Covid-19 n'otu nkeji: Artemisia ọ na-agwọ coronavirus?
Onyeisiala mba Madagascar bụ Andry Rajoelina gwara ndị obodo ha ka ha na-aṅụ mmiri ọgwụ e ji Artemisia na ahịhịa ndị ọzọ wee mee iji gwọọ ọrịa coronavirus.
Mana otu 'World Health Organisation' nakwa ngalaba ahụike mba ahụ ekwuola na onweghi nnyocha gosiri na ya bụ mmiri ọgwụ na-arụ ọrụ.

Ebe foto si, AFP
Nnyocha dị icheiche ka na-aga n'ihu n'akụkụ ụwa niile iji chọpụta ma a ga-ahụ ọgwụ nke ga-arụ ọrụ.
Ka ọ dị ugbua, onwebeghi ọgwụ nke e wepụtarala.
Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chukwunaeme Obiejesi



