Sylvester Oromoni autopsy: Ọ nwụrụ ọnwụ chi ya ọ bụghị ntigbu ka etigburu ya - Uweojii Legọs

Ebe foto si, Dowen College/Nigerian Police
Ndị uweojii Legọs Steetị sị na Sylvester Oromoni nwụrụ ọnwụ chi ya na o nweghi ihe gosiri na e tigburu ya etigbu maọbụ nye ya nsi.
Kọmishọna uweojii na steetị ahụ bụ Hakeem Odumosu kwuru nke a n'ozu o wepụtara maka ihe gburu nwata dị afọ iri na abụọ.
Ọ sị na nyocha e mere n'ụlọọgwụ dị na Warri nakwa Legọs kwuru na Sylvester nwụrụ ọnwụ chi ya..
Odumosu sị na ndị a na-ebo ebubo maka ọnwụ nwata ahụ sị na o nweghi ihe ha tiri ya maọbụ nye ya nsi n'ọnụ.
Gọọmentị Legọs Steetị sị ka a tọhapụ ndị a na-enyo enyo n'ọnwụ Sylvester Oromoni

Ebe foto si, Dowen College
Gọọmentị Legọs steeti na ndị ekwuola na aka ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi a na-enyo maka ọnwụ nwataakwụkwọ Dowen College bụ Sylvester Oromoni dị ọcha.
Ọkaikpe nọ n'isi ikpe a bụ Adetutu Oshinusi binyere aka n'akwụkwọ ndụmọdụ nye osote kọmịshọna steeti ahụ, ngalaba nchekwa pụrụiche bụ State Criminal Investigation nakwa ọkaikpe Olatunbosun Adeola.
Akwụkwọ ozi so mpụtara nnyocha ime ahụ e mere nwataakwụkwọ ahụ kwuru na e nweghi onye tiri ya bụ nwa akwụkwọ ihe.
E kwukwara na e nweghi onye nyere Sylvester nsi kama na ọ bụ ahụike ya daturu site n'aka ọrịa dị icheiche ji ya bụ ihe gburu ya.
Ọrịa na ọnọdụ ahụike mpụtara nnyocha ahụike e mere n'isi Sylvester Oromoni gosiri n'ọbụ ọrịa oyi bara na ngụgụ nakwa nje bara ya n'ụmị.
Ihe a Beekee kpọrọ ọrịa ndị ahụ bụ "Septicaemia, Lobar Pneumonia with Acute Pyelonephritis, Pyomyositis of the right ankle and Acute Bacteria Pneumonia due to severe Sepsis" bụ ihe gburu ya bụ nwata.
Akwụkwọ ndụmọdụ ahụ kwuru ka a tọhapụ ụmụakwụkwọ ise na ndị nkuzi ise e ji ji n'okwu ọnwụ Sylvester dịka aka ha dị ọcha.
Cheta na akụkọ kwuru na ụmụakwụkwọ ibe ya mekpara ya ahụ, tie ya ihe ma nye ya nsi nke mere o ji nwụọ n'ọnwa Disemba 2021.
E mechala nyocha 'autopsy' n'ozu Sylvester Oromoni

Ebe foto si, BBC/ Dowen College Facebook
Ndị uweojii nke Legọs steeti e burula ozu Sylvester Oromoni nke nwụrụ na Dowen College bunye nne na nna ya maka olili.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Adekunle Ajisebutu kwuru na ụlọrụ ya bunyere ndị bee Oromoni ozu ya ka ha mechara nyocha n'ozu ya iji chọpụta kpọmkwem etu o si nwụ.
E buru ọzụ Sylvester gawa Legọs ụbọchị Monde site na Delta steeti maka ịnyocha ozu ya n'ụlọrụ na-ahụ maka nyocha na Legọs.
E mere nyocha n'ihu otu ise a: Nne na nna Oromoni, nne na nna ụmụaka tigburu Oromoni, ndị nnọchite anya ụlọakwụkwọ Dowen, ndị uweojii na-eme nyocha nakwa onye nọchitere gọọmenti Legos anya si ngalaba ahụike steeti ahụ.
Ụlọọrụ mgbasaozi Channels depụtara na uche gọọmenti Legos dị n'ịmata mpụtara nyocha ahụ mana ruo ugbua ndị uweojii ewepụtabeghị mpụtara ha merela dịka ha na-ekwu na ha ka na-eme nyocha.
Cheta na akụkọ pụtara na ngwụcha Novemba maka etu ụmụakwụkwọ ise si tigbuo Oromoni n'ụlọakwụkwọ Dowen college dị na Legọs mana ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ si na ọ bụ egwu ka ọ na-agba wee merụọ ahụ n'oge mbụ.
E jidela ụmụakwụkwọ atọ ma na-achọ abụọ maka ọnwụ Sylvester Oromoni
Ndị uweojii Legọs, ekwuola na ha anwụchiela ụmụakwụkwọ Dowen College atọ maka ịkụgbụ nwa akwụkwọ ibe ha bụ Sylvester Oromoni.
Kọmịshọnan ndị uweojii steeti ahụ bụ Hakeem Odumosu, gwara ụlọ ntaakụkọ Punch nke a n'ụbọchị Tuzde.
Odumosu kwuru na ha ka na-achọ abụọ ndị ọzọ a kpọrọ aha na mkpamkpa ahụ kpara n'ụlọakwụkwọ ahụ dị na Lekki Legọs.
Cheta na kepukepu na-ekwubu na ndị mụrụ ụmụaka abụọ n'ime ndị a na-arụ aka na ya bụ mkpamkpa akpọpụla ha mba ofesi.
Odumosu kwukwara onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ na ndị isi ụlọobibi ụmụakwụkwọ ahụ na-enyere ha aka na nnyocha dịka ha na-enyocha maka ọnwụ nwata ahụ.
Oromoni gbara afọ 12 nwụrụ n'abalị 30 Novemba n'ụlọgwụ dịka ọ kpọpụtachara ezinaụlọ ya aha ụmụ akwụkwọ ibe ya mmadụ ise ndị o kwuru gbakọrọ aka kụjaa ya ahụ maka ịjụ isonye n'otu nzuzo.
Mana ụlọakwụkwọ ha kwuburu na nwata ahụ merụrụ ahụ ebe ọ na-agba bọọlụ.
Anyị dị njikere ka e mee nnyocha gbasara ọnwụ Sylvester Oromoni - Dowen College

Ebe foto si, Dowen College
Ụlọ akwụkwọ Dowen College Legọs ekwuola okwu gbasara ọnwụ nwa akwụkwọ ha bụ Sylvester Oromoni onye akụkọ kwuru na ọ bụ ụmụakwụkwọ ibe ya ji aka tigbuo ya.
Dowen College kwuru nke a site n'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'akara Instagram ha n'ụbọchị Sọnde.
Ha kwuru na ọnwụ Sylvester Oromoni wutere ha n'ihi na ọ bụ nwata ndị nkuzi ya hụrụ n'anya nke ukwuu.

Ebe foto si, Dowen College
"Ihe ọdachị a nke butere ọnwụ Sylvester Oromoni bụ ihe e kwesịrị ime nnyocha miri emi iji chọpụta ihe merenụ kpọmkwem."
"Anyị bụ Dowen College kwenyesiri ike na nke a."
"Anyị na-enye aka ịhụ na e mere nnyocha iji chọpụta ebe mmiri siri baa n'opi ụgbọgụrụ."
"Anyị emeela ihe nke mbụ dị mkpa nke bụ imechi ụlọakwụkwọ anyị iji nye aka ka nnyocha malite."
Ụlọakwụkwọ ahụ kpekwara ekpere ka Chukwu kasie ndị ezinụlọ Oromoni obi maka ọnwụ nwa ha.
Anyị ga-esogide okwu nwa anyị e gburu na Dowen College ruo n'isi njedebe - Okowa

Ebe foto si, Facebook/Ifeanyi Okowa
Gọvanọ Delta Steeti bụ Ifeanyị Okowa eforola ntutu taa ma kwuo na gọọmentị ya ga-esorịrị okwu Sylvester Oromoni ruo n'isi njedebe.
Sylvester Oromoni bụ nwata aakwụkwọ Dowe College, Legọs, onye a na-ekwu na ụmụakwụkwọ ibe ya ji aka tigbuo ya.
Nne na nna Sylvester kwuru na nwa ha nwụrụ n'ihi etu ụmụ akwụkwọ ibe ya si kụọ ya ihe maka na ọ jụrụ ịbanye otu nzuzo.
Mana ụlọakwụkwọ Dowen College na-ekwu na ọ bụ ebe ọ na-agba bọọlụ ka ọ dara ada wee merụọ ahụ nke kpatara ọnwụ ya.

Ebe foto si, Facebook screengrab
N'okwu ya, Gọvanọ Ifeanyi Okowa kwuru na obi dị ya mma etu gọọmentị Legọs siri mechie ụlọakwụkwọ Dowen College ma kwuo ka e nyochaa ọnwụ Sylvester.
Okowa kwuru sị: "Dịka gọọmentị ji ndụ mmadụ kpọrọ ihe, anyị ekpebiela na anyị ga-esogide okwu a ruo n'isi njedebe."
"Mana dịka anyị na-eche mpụtara nnyocha ahụ, anyị na-ekpe ekpere ka Chineke kasie ezinụlọ Omoroni obi."
Ndị ọzọ tinyekwara ọnụ n'okwu ahụ bụ Atiku Abubakar, bụbu Osote Onyeisiala Naịjirịa; Ben Murray Bruce, bụbu Sinetọ nọchitere anya Bayelsa Centra, na ụfọdụ ndị ọzọ.

Ebe foto si, Facebook screengrab
Na nke dịka ibe ya, Atiku kpọkwara oku ka e nyochaa ọnwụ Sylvester ruo n'isi njedebe iji mee ka ikpe ziri ezi pụta ihe.
Otu ahụ kwa ka Ben Murray Bruce si kwuo ka a ghara ikpuchi eziokwu aka n'okwu gbasara ọnwụ Sylvester Omoroni.

Ebe foto si, Facebook screen grab
Taa kwesiri ịbu ụbọchị ncheta ọmụmụ nwa m - Nna Sylvester Oromoni

Ebe foto si, Perrison Oromoni
Maazị Sylvester Oromoni bụ nna Sylvester Oromoni bụbu nwata akwụkwọ ụlọakwụkwọ Dowen kwuru na ụbọchi anọ nke ọnwa Decemba kwesiri ịbụ ụbọchi ncheta ọmụmụ nwata ahụ.
Maazị Oromoni kwuru nke a dịka aka na-achị Delta Steeti bụ Ifeanyi Okowa kpọrọ ya iji kasie ya obi maka ọnwụ nwa ya.
Nke a na-abịka dịka onyeisi ndị uweojii na Legọs Steeti bụ Hakeem Odumosu kwuru na ndị otu ya ga-enyocha ma chọpụta ihe mere Sylvester Oromoni bụ nwata akwụkwọ ulọakwụkwọ Dowen tupu ọ nwụọ.
Onyeisi ndi uweojii gwara BBC Pidgin n'ubọchị Fraịde na ha agaghị egbo oge ịnwụchị ma ịkpụpụ ndị aka ha dị n'ọnwa nwatakịrị a dị afọ 12 ụlọikpe.
Maazị Odumosu si na ihe dị mkpa ugbua bụ ime nnyocha chọpụta mata ihe mere.
Nke na-abịa dịka ndị gọọmentị steeti ahụ mechiri ya bụ ụlọakwụkwọ maka ihe mere.
Gọọmentị Legọs emechiela ụlọakwụkwọ Dowen College.
Ganiu Lawal bụ ọnụ na-ekwuru Mịnịstrị agụmakwụkwọ nke Legọs kwuru nke a n'ụbọchị Fraịde.
Nke a na-abịa dịka nwata akwụkwọ gbara afọ iri na abụọ aha ya bụ Sylvester Oromoni.
Akụkwọ kwuru na Sylvester Oromoni nwụrụ oge ụmụakwụkwọ ibe ya tiri ya ihe tinka tiri pan, n'ihi na ọ jụrụ isonye ha n'otu nzuzo.
Gịnị mere kpọmkwem?

Ebe foto si, Sylvester Oromoni
Ndị isi ụlọ akwụkwọ Dowen College kwuru na ọ bụ ebe Sylvester Oromoni na-agba bọọlụ ka ọ nọrọ merụọ ahụ, nke butere ọnwụ ya.
Mana nna nwata ahụ, aha ya bụkwa Sylvester Oromoni, kwuru na akụkọ ahụ bụ ụgha.
Mazi Oromoni kwuru na nwa ya gwara ya tupu ọ nwụọ na ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ya tiri ya ihe ma merụọ ya ahụ.
Oromoni kwuru sị: "Nwa m gwara m na ọ bụ mmadụ ise batara n'ime ụlọ ebe ha bi, gbanyụọ ọkụ, ma malite iti ya ihe."
"Ụmụakwụkwọ ndị ọzọ nọ ebe ahụ oge ya bụ ihe mere."

Ebe foto si, Screengrab
Mazi Oromoni kwuru na ọ bụ maka na nwa ya ekweghị abanye n'otu nzuzo kpatara ụmụakwụkwọ ndị ọzọ ahụ ji tie ya ihe.
O kwuru na ọ bụ n'ụbọchị 21 nke ọnwa Nọvemba ka ụlọakwụkwọ kpọrọ ya na-ekwu na nwa ya nọ n'ụlọọgwụ n'ihi na o merụrụ ahụ ebe ọ na-agba bọọlụ.
Mana oge ha zigara mmadụ ka ọ ga hụ ya, onye ahụ kwuru na ahụ o merụrụ karịrị ịgba bọọlụ.
"Ọnụ ya niile na-eji oji, o nweghị ike ịkwụ ọtọ."
Ha mechara tinye ya n'ụgbọelu si Legọs bulata ya Warri ebe ha bi, wee malite inye ya ọgwụgwọ.
Ọ bụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba ka Junior gwara nne ya na ọ bụghị bọọlụ ka ọ na-agba mere o ji merụọ ahụ.
O kwuru sị: "Mummy, agabghị m bọọlụ. Adaghị m ada ebe m na-agba bọọlụ".
Junior kwuru na ha kụrụ ya ihe, gbaa ya ụkwụ, zọọ ya ụkwụ n'ukwu ya, ụmụakwụkwọndị ọzọ gbara ọsọ.
Ndị ahụ tiri ya ihe yiri ya na ndị ọzọ egwu na ha ga-egbu ha ma ha gwa ndị nkuzi ha ihe merenụ.
Mazi Oromoni gwakwara ndị ntaakụkọ Punch na o teela aka ha malitere ịhụta ihe mmekpa ahụ gbasara nwa ha n'ụlọakwụkwọ Dowen College.
O kwuru na ha chọpụtara na ha nye nwa ha ihe oriri ruru puku naịra ise, ọ naghị akarị otu izuụka tupu nrị ahụ agwụ.
Mana nwa ha anaghị ekwe akọrọ ha ihe na-eme nri ha na-ebunye ya.
Ihe ụlọakwụkwọ Dowen College kwuru

Ebe foto si, Dowen College
Ụlọakwụkwọ Dowen College kwuru na ọ bụ n'ụbọchị 21 nke Nọvemba ka ọ dara ada ebe ọ na-agba bọọlụ.
Ha kwuru na ha kpọgara ya ụlọọgwụ ma nye ya ọgwụgwọ nwa mgbe nta tupu ha akpọọ nne ya ka ọ bịa kpọrọ ya
"Ọ tụrụ anyị n'anya oge anyị hụrụ akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ọ bụ ụmụakwụkwọ ibe ya tiri ya ihe," ụlọakwụkwọ ahụ dere.
Ha kwukwara na ha mere nnyocha nke gosiri na onweghị ihe dịka mmekpa ahụ ọbụla dị n'ụlọakwụkwọ ha.














