New Naira: Etu ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ si ata ahụhụ n'inwete ego ọhụrụ

Kamgbe ụlọakụ etiti bụ 'Central Bank of Nigeria' nyere iwu ka e weghachi akwụkwọ ego naịra nke ochie ma kwuo ka ụlọakụ bido inye ego ọhụrụ, ọtụtụ ndị Naijirịa ejirila anya ha hụ ntị ha.
Iwu ọhụrụ a CBN wepụtara butere ntaram ahụhụ nyere ndị Naijirịa dịka ụkọ ego ọhụrụ a dị.
BBC Igbo garuru na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dị iche iche iji hụta etu ndị mmadụ si ebi dịka ụkọ ego a na-enye ha nsogbu.
Etu ndị Abia Steeti na ụkọ ego si ebi

N'Umuahia bụ isi obodo Abia Steeti, otu onye ji POS achụnta ego kwuru na ọ bụ ndị ọzọ jikwa ego achụnta ego na-eresi ha ego ha ji arụ ọrụ kama ha na-atụkwasịrị ha ego karịrị pasentị iri n'ụgwọ ha na-akwụ.
Iji maa atụ, Ugochukwu kwuru na onye chọrọ N100,000 ga-akwụ ego ntụkwasị nke ruru N12,000. Ọ kọwara na ọ bụ nke a mere ha jị ana ego N1,000 n'aka onye chọrọ ịdọrọ N5,000.
Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ naanị N10,000 ka otu ụlọakụ na-enye ha ndị ahịa ya, ma sị na nke ahụ anaghị ezuru ha.
Ọ sị na ụfọdụ ndị mmadụ na-eji akụnaụba ndị ọzọ ha nwe na-abụghị ego agba mgbere iji nata ego.
O kwukwara na ahịa anaghị aga etu o si aga na mbụ ma sịkwa na ego ntụkwasị a dị n'iche n'iche site n'aka onye ha zụtara ya n'aka ya.
Ọnọdụ ụko akwụkwọ ego Naịra n'Ọwere, Imo Steeti.

Otu onye BBC Igbo gbara ajụjụọnụ dịka ọ kwụ n'ahịrị eche ka o were ego ya n'igwe ATM.
O kwuru sị, " Lee anya, ị ga-ahụ na ọtụtụ ndị mmadụ kwụ n'ahịrị eche ka ha were ego ọhụrụ n'Igwe ATM. Ugbua, ọtụtụ ezinaụlọ enweghị ego ha ji eri nri".
Ọ gara n'ihu kwuo," Ị gaa n'ọtụtụ ATM , ha anaghị arụ ọrụ. I gaa kwanụ na nke POS, ụfọdụ na-ana N500 n'elu N5000, ụfọdụ a na-ana N600 n'elu N5000 ebe ụfọdụ na-ana ruo N1000 n'elụ N5000".
O kwuru sị, "Dịka CBN kwuru na ọ bụ n'ụbọchị iri nke ọnwa Jenụwarị a ka a ga-akwụsị ịgbanwe ego ochie kama ị ga-ahụta na anyị etozubeghị ime ya ngwangwa etu a.
Ka gọọmentị dọtịa oge a ga-agbanwe ego ochie a tupu emechaa ntuliaka. Ha mee ya nwayọ nwayọ".
Ihe ndị Ebonyi steeti na-agabiga maka ụkọ akwụkwọ ego Naịra

Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Ebonyi steeti kwuru na ọtụtụ ụlọakụ enweghị ego ha na-enye ndị mmadụ na steeti ahụ. Nke a mere ka ọtụtụ ndị mmadụ nọrọ n'ihu ụlọakụ ndị a na-amaghịzi ihe ọzọ ha ga-eme.
Otu nwaanyị bụ Osinachi Jewel kwuru sị, " Ụfọdụ abịala ebe a ruo otu izuụka, edeecha aha ma enweghị ihe ha ga-ahụta.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ụmụ ha nọ n'ụlọọgwụ ebe ụfọdụ na-ekwu na ụmụ ha akwụbeghi ụgwọ akwụkwọ".

Osinachi gara n'ihu kwuo, " Lee ihe a m ji n'aka, ọ bụ ya ka m na-eri kamgbe abalị abụọ. Ihe m chọrọ bụ ka gọọmentị lee anyị anya ma nyere anyị aka ka ụmụ mmadụ hapụ ịnwụ n'oge anyị erubeghị".
Otu onye na-arụ ọrụ POS kwuru na ndị na-enye ha ego ha ji arụ ọrụ na-agwa ha na ego adịghị.
Onye ọrụ POS a kwuru sị, "Enweghị ebe anyị na-ahụ ego ọhụrụ a. Ụfọdụ ndị ga-asị gị nye ha N10,000 mgbe ị chọrọ N100,000. Ya mere o jiri dị ka a na-azụ ego azụ".
O ji ohere a kwuo, "Ha wepụtara anyị ego anyị tinyere n'ụlọakụ".
Ọnọdụ ndị Rives Steeti ọ ka mma?

Otu ihe ahụ na-ebe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ndị ọzọ na-ebe kwa na Rivers Steeti.
Otu onye bụ Emma Ozuzu gara igwe ATM i were ego kama ndị kwu n'ahịrị chọrọ iwere ego karịrị akarị. Nke a mere ka ọ gaa ndị ji POS enye ndị mmadụ ego bụ ndị na-ana N1500 inye mmadụ N5000.
Ebe ndị ọzọ na-ana N200 n'elu N1000.
N'otu aka ahụ ka onye ji POS enye ndị mmadụ ego kwukwara na ego adịghị n'ụlọakụ.
O kwuru sị," Dịka ego adịghị n'ụlọakụ, anyị na-agagharị achọ ebe anyị ga-eweta ego. Ọtụtụ ndị na-esesa anyị okwu n'ihi na ha chere na ọ bụ anyị kpatara nke a".
Ọ gakwara n'ihu kwuo, "Anyị na-ana onye chọrọ iwere N1000, N200 kama a mbụ ọ bụ N100. Onye chọrọ N10,000 ga-akwụ N2,000".
O ji ohere a rịọ gọọmentị ka ha mara ihe ha ga-eme maka ọnọdụ ụkọ ego na Naijirịa.









