Kenya building collapse: Ụlọakwụkwọ adagbuola ụmụakwụkwọ ma gbuo ụmụakwụkwọ 7

Ebe foto si, @RobertAlai
Ụlọakwụkwọ nke di na Kenya adakwasịla ihe karịrị ụmụakwụkwọ iri na abụọ ebe ụmụaka asaa n'ime ha anwụọla.
Onyeisi ndi uweojii bụ George Seda kwuru na ụlọakwụkwọ akpọrọ Precious Talent Top School bụ nke eji gbamgbam na osisi rụọ dakwasịri ụmụakwụkwọ a.
Onye na-elekọta ya bụ uloakwụkwo bụ Moses Wainaina kwuru na ọ bụ olulu egwuru n'akuku ya bụ ụlọakwụkwo mere ka ọ daa.
O kwukwara na ọnu ọgụgụ ụmụakwụkwọ na-amu akwụkwọ ebe ahu ruru nari asatọ (800) kama ka ọ dị ugbua nanị mmadụ iri abụọ ka ha ma ebe ha nọ.
Ọ kọwara na nke a bu maka na otutu ụmụakwụkwọ gbara ọsọ gbaga na mpaghara Dagoretti mgbe ụlọakwụkwọ a daara.
Ụlọrụ gbata gbata Red Cross Kenya kwuputere nke a n'akara twitter ha ma na-ekwu na akpọgala ụmụakwụkwọ anọ ụlọọgwụ gọọmenti Kenya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ọnye nnọchite anya gọọmenti bụ Cyrus Oguna bịara ebe ihe a mere kwuru na ebugala ụmụakwụkwọ ruru iri ise na asaa (57) kamgbe ụlọ ahụ dachara.
Ụlọọrụ mgbasaozi NTV dị na Kenya wepụtara onyonyo gosiri ebe onye ozi gọọmenti ahụ bụ Cyrus Oguna na-agwa ndị natakaụkọ okwu ma na-ekwe ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ nkwa na gọọmenti ga-
akwụ ego ụlọọgwụ ụmụ ha ọdachị a metụtara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Anyị ka ga-ewetere ụnụ akụkọ a n'uju.









