Coronavirus Lockdown: Ihe anya m hụrụ na 'Lockdown' a

Eyitayo Unini Abijogun

Ebe foto si, Eyitayo Unini Abijogun

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

Ọ bụ na ụbọchị 27 nke ọnwa Febụwarị ka ebenebe gburu na Naịjirịa dịka a chọpụtara onye mbụ ọrịa Coronavirus n'ala a.

Mana o ruchara ụbọchị 31 nke ọnwa Maachị tupu gọọmentị etiti etinye iwu "nọrọ n'ụlọ" na Legọs, Abuja nakwa Ogun steeti.

coronavirus
coronavirus branding

Ọ bụghị kwa mmadụ niile nwere ohere ịru ebe ezinaụlọ ha maọbụ ndị enyi ha nọ tupu ọnọdụ a ruru afọ ano e were malite.

BBC Igbo chọtara ụfọdụ ndị a, lee ihe ha kọọrọ anyị ebe a:

Uzodimma Okonkwo, dị afọ 32.

Uzodimma Okonkwo,

Ebe foto si, Uzodimma Okonkwo,

Uzodimma na-arụ ọrụ Bekee na-enyere ndị mmadu aka anata ego enyemaka n'aka ngalaba enyemaka dị icheiche.

O kwuru na tupu ebido "lockdown", ọ na-agba bọọlụ kwa ngwụcha izuụka, ọ na-agakwa na bee nwanne ya nwoke maọbụ ga leta ụmụnwanne ya ndị ọzọ.

"Lockdown a nyere m ohere ị si nri, gụọ akwụkwọ ma nye kwa m ohere ị si n'ụlọ rụọ ọrụ" ka Uzodimma gwara onye ntaakụkọ anyị "Mana ọ metụtakwara akpaego m n'ihi ego m mefuru n'elu nri, "data" m ji arụ ọrụ nakwa ụgwọ ọkụ latrik".

Ihe Uzodimma kachasị a tụ anya ma ọrịa Covid-19 laa bụ "ị gbaa bọọlụ!, nakwa ịhụ etu akụnaụba mba dị icheiche ga-esi gbakee n'ọdachi ọrịa a."

Eyitayo Unini Abijogun, dị afọ 27

Eyitayo Unini Abijogun

Ebe foto si, Eyitayo Unini Abijogun

Eyitayo na-arụ ọrụ dịka "Customer Support Executive" ma nwe kwa obere ahịa ọ na-azụ n'akụkụ na-ewetere ya obere ego.

Tupu "Lockdown" amalite, o kwuru na ya na ndị enyi ya na-apụ apụ kwa ngwụcha izuụka iji nwete onwe ha maọbụ ọ gaa mmemme dị icheiche.

"Ihe m hụrụ na Lockdown a juru m anya, ụfọdụ ụbọchị ebere m akwa n'ihi na egwu na-atụ m na m nọ sọsọ onwe m" ka Eyitayo kwuru.

"Akụkọ coronavirus nakwa arahụghị ụra ọfụma mere ka obi m daa mba mana akwụsịtụrụ m nke a site n'ịkpagharị kwa ụbọchị"

"Ihe m kachasị a tụ anya na ngwụcha ọrịa a bụ ịhụ ezinaụlọ m, ndị enyi m nakwa ị ga mmemme ọzọ. Oge a akụzierela m ihe ndị dị mkpa na ndụ m" ka Eyitayo kwuru.

Chukwudi Ukonne, dị afọ 27

Chukwudi Ukonne

Ebe foto si, Chukwudi Ukonne

Chukwudi na-arụ ọrụ "Creative Digital Strategist".

Tupu ọnọdụ a ebido, ọ na-aga ụlọ photo na eserese, na-aga ụka nakwa nleta ndị enyi ya.

"Mgbe ọnọdụ a bidoro, a chụrụ ụfọdụ ndị ụlọọrụ anyị nke mere na ọrụ ka zi nkụ n'aka m. Enweghizi m ike isi nri, ịmegharị ahụ maọbụ ịri nri."

Mana o kwuru na ọ chọtara onwe ya site n'ịchọta ndị enyi ọhụrụ na Twitter nakwa ịmụ akwụkwọ ọhụrụ ọzọ n'Intanetị.

"Ihe m kachasị atụ anya na ngwụcha ọrịa a bụ ịmakụ ndị mmadụ ọzọ mana a ma m na ọ ga-eto aka tupu ebidokwa nke ahụ ọzọ" ka Chukwudi kwuru na nwgụcha.

Faith Dodeye Bassey, dị afọ 28

Faith Dodeye Bassey

Ebe foto si, Faith Dodeye Bassey

Faith bụ nwa ada na-arụ ọrụ nhazi mmemme nke Bekee kpọrọ "Events Planner"

Ọrụ ya bụ ihe juru ya aka tupu amanye ọnọdụ a; ọbụrụ na ọ naghị agbagharị na-akwado otu mmemme, ịchọta ya ebe a na-eme mme ọzọ.

Mana kemgbe lockdown" bidoro, ọ na-arahụ ụra n'ụbọchị ma mụrụ anya n'abalị. N'ọnụ ya "ị bi sọsọ m metụtara ahụike ụbụrụ m n'ihi na onweghizi ihe m na-atụ anya n'ụbọchị ọhụrụ na-abịa".

"O mekwara m, m na-eche echiche mgbe niile n'ihi na o nweghizi ego na-abata m aka n'ihi na ụgwọ ọnwa m na-abịa bu kwa izuụka maọbụ kwa ụbọchi" ka ọ zara anyị.

"Obodo dị ọcha ebe mmadụ niile nwere ikike ị gagharị ma biri ka o si sọ ha ka m na-atụkarị anya ma ọrịa a gafee kpam kpam."

Deola Adele, dị afọ 27

Deola Adele

Ebe foto si, Deola Adele

Deola na-arụ orụ "Key Account Manager" ma nwekwaa obere ọrụ n'akụkụ. Deola bụkwa ihe ndị Bekee kpọrọ "Fashionista".

"A bụ m mmadụ na-akwado ọfụma tupu m pụọ apụ. Ịhụ kwa ndị enyi m na-amasị kwa m nke ukwuu" ka o kwuru maka ndụ ya tupu "lockdown" ebido.

"Ị ga kwa ụlọoriri dị icheiche, ị ga ụlọ ihe onyonyo nakwa ịpụ apụ enweta onwe m ka na-emekarị na ngwụcha izuụka" ka ọ kọwara.

Deola kwuru na ọnọdụ a emetụtaghị ya n'ụzọ dị njọ nke ukwu.

"Sọọsọ ihe ọ napụrụ m bụ ịga ahịa azụ akwa m na-ere n'ihi na e nwere m otu onye agbatobi m mụ na ya dị na mma m na-aga na be ya".

Deola na-atụ anya ịhụ etu ọrịa si gbanwe ndụ ndị nwere ọrụ Bekee nakwa ndị na-achụ nta ego mgbe ọ ga-ebi kpam kpam.

"A nakwa m atụ anya ịgbanwe ụfọdụ ihe n'ahụike m ma ọrịa a na ihe gbasara ya laa kpam kpam" ka o kwuru.Ihe ndị a gosiri na ọnọdụ "lockdown" nke na-abịa na njedebe nwayọ nwayọ metụtara mmadụ niile n'ụzọ dị icheiche.

Gwa anyị ka o si metụta gị nwa n'igwe ozi anyị na Facebook.