Child Bullying: Ụzọ ise ị ga-esi chọpụta mmekpa ahụ nwa gị na-agabiga n'ụlọ akwụkwọ

Nwata akwụkwọ

Ebe foto si, Free

Mmekpa ahụ ụmụakwụkwọ n'aka ụmụakwụkwọ ibe ha abụghị taa ka ọ malitere na Naịjirịa.

Ya bụ ihe nke bekee na-akpọ 'bullying' bụ nnukwu ajọ ihe nke e kwesịrị ijikọ aka ọnụ ma kwụsị ya n'ụlọakwụkwọ.

Akụkọ Sylvester Oromoni, nwata akwụkwọ Dowen College, Legọs, onye nwụrụ ọnwụ ike n'ihi etu ụmụakwụkwọ ibe ya si kụọ ya ihe, bụ nnukwu ihe ịgba anya mmiri.

Mana ndị ọkachamara na nlekọta ụmụaka ekwuola na ọ bụ nne na nna ka ọ dịịrị ịchọpụta mgbe a na-emekpa nwa ha ahụ n'ụlọakwụkwọ ma gbochie ya.

Anjula Mutanda bụ onye ọkachamara n'omume mmadụ kọwara BBC etu nne na nna ga-esi chọpụta nke a.

  • Nke mbụ: Ọ bụrụ na nwa gị na-ebe akwa kwa mgbe kwa mgbe, mana i nweghị ike ikwu ihe na-eti ya akwa
  • Nke abụọ: Ọ bụrụ na nwa gị na-achọ ịnọrọ onwe ya oge niile
  • Nke atọ: Ọ bụrụ na nwa gị anaghị enwe mmasị ịga ụlọakwụkwọ.
  • Nke anọ: Ọ bụrụ nwata bi ebi n'ụlọakwụkwọ, ihe oriri i nyere ya o ji biri n'ụlọ akwụkwọ na-agwụ ngwangwa karịa etu o kwesịrị
  • Nke ise: Ọ bụrụ na nwa gị anaghị eme ọfụma n'ụlọ akwụkwọ, n'agbanyeghị na ị ma na ọ na-amabu akwụkwọ n'oge mbụ

Ihe ị kwesịrị ime iji gbochie maọbụ kwụsị ya

Ụmụakwụkwọ bi n'ụlọakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nne na nna kwesịrị ị na-akpachapụ anya nke ukwuu maka ụmụ ha bi ebi n'ụlọakwụkwọ

Dịka Anjula Mutanda siri kwuo, ihe kacha mkpa bụ ka nne na nna gbaa mbọ ka ha na nwa ha na-enwe mkparịtaụka oge ọbụla.

"Ọtụtụ ụmụaka na-atụ nne na nna ha ụjọ, nke mere na ha anaghị agwa nne na nna ha ihe ha na-agabiga," Mutanda kwuru.

"Nke a adịghị mma ma ncha. Nwata ekwesịghị ị na-atụ nne ya maọbụ nna ya ụjọ."

Atụmatụ nchekwa ụmụaka (Child Protection System)

Ụmụakwụkwọ
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ ọbụla kwesịrị inwe atụmatụ maka nchekwa ụmụaka, nke bekee na-akpọ 'Child Protection Policy'

Onye ọzọ gwara BBC okwu gbasara nke a bụ Taiwo Akinlami, onye ọkachamara n'ilekọta ụmụaka nke bekee kpọrọ 'Child Protection expert'.

O kwuru sị: "Tupu itinye nwa gị n'ụlọ akwụkwọ ọbụla, jụọ ha atụmatụ ha wepụtara maka ichekwa ụmụaka, nke bekee kpọrọ 'Child Protection Policy'."

"Nke a bụ ebe ụlọakwụkwọ ahụ depụtara kpọmkwem ihe ha na-eme iji chekwaa ụmụaka nọ n'ụlọakwụkwọ ahụ."

"N'ime ya ha ga-edepụtakwa ntaramahụhụ dịịrị onye ọbụla mekpara nwata akwụkwọ ahụ."

Nye mkpesa na-egbughị oge ọbụla

Ngwangwa ị chpụtara na a na-emekpa nwa gị ahụ n'ụlọakwụkwọ, gbaa mbọ nye mkpesa ahụ n'aka ndị isi ụlọakwụkwọ nwa gị, Taiwo kwuru.

Ọ bụghị naanị inye mkpesa, gbaa mbọ hụ na mkpesa gị alaghị n'ụkpọrọ; ụlọakwụkwọ ahụ ga-emerịrị ihe gbasara ya.

Ndụmọdụ na mgbaziri (counselling)

Nwata akwụkwọ

Ebe foto si, Free

Nkọwa foto, Imekpa nwata ahụ n'ụlọakwụkwọ nwere ike ime ya ka ọ daghachi azụ n'agụmakwụkwọ ya

Taiwo kwuru na mmekpa ahụ na-emetụta ụmụaka n'ụzọ dị icheiche.

"Ọ dị mkpa ka ị na-enye nwa gị ndụmọdụ, ma na-agwa ya okwu ga na-ajalite mmụọ ya."

"Cheta na mmekpa ahụ na-eme ka ụjọ baa ụmụaka n'ahụ, mana ndụmọdụ dị otu a ga-enyere ya aka."

"Mee ka nwa gị mara na o nwere ike ịkọrọ gị ihe ọbụla na-eme na ndụ ya, na-atụghị ụjọ ọbụla."

Nwe onye ị tụkwasịrị obi n'ụlọakwụkwọ ahụ

Chọọ otu onye ị tụkwasịrị obi n'ụlọakwụkwọ ahụ, onye ga-ewetere gị ngwa ngwa gbasasra nwa gị.

Gbaa akwụkwọ n'ụlọikpe

Ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụrụ na ụlọakwụkwọ nwa gị emeghị ihe ọbụla gbasara mkpesa mmekpa ahụ i wegaara ha, i nwere ike ịkpụpụ ụlọakwụkwọ ahụ ụlọikpe.

Mana nke ka nke bụ ka ị wepu nwa gị n'ụlọakwụkwọ dị etu ahụ.

Taiwo kwukwara na ọ dị mkpa ka i nye nwa gị ọzụzụ gbasara etu ụwa dị ugbua.

Nye ya ọzụzụ ga-eme ka ọ gbasie ike, ghara ị na-atụ oke ụjọ n'ebe ụmụ ntakịrị ibe ya nọ.