Coronavirus in Enugu: Anyị na-akwụsị ndi chọrọ iso ụgbọala bu nri bata ọwụwa anyanwụ - Uweojii Enugwu steeti

Ndị uweojii nwụchiri gwongworo bu ndị mmadụ si ugwu abata Legọs

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii nwụchiri gwongworo bu ndị mmadụ si ugwu abata Legọs n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na enweghi ndị na-esi n'okeala ha ezubata ndị mmadụ si steeti ọzọ dịka kepu kepu na-efegharị kwuru.

Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ gwara BBC Igbo na akụkọ na ndị mmadụ na-esi n'Ugwu abata steeti ha abụghị eziokwu n'ihi na ha ekechichaala okeala ha dịka o kwesịrị.

O kwuru na ha nweburu ya bụ nsogbu mgbe ndị ha na Enugu nwere okeala na-emechibeghi okeala nke ha, kama na ugbua Onyeisiala Muhammadu Buhari nyere iwu ka a kwụsị njem isi n'otu steeti fere n'ọzọ, na ndị nke ahụ ekechiwekwala oke nke ha.

Mana ọ bụ ebe ahụ ka okwu a kwụsịrị?

Ndukwe kwuru sị na ihe ha na-arịa ugbua bụ ndị mmadụ na-awa ụzọ n'ime ọhịa ka ndị mmadụ nwee ike jiri ụgbọala ha zopu ebe ndị uweojii na-echekwa okeala, ka a ghara ịhụ ha.

O kwuru na ha ga-achọta ma mechikwaa ụzọ ndị ahụ n'oge adịghị anya.

Onye uweojii na-enyocha ụgbọala ndị na-agafe

Ebe foto si, Getty Images

Gịnị ga-eme ndị na-ejighi akwụkwọ ikike ma rute n'okeala?

Ndukwe gwara BBC Igbo na ha na-achụghachị ndị ekwesịghị ịbata n'obodo ruru nso oke ahụ, ma kwukwaa na Kọmishọna uweojii nke Enugwu bụ Ahmed Abdulrahman na-agarukwa ebe ahụ ịhụ etu ndị otu ya si echekwa okeala ndị ahụ.

O kwuru na Abdulrahman na onwe ya nyekwara ndị uweojii iwu ịnwụchi ndị ọbụla a hụrụ bu ụgbọala na-abụghị ụdịrị e ji mara ndị Enugwu, ka e nwee ike nyochaa ha mara ebe ha si bịa na ihe ha chọ bịa.

Mana gịnị na-ebute okwu a na soshal midia?

Akụkọ na-efegharị etu e si anwụchi ụgbọala dị iche iche bu ndị mmadụ si ugwu Awụsa abata mpaghara dị iche iche.

Ụfọdụ ndị kwuru na etu a Enugwu na Kogi steeti nakwa Benue steeti si nwee okeala, na ọ bụ ebe ahụ ka gwongworo ndị a hụrụ bu ọtụtụ mmadụ si bata.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ndukwe gara n'ihu dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha rube isi n'iwu gọọmentị ma hapụ ime njem si n'otu steeti fere na steeti ọzọ.

Mara na Enugwu na steeti ndị gụnyere Benue, Kogi na Abịa nwere oke.