Kedụ ihe bụ 'almajiri' na-etu mmadụ na-esi abụ ya?

Almajiri

Ebe foto si, AFP

Otu aha na-ewu ugbua bụ 'almajiri' dịka akụkọ na-efegharị maka ha n'ọwụwa-anyanwụ nakwa ebe ọzọ.

A na-eche na ihe butere akụkọ maka almajiri bụ dịka aka na-achị steeti ndị dị n'ugwu kagburu atụmatụ almajiri ma nwee nkwekọrịta na ha ga-amalite ịkpọla ndị almajiri ebe ha si.

Ọzọkwa bụ na a na-ejide ụgbọala bu mmadụ n'agbanyeghi na gọọmentị kagburu ibu mmadụ n'okeala steeti dị iche iche.

Ihe abụọ a nwereike bụrụ ihe e ji eme okwu na-eyi ndị mmadụ egwu nke aha almajiri nọ n'etiti ya.

Mana, okwu almajiri edoghi ndị ọwụwa-anyanwụ na ndị ndịda Naịjirịa ndị ọzọ anya makana ọ bụghị ihe njirimara na be ha.

Nke a butere anyị n'ajụjụ a bụ "kedụ ndị bụdị ndị a na-akpọ almajiri?"

Ihe bụ Almajiri

Etu ọbụla e si kwuo ya, ihe mbụ ị kwesịrị ịma maka almajiri bụ na ha bụ ụmụakwụkwọ.

Ndị almajiri bụ ụmụaka nne na nna ha kpọgara ụlọakwụkwọ ebe ha ga-anọ mụọ maka ofufe alakụba.

Ịma atụ ya ga-abụ ụmụaka na-aga akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ obibi nke Bekee na-akpọ "boarding school".

Ihe dịkwa iche n'atụmatụ ụlọakwụkwọ obibi nke Bekee na nke almajiri bụ na ebe a na-enye ndị nke Bekee nri na ọzụzụ purụiche, ndị nke almajiri bụ ihe ha rịọtara n'arịriọ ka ha na-eri.

Ọzọ bụkwa na ebe ndị nke ụlọakwụkwọ Bekee na-amụ ihe ọmụmụ dị iche iche, ndị almajiri na-amụ sọsọ ihe banyere ofufe alakụba.

Almajiri

Ebe foto si, Getty Images

Kedụ etu almajiri a siri malite?

Almajiri nwetere aha ha site n'asụsụ ndị Arab. Ọ bụ ihe ndị a na-akpọ "Al muhajirun", bụ nke pụtara onye na-aga njem maka ịmụta ofufe Alakụba.

Nke pụtara na ụmụaka a nọ n'ije ọmụmụ.

Ndị ma maka akụkọ a na-ekwu na tupu Bekee abata ebe a na-akpọzị Naịjirịa, ndị almajiri anaghị ebu efere akpagharị makana ndị na-achị obodo haziri ụlọakwụkwọ ha ọfụma.

Mana ka a bịara napụchaa ndị ọchịchị mgbe ahụ ikike ha, ihe niile mebichara nke mere na ụmụaka gara ọmụmụ a na-abụzị ndị ọ dịịrị ịchọta ihe ha ga-eri kwa ụbọchị. Ha na-eme nke a site n'ịrịọ arịrịọ.

Dịka ụfọdụ alakụba na-akwado onyinye, nne na nna na-ezipu ụmụ ha ịga ije a na-enwekarị olileanya na ha ga-enweta enyemaka.

Na mbụ, ọ bụ usoro a bụ usoro mmụta akwụkwọ dị n'ugwu Naịjirịa na-ebe ọzọ tupu e nwee mmụta akwụkwọ Bekee.

N'oge ahụ, a na-enwe ndị na-elekọta ụlọakwụkwọ ndị a nke eze mpaghara ha hibere. Ugbua, o bụzị oke na onwe ya chụwa ngwere.

Afọ ole ka ndị almajiri na-adị?

Ndị a bụ ụmụaka site n'oge amamihe ruo okoroọbịa.

Ndị dị ka nna nna ide ego Aliko Dangote bụ Alhassan Dantata, gabigakwara atụmatụ a ma ruo oge ọ dị afọ iri asaa.

Ọ bụ ohere a na-enye ka ndị almajiri na-amụtakwa ihe ọzọ oge ha anaghị amụ ọmụmụ alakụba mere nwoke a jiri mụta mgbere ma bụrụ ide kachasi nwee ego n'ọdịda anyanwu Afrịka mgbe ochie.

Ugbua, nwa nwa ya bụ Aliko Dangote bụ ide kachasị nwee ego n'Afrịka, mana yanwa esoghi n'usoro almajiri na ịmata izu nke ya.

Ndị Almajiri

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto a na-egosi ụmụakwụkwụ almajiri azọpụtara n'otu ụlọakwụkwọ Alakụba dị na Kaduna steeti n'afọ 2019

Ihe mere eji kagbuo atụmatụ a?

Dịka anyị dere ebe a mbụ, atụmatụ almajiri gbanwere n'oge ndị Bekee malitere ịchị ebe mechara bụrụ Naịjirịa.

Ka oge na-aga, ọtụtụ mmadụ malitere ịgbarụ ihu maka ọnọdụ ụmụaka a nakwa ụdịrị ahụhụ ha na-ata.

Nke a kpatara ndị mmadụ jiri na-asị ka akagbuo ya bụ atụmatụ.

Ọzọkwa bụ na usoro ya adabaghị n'usoro akwụkwọ Bekee.

N'oge ọchịchi ya, Goodluck Jonathan gbara mbọ ịrụpụta ụlọakwụkwọ ebe ndị almajiri na ụmụ ndị ọchị ehi anaghị anọ otu ebe ga na-aga akwụkwọ.

N'ịkagbụ atụmatụ a, gọvanọ Nasir El-Rufai nke Kaduna steeti kwuru sị na ọ bụ ọnọdụ coronavirus tinyere ụwa mere o jiri dịrị ha mfe.

Nasir El-Rufai

Ebe foto si, Twitter/El-Rufai

Ọ sị; "ma ya abụghị coronavirus, anyị agaghị ahụnwu ụmụaka n'otu ebe. Ọzọkwa bụ na coronavirus mere ka ndị mmadụ kwụsị ịpụta n'ezi, bụ ihe mere ụmụ na-eri oge ha hụrụ banye n'ezigbote ahụhụ nke mere o jiri dị mkpa ịkpọla ha.

"Ọ bụ coronavirus nyere anyị ohere ịkagbu atụmatụ a."

Gọvanọ El-Rufai sị na ụmụaka ga-amalite akwụkwọ Bekee ma ụlọakwukwọ mepee. Mana, ọ sịkwa na ọ bu etu o si metụta steeti Kaduna ka ọ na-ekwu maka ya.

Ndị gọọmentị steeti ndị dị n'Ugwu Awụsa a na-akpọbata ndị Almajiri n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa?

Onweghị ihe ọbụla BBC hụrụ ga-egosi na eziokwu dị n'ọtụtụ akụkọ na-efegharị na aka na-achị steeti ndị dị n'Ugwu Awụsa na-etinye ndị almajiri n'ụgbọala akpọsa ha n'ebe dị iche iche na Naịjirịa.

Nke BBC ma bụ eziokwu bụ na ọgbakọ steeti ndị Ugwu Naịjirịa nwere nkwekọrịta na ha ga-akpọla ụmụakwụkwọ almajiri nọ steeti ha be nne na nna ha.

Nke mere ha jiri kwekọrịta na steeti ọbụla ga-enweta ndị nke si steeti ha.

Dịka aka na-achị Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai siri kwuo "Anyị na ahanye ụmụaka n'aka gọọmentị steeti ha. Ebe ahụ ha eruo nso nne na nna ha. Nkwekọrịta anyị bụ na gọọmentị ọbụla ga-ama oge ndị nke ha na-alọta. N'otu aka ahụ, ọ ga-abụ ndị gọọmentị ga-akpọlata ha".

Ụgbọala bu ndị si Ugwu abata Legọs

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A nwụchiri ụgbọala bu ndị mmadụ si Ugwu abata Legọs n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee

Kedụ etu okwu coronavirus siri metụta ndị Almajiri

Dịka e dere n'elu, ọ bụ okwu coronavirus soro kwanye imechi ụlọakwụkwọ almajiri nakwa ịkpọla ha be a.

Ọnọdụ ha nke gụnyere ịrịọ arịriọ nakwa iri ihe ndị mmadụ riforo mere ka ha nọdụ n'ime ndị ọrịa na-efesa kwam kwam.

Ọ bụ aka na-achị Kaduna bụ El-Rufai kwuputere na ọkankụ ndị ahụrụ ọrịa coronavirus n'ahụ na steeti ha bụ ndị almajiri e si steeti Kano kpọlata.

Mana ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ dịghị etu a n'etiti ndị nke e si steeti ndị ọzọ kpọlata.

Etu ọbụla o sina dị, akwụkwọ almajiri alaala na Naịjirịa mana okwu maka ya ka ga na-agakwa n'ihu.

coronavirus
coronavirus branding