Deeper Life school saga: Lee ihe ụfọdụ nwa gị na-agabiga na 'boarding school' ị na-amaghị

Ụmụakwụkwọ bi n'ụlọakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

A sị na akwụkwọ na-atọ ụtọ, ọ na-ara ahụ na mmụta mana onye nwere ntachi obi ọ ga-amụta akwụkwọ.

Ebumnobi nne na nna ọbụla bụ ịzụ ụmụ ha n'ụlọakwụkwọ ka ha baa uru mgbe ha ga-eto.

Ha na-eme nke a site n'ụzọ dị iche iche gụnyere ịkpọpụ ụmụaka ka ha biri n'ime ụlọakwụkwọ bụ 'boarding school' n'oge ha nọ na sekọndịrị.

Ọ bụ eziokwu na ịkpọga ụmụaka ka ha biri n'ụlọakwụkwọ baara ezi uru mana e nwekwara ọghọm dị na ya.

Atụmatụ nwata akwụkwọ ibi n'ụlọakwụkwọ bụ otu ihe n'ewu na Naịjirịa dịka otu nwaanyị na-eti mkpu maka ihe nwa ya gabigra n'ụlọ akwụkwọ nke ụlọụka nwe n'Akwa Ibom steeti.

Uru dị na nwata ibi n'ụlọakwụkwọ

Ụlọ obibi ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Ụfọdụ uru dị na nwata ibi n'ụlọakwụkwọ dịka otu onye biri n'ụlọakwụkwọ n'oge nke ya bụ Chukwunaeme Obiejesi sị kọwaa gụnyere;

  • Ịdabere onwe ya - Nwata ibi n'ụlọakwụkwọ na-enye ya ohere ịmụta ọtụtụ ihe n'onwe ya na-abụghị nne na nna kuziri ya. Etu e si arụ ọrụ ụlọ nakwa ọrụ e nyere ha n'ụlọakwụkwọ. Ha na-achịkwa oge ha nke ọma ma dịkwa ike ọrụ. Nwata dị etu a na-adabere n'onwe ya ma mee nkeọma ma o too.
  • Mwulite nka na akara aka ya - Ụdị ụlọakwụkwọ a na-enye ụmụaka ohere ịchọpụta nka ahụ na-amasị ha maọbụ akaraka ha n'ụzọ pụrụiche. Ha na-ahazi ọtụtụ emume ebe ụmụaka na-ama onwe ha aka n'igosipụta nka maọbụ akaraka ha.
  • Ịnabata omenala ndị ọzọ - Ụmụaka bi n'ụlọakwụkwọ na-enwe ohere inwe mmekọrịta n'etiti ụmụaka ibe ha si n'agbụrụ, obodo, nakwa mba ndị ọzọ. Ha na-amụta etu e si anabata ma na-akwanyere onwe ha ugwu. Ụfọdụ na-amụtakwa asụsụ ndị ọzọ na-abụghị bekee.
  • Mwulite ezi agwa - A na-ahụta ụmụaka bi n'ụlọakwụkwọ dịka ndị nwere agwa pụrụiche ma ha gụchaa akwụkwọ. Ha biri n'ogbe ebe e ji eziokwu, nrubeisi, nkwanye ugwu mara. A na-ahụta ha ka ndị na-akpa ezi agwa karịa ndị biri n'ụlọ.

Ọghọm dị na nwata ibi n'ụlọakwụkwọ

Ụmụakwụkwọ Sekọndịrị

Ebe foto si, Getty Images

N'otu aka ahụ Obiejesi gakwara n'ihu rụtụaka n'ọghọm ndị na-esi ibi n'ụlọakwụkwọ dịka;

  • Oke mkpagbu - Otu ọghọm kachasị gbapụta ihe n'ụdị agụmaakwụkwọ a bụ etu ụmụaka ndị nọ na klaasị dị elu si akpagbu ibe ha ndị nọ na klaasị dị ala. Nke a bụ makana ndị nkuzi anaghị anọ ha nso mgbe niile ọkachasị n'ebe obibi ha. Ọtụtụ ụlọakwụkwọ agbaala mbọ ikwụsị nke a mana ọ ka na-aga n'ihu.
  • Nsogbu isi n'ụlọ pụọ - Ọ bụ ihe rara ezi ahụ ị sị nwata hapụ ụlọ gaa biri n'ụlọakwụkwọ. Ọ na-enye ha nsogbu nke ukwuu. Ụfọdụ n'ime ha bụ ndị a na-ezipu mgbe ha ka dị obere. Ọ na-ewe ọtụtụ oge uche ha nakwa ahụ ha ịnabata mgbanwe a. Ụfọdụ nwereike ịrịa ọrịa n'ihi ya.
  • Omume rụrụ arụ: Mgbe ụfọdụ a na-anụ akụkọ banyere ụmụaka bi n'ụlọakwụkwọ imetọ onwe ha 'ụzọ dị iche iche. O nweghi ebe ụdị agwa a adịghị mana ọ dị ka ọ na-aka njọ n'etiti ndị bi n'ụlọakwụkwọ. Ụlọakwụkwọ na ndị nne na nna na-agbasi mbọ ike ịhụ na ụdị agwa a kwụsịrị.
  • Nkewa nwoke na nwaanyị: N'ọtụtụ ụlọakwụkwọ nwoke na-ebi iche ebe nwaanyị na-ebi iche. Ụdị nkewa a mgbe ụfọdụ na-enye nwata nsogbu n'echiche maka na ọ dị mkpa na ụmụaka itokọta ọnụ na-agbanyeghi okike (gender) ha.

Na nchịkọta, e nwere ọtụtụ uru na ọghọm ndị ọzọ na-eso nwata ibi n'ụlọakwụkwọ, ọ dịịrị nne na nna ịmụta nwa ha nke ọma tupu ha ekpebie ịkpọga ya ibi n'ụlọakwụkwọ.