New Naira scarcity: Ọnụahịa nri adaala mana ego e ji azụ ha adịghị

Onye mgbere

Dịka ụkọ ego na-aga n'ihu na Naijiria, ọnụaghịa nri adaala mana ndị mmadụ ahụghị ego ha ji azụ ya, site nchọpụta BBC Igbo mere n'ụfọdụ ahịa ndị dị n'Ọwụwa Anyanwụ n'ụbọchị Fraide 10 Febụwarị 2023.

Ndị na-ere ahịa n'ọtụtụ ahịa nri gwara ndị ntaakụkọ anyị na njọ ahịa na-eme ha na-agbanyeghị na ọtụtụ ngwa nri adaala, n'ihi na ndị mmadụ ahụghị ego ha ji azụ ahịa.

N'Abakaliki, isiobodo Ebonyi steeti, otu galọnụ mmanụ akwụ bụbụ N30,000 adaala rue 19,000, ọnụahịa akpa osikapa na-ada N16,000 maọbụ 17,000 bu ihe ọ dara n'ọnwa Jenụwarị bụ oge e tinyeburu mmalite mmachi iji ego ochie azụ ahụ; ebe akpa agwa bụbu 50,000 nọzị na N53,000.

"Mana a hụghị ndị na-azụ ya" dịka Patricia Chinenye bụ onye na-agba mgbere nri dịka agwa ,osikapa na mmanụ nri si kwuo.

Chinyere kwuru na ụkọ ego na-adọghachị ha aka elekere azụ.

Damian Akwuegbu, oree ji
Nkọwa foto, Damian Akwuegbu: "Ma ego ochie ma nke ọhụrụ, o nweghị nke anyị na-ahụ."

Damian Akwuegbu, onye na-ere ji n'Abakaliki tụrụ arịrị sị, “Ọnọdụ adịghị mma, o nweghị ihe anyị na-azụ. Ma ego ochie ma nke ọhụrụ, o nweghị nke anyị na-ahụ."

Ụkọ ego dakwasịrị Naijiria kemgbe izuụka ikpeazụ n'Ọnwa Jenụwarị afọ 2023 dịka ndị mmadụ ji ọsọ wega ego ochie ha nwere ụlọakụ mana inweta ego ọhụrụ n'ụlọakụ ghọrọ ịpị ụkwa mkpụrụ adịghị.

"N’ihi ụkọ ego, ndị mmadụ anaghị abịazị azụ anyị ahịa. O nweghịzi ihe a na-azụ.

"Ihe anyị na-ere ugbua bụ ka erete ego, ọ bụghị ka erete uru.”

ụfọdụ anaghị eme transfer."

Na-agbanyeghị na ụkọ mmadụ mmanụ ụgbọala, ọnụahịa nri kwụ ka ọ dị otu ọnwa Jenụwarị. Maọbụ gbatuo maka ụfọdụ nri.

Otu mba ji bụbu 1000, mana ugbua ọ ka bụkwa N1000 na-agbanyeghị ụkọ mmanụ ụgbọala nke butere mbulielu ego ụgbọala.

N'Abuja, ahịa dị mana ahụghị ndị na-azụ

Onye mgbere ngwa nri

N'Abuja, isiobodo Naijiria , ọnụego ụgbọala gbaliri, mana ndị ahịa na-ebe akwa ụkọ ndị na-azụ ha ahịa.

Nwaanyị onye ahịa kpọrọ onwe ya Oriakụ Nneka kwuru, "Taa bụ Fraide, ọ kụọla elekere iri na abụọ nke ehihie mana agbabeghị m aka ahịa."

"Anyị nwere ahịa, mana a hụghị ndị na-azụ. Nke ka njọ bụ na ụfọdụ ngwa ahịa anyị na-emebi emebi"

Agatha Christopher

Ọ kwara arịrị maka ihe ndị na-ere ahịa na-agabiga n'ihi ụkọ ego: " Ị gaa n'aka ndị POS, ha enye gị ego ochie mana mmadụ zụọ gị ihe, inye ha ego ochie dịka ego fọrọ n'ihe ha zụrụ, ha jụụ ị nara ya, hapụ ahịa ha zụrụ gawara."