Etu atụmatu ichi Emir nke Aba si bute okwu n'Abia steeti

Ọkammụta Obasi Igwe, Idris Bashir na Justice Azujieogu

Ebe foto si, Obasi Igwe/BBC/Justice Azujieogu

Atụmatụ ndị Ugwu bi n'Abịa ichi nwanne ha Emir nke Aba ebutela okwu dịka ndị okenye Igbo na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu gbarụrụ ihe sị na ọ bụ atụmatụ isi ụzọ azụ ụlọ bute mmanye okpukperechi Alakụba n'Ọwụẁa Anyanwụ.

Nke a bụ dịka akụkọ fesara na ndị Ugwu bi n'Abịa Steeti chọrọ ichi otu nwanne ha a kpọrọ Sarki Shehu Bello , Emir nke Aba.

N'ụtụtụ Wenezde, abalị itoolu nke ọnwa Febụwarị , afọ 2023, Gọọmentị Abịa steeti gbajọrọ ya bụ atụmatụ ma nye iwu ka a kagbuo atụmatụ ahụ.

Ndị Ugwu bịara mmemme echichi

Gọọmentị gara n'ihu nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha hụ e nweghị ohere ka o mezue.

Ebe Gọọmentị Abia kwụ

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu/Facebook

N'ozi mgbasaosi nke Odeakwụkwọ Gọọmentị Abia steeti bụ Chris Ezem binyere aka, goomentị steeti ahụ kwuru na ndị na-akwado ya bụ echiche nke a anataghị ikike ọbụla n'aka gọọmentị steeti ahụ.

O si ahụ kwuru sị, "Anya anyị eruola gọọmentị Abịa steeti eruola na atụmatụ ici otu Sariki Shehu Bello 'Emir nke Aba Emirate Kaunsul na-emeghị ka Gọọmentị mara."

Gọọmentị na-adọ ndị nile tinyere aka n'ihe nke megidere iwu kwụsị ya , e meghị etu a, anyị ga-eji ikike dị n'iwu bagide ha."

Gọọmentị na-enye ntuziaka akagbuola echichi ahụ nke megidere iwu n'ihi na o nweghị ihe dịka Aba Emirate Kaụnsụl na steeti a."

Anyị anabataghị echichi Emir Aba

Justice Ajuzieogu

Ebe foto si, Justice Ajuzieogu

Otu okenye Igbo mabụụkwa onye bụbu onyeisi Ohanaeze Abia steeetị bụ Justice Ajuzieogu ekwuola "O dababghị.Ọ ma mme. Anyi agaghị ekwe."

"O nweghị ihe ọzọ ga-etinye ha nụdị agwa karịa ga ha tinye anyị nile bụrụ ndị ụka Alakụba."

" Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ ga-achọ ime ihe adịghị n'iwu, o nwere ike wepụta ihe ọzọ."

Nke a bụ iji bute ọgbaghara ga-ekposa ndị Igbo isonye na ntuliaka 2023- Ọkammụta Obasi Igwe

Ọkammụta Ọbasi Igwe

Ebe foto si, Obasi Igwe

Okenye Igbo ọzọ bụkwa ọkammụta ‘Political Science na-akụzibu na mahadum 'University of Nigeria Nsukka bụ Ọkammụta Obasi Igwe kwuru na atụmatụ ahụ bụ iji bute ọgbaghara na tigbuo zọgbuo nwereike ịghasa ohere ndị Ọwụwa Anyanwụ isonye na ntuliaka 2023.

Igwe boro ebubo na ọ bụ ụdị atụmatụ iweta Emir na Markudi, Emir nke Oturkpo na Emir Igala so n'ime ihe butere ọgụ n'afọ 1966 dịka o kwuru na ndị Fulani ji ọchịchị iwe na ọbara chọọ iweta ọkpukperechi Islam n'ike .

Ọ sịrị“ Nke a bụ oke nnukwu awamanya na obi ụfụ ka ha ga-esi bịa sị na ha ga-etinye Emir n’Aba.

“Kedụ ihe mere o jiri bụrụ ugbua a chọrọ ime ntuliaka, ihe bụ chọrọ bụ ụzọ ha ga-eji weta ọgbaghara n’ala Igbo, ka e me ihe a ga-eji asị na ndị Igbo egbuwela ndị Ugwu, ka a gbawa ndị Igbo egbe, ka e gbuwa ụmụaka Igbo."

"Nkwado ha bụ ka ndị Igbo ghara iso mee ntuliaka. ”

Ihe Imam Aba Central Mosque sara

Imam ụlọụka Alakụba "Aba Central Mosque

Onyeisi Ụlọụka Alakụba 'Aba Central Mosque' bụ Idris Bashir gwara BBC Igbo na, "Ọ bụghị eziokwu na anyị chọrọ inwe Emir nke Aba.

"Ihe anyị na-eme bụ anyị ka ọ gbasara."

"Ọ bụ nghọtahie ka a ghọtahiere asụsụ ha na ihe ọ pụtara."

"Anyị na ndị anyị bi be ha enweghị nsogbu."