmadụ nọkata kwuwe "a bụ m chukwu".
O kwuru na ndị mmadụ ịkwu na ihe niile bụ maka ajọ mmụọ so na ọ dachi ịchọpụta ndị nwere nsogbu a.
Na ngwụcha, o kwuru na ọ bụghị sọsọ ụzọ ndị a ka-esi a ma ndị nwere nsogbu kama ka ndị mmadụ mụrụ anya ka azụ ma omume mmadụ gbanwee.









