Covid-19 n'otu nkeji: 'Social Distancing' ga-enye aka ịkwụsị mgbasa coronavirus
Ọ bụ eziokwu na gọọmentị Naịjirịa emepeela obodo ka onye ọbụla malite kpagharịwa obere obere, mana ọ dị nnukwu mkpa ka onye ọbụla hie asaa n'anya.
Ugbua abụghị oge ibi ọma maọbụ ikwe n'aka, kama ọ bụ oge onye ọbụla ga-anọrọ onwe ya.
N'ụlọọrụ nakwa ụlọ ahịa, o kwesịrị ka mmadụ niile buru 'social distancing' n'obi.
Cheta na ndụ dị na ntị.
Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Peter Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi



