'Anyị na-akpọ ya omekanwaanyị oge anyị na-eto eto'... Ndị mabu Adaolisa Emmanuella

Adolisa Emmanuella na Emmanuel Nwolisa

Ebe foto si, aliyahlakshmi/Itz Emmnuel Nwolisa

Akụkọ apụtala maka onye otu nwoke ghọrọ nwaanyị aha ya bụ Adaolisa Emmanuella, onye lara mmụọ n'izuụka gara aga tupu ndị mmadụ achọpụta na ọ bụ nwoke ghọọrọ nwaanyị nke bekee na-akpọ 'transgender woman'.

Kamgbe akụkọ gbasara nwa ada a pụtara, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwupụta etu ya bụ ihe si gbaa ha gharịị, ọ kachasị ụfọdụ ndị ha na ya nọ n'otu ndị ukwe ụka Katọlik na Port Harcourt, Rivers Steeti, Naịjirịa.

Ụfọdụ ndị mabu Adolisa oge ọ bụ Olisa gwara BBC Igbo na ha ma ya oge ọ na-eto eto dịka onye ọ na-amasị ịkpa agwa dịka nwaanyị, ịgba egwu, ikwe ukwe n'olu nwaanyị, ime ejije dịka nwaanyị, na ihe ndị ọzọ.

Etu ya bụ ihe si mee

Akụkọ a mere n'abalị ụbọchị Satọde, nke bụ ụbọchị anọ nke Febrụwarị 2023, na mpaghara Rumuolumeni na Portharcourt, dịka ndị ụka ahụ si kwuo.

Adolisa Emmanuella nwere ihe mberede okporoụzọ oge o si n'ụlọụka 'St John Catholic Church' na-ala, dịka ndị ụlọụka ahụ mechiri ekpere nke ha malitere ime kamgbe ụbọchị 21.

Oge ihe mberede a mere, ndị ụka gbapụtara ma buga Adaolisa n'ụlọọgwụ ebe dọkịta nọrọ kwuo na ọ nwụọla, ha wee buru ozu ya gawa n'ụlọozu.

Mana ndị na-arụ n'ụlọ ozu chọpụtara na onye e butere bụ nwoke, ọ bụghị nwaanyị dịka ndị butere ya si kwuo.

Nchọpụta a gbara ndị ụka gharịị nke ukwuu dịka ha si kwuo, n'ihi na ha ma Adaolisa dịka nwaanyị kamgbe ọ malitere ịbịa ụka na 'St John' Rumuolumeni.

Site na Nwolisa bụrụzie Adaolisa

Emmanuel Nwolisa na Emmanuella Adaolisa

Ebe foto si, Itz Emmanuel Nwolisa/Emmanuella Adolisa

Nkọwa foto, Emmanuel Nwolisa malitere igosi onwe ya na soshal midia dịka Emmanuella Adaolisa n'afọ 2022
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụfọdụ ndị ma Adaolisa oge ọ na-eto eto gwara BBC Igbo na ezigbo aha ha ji mara ya bụ Olisa Ogoegbunam.

Otu onye kpọpụtara aha ya naanị dịka Ogoo, kwuru na nne na nna Olisa biri na mpaghara American Quaters n'Onitsha, Anambra steeti, bụ ebe ya na ụmụnne ya nọrọ too.

"Ọ bụ onye ihe gbasara ụka Katọlik na-anụ ọkụ n'obi," Ogoo kwuru.

"Ọ nọ n'otu ndị 'mass server', ọ ma agba egwu nke ọma, ịgba egwu na-amasị ya nke ukwuu. Ọ nọ na choir, olu ya ka olu nwaanyị ụtọ."

"A na-akpọ ya omekanwaanyị n'oge ahụ, mana onweghị mgbe uche onye ọbụla gbagara na ọ bụ 'gay'."

"Anyị hụrụ ya dịka onye na-eto eto na-achọ inwere onwe ya aṅụrị oge niile site n'ikwe ukwe na ịgba egwu."

Onye ọzọkwa kọwara Olisa dịka ezigbo mmadụ hụrụ mmadụ ibe ya n'anya.

"Ewepu etu a o si eme ka nwaanyị, ọ bụ nnọọ ezigbo mmadụ na-anaghị achọ nsogbu," ka onye ahụ kwuru.

Otu onye na Facebook aha ya bụ Obele Stanislaus kwuru ka ndị mmadụ kwụsị ịkatọ Emmanuella n'ihi na ọ bụghị ya kere onwe ya n'ụdị ahụ.

"O sighi ya n'aka na ọ hụtara okike ya dịka nwoke-nwaanyị. Ọ bụrụ na ọ bụ mmehie, ọ bụ Chukwu ka a ga-ata ụta, ọ bụghị ya," Stanislaus dere.

Ihe anyị ma maka Adolisa Emmanuella

Emmanuella Adolisa

Ebe foto si, aliyahlakshmi/Instagram

  • Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị na 'Metropolitan Secondary School, Onitsha, nke ndị mmadụ ma dịka Metro. Ụlọakwụkwọ a bụ naanị maka ụmụnwoke
  • Ọ gụrụ Mahadum na Mahadu Port Harcourt
  • O nwere ọzụzụ na ngalaba imepụta na inye ọgwụ (Pharmacy)
  • Ọ bụkwa onye jisi okwukwe Katọlik ike dịka ọtụtụ foto o tinyere na soshal midia si gosi
  • Ọ bụ onye ma ihe gbasara ikwe ukwe nke ọma; ọ makwa akpọ ngwa egwu dị icheiche dịka 'guitar' na 'violin'
  • O nwere akara Facebook abụọ, otu (Itz Emmanuel Nwolisa - o tinyere foto ikpeazụ na 2021) maka oge ọ ka bụ nwoke, nke ọzọ (Emmanuella Adaolisa - o mepere na 2022) maka oge ọ bụ nwaanyị
  • Ọ bụ onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị ndị chọrọ ịgbanwe okike ha (trans activist).

Ọnọdụ ndị bụ 'Transgender' na Naịjirịa

Bobrisky

Ebe foto si, bobrisky222/instagram

Nkọwa foto, Okuneye Idris Olanrewaju bụ onye a ma ama na Naịjirịa na-eke ekike dịka nwaanyị (cross dresser) mana o kwupụtabeghị ka ọ bụ transgender ka ọ bụghị.

Nwoke na-eme ka nwaanyị maọbụ nwaanyị na-eme ka nwoke bụ ihe a na-akatọ akatọ nke ukwuu na Naịjirịa.

Mmekọ ahụ ọbụla maọbụ alụm di na nwunye n'etiti mmadụ abụọ bụ otu okike megidere iwu. Onye dara iwu a nwereike ịga mkpọrọ afọ iri na anọ.

Iwu Naịjirịa anabataghị ụdị mmekọ ọbụla dịka 'Lesbian, gay, bisexual, transgender, maọbụ queer. Mana iwu emegideghị nwoke ike ekike ka nwaanị nke bekee na-akpọ 'cross dressing'.

Otu a ka ọ dịkwa n'ọtụtụ mba Afrịka dị icheiche.

Ọtụtụ ndị na-ahụtakwa nwoke nwere akparamagwa nwaanyị maọbụ nwaanyị nwere akparamagwa nwoke dịka ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu.

Oge ụfọdụ, ezinụlọ onye dị otu a nakwa ndị enyi ya na-akpachapụ ya, n'ihi na ha na-ahụ ya dịka onye na-ebutere ha ihe ihere.

Nke a na-eme ka ọtụtụ ndị nwere ụdị akparamagwa a na-ezo onwe ha ezo maọbụ na-emepụta ya na nzuzo n'ihi egwu maọbụ ihere ihe ha ga-agabiga ma ndị mmadụ chọpụta.

N'ọnwa Maachị afọ 2022, Adaolisa depụtara n'akara Instagram ya sị: "Ịbụ nwoke gbanwere bụrụzie nwaanyị ekwesịghị ime ka ị kwụsị ebunobi gi niile nakwa ihe i nwereike ime n'obodo.

"O teela ha ji eme ka anyị na-ezo ezo. E mekpaala anyị ahụ iji mee ka anyị mechie ọnụ, ọtụtụ egbuola onwe ha n'ihi ya.

"Ekwela ka ha gwa gị onye ị bụ."