LGBT: A ga-akụgbu nwoke na-edina ibe ya na nwaanyị na-edina ibe ya n'okwute

Akụkọ kacha dị mkpa n'ụtụtụ a:

Mba Brunei ga-egbu ndị na-akwaso onwe ha iko.

Taa ka iwu ọhụrụ Sultan Hassanal Bolkiah nke mba Brunei tinyere ga-amalite ọrụ

Ebe foto si, PER-ANDERS PETTERSSON

Nke a bụ iwu ọhụrụ islam nke mba Brunei nyere iji belata nwoke idina ibe ya nakwa nwaanyị idina ibe ya na mba ahụ.

Iwu ọhụrụ a bụ Sultan Hassanal Bolkiah nke mba Brunei tinyere ga-amalite n'ụbọchị anọ nke ọnwa Epụrelụ 2019 ga-emetụta mpụ ndị ọzọ.

Iwu a kwuru na a ga-eji okwute kugbuo nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị na-akwaso onwe ha iko.

Mana ọtụtụ mba ndị ọzọ n'ụwa akatọọla iwu a.

Emeka Ihedioha a họrọla ndị ga-eso na 'Transition Committee' ya

TTC Komittee nke Ihedioha

Ebe foto si, AIC Akwarandu

Ihedioha họpụtara mmadụ narị iri atọ na atọ (bụ 133) nke ndị so n'ime ha bụcha ndị ọgaranya dị icheiche n'obodo makwa ndị na-arụrụ onwe ha.

Ọ gwara ọha gara echichi kọmiti ya na "Anyị ga-agbambọ inwete nkwenye ndị Imo, ka Chineke na-enyere anyị aka, aka anyị ga-akwụrụ ọtọ n'ihu na anyị kwalitere iwu ziriezi na mmejupụta ndọrọndọrọ ọchịchị anyị."

O kwukwara na ọrụ mwulite obodo Imo n'oge a siri ike ma dịkwa ukwu mana o kwenyere na ndị Imo ga-enye ya aka. Ọ bụ kọmiti a ga-ahụ na ihe gara sịrịrị werere na echichi ya dịka Gọvanọ Imo n'ụbọchị Mee 29, 2019.

Anwụchiela ndị na-eme ọgwụike n'Enugwu

Ọgwụike na Trans-Ekulu

Ebe foto si, Dennis Agbo

Calista Udomma Meka bụ ọnụ na-ekwuru NDLEA, ụlọọrụ na-ahụ maka ọgwụike n'Enugwu a kọwala etu ha ji nwụchie ndị ji ọgwụike agbarụ mmiri Na Trans-Ekulu.

Walter Onnoghen

Ebe foto si, @Crevo360_Ng

Nkọwa foto, Ọkaikpe Walter Onnoghen

Okaikpe Ukwu Naịjirịa enyere ezumike bụ Walter Onnoghen azachala ọnụ ya n'ikpe a na-ekpe makana ebubo na okwughi akụnaụba ya n'ụlọikpe "Code of Conduct".

Ọkwaiwu Onnoghen bụ Adegboyega Awomolo kwuburu na ya ga-akpọ "aka ebe ato", mana ọ bụ sọsọ otu onye ka ha kpọrọ ụbọchị mbu nkle ọnwa Epurel Monday.

N'ụbọchị ahụ, ndị ọkaiwu Onnoghen rịọrọ CCT ka agbọta Theresa Nwafor bụ onye ọrụ CCT ka ọ bịa gbara ha akaebe.

Ọ bụ otu onye n'ime ndị ọkaiwu Onnoghen bụ Chris Uche mechiri ịzara ọnụ ya.

Ọ sị: "Anyị enyochara akaebe ndị na-ebo ebubo wetere, nke mere anyị ji kpebie ịwụsa okwu anyị."

A ga-ekwu mgbe a ga-ekpebi okwu n'ihu.

Ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchịehi

Ntọrị mmadụ n'ụzọ Kaduna na Abuja ka na-ewukwa

Agbanyeghị na ụfọdụ na-ekwu na ndị mmadụ ndị ntọrị nwụchikọrọ n'ụzọ si Kaduna gawa Abuja n'ụbọchị Mọnde ruru iri atọ na asaa, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kaduna bụ Yakubu Sabo sị na ọnụọgụgụ ahụ bụ asị ọcha.

Mana o kwetere na ha amaghị mmadụ ole aka ji, dịka ọ bụ otu ụgbọala danyere n'aka ndi ntọ a.

Ụmụakwụkwọ Mahadum

Ebe foto si, Getty Images

Nwaanyị dị afọ iri asaa na asaa so nd gụchara mahadum na Legọs

Otu nwaanyị dị afọ iri asaa na asaa esorola ndị natara asambodo "Guidance and Counselling" na Mahadum Legos.

Nwaanyị a kpara ike a sị na ọ laala ezumike nka, mana ya achọghị ịnọ nkịtị.

Eric Holder

Ebe foto si, LOS ANGELES POLICE DEPARTMENT / HANDOUT

N'ofesi,

Ndị uweojii na mba Amerịka anwụchiela Eric Holder bụ onye a na-enyo na aka ya dị n'ogbugbu onye mbem aha ya bụ Nipsey Hussle.

Cheta na agbakanyere Hussle egbe n'ihu ụlọahịa ya.

Asọmpị Wolves na Man U

Ebe foto si, AFP

N'egwuregwu,

Mmeri Wolves meriri Man Utd emeela ka ha na Tottenham jiri pọịntị iri isii na otu hara n'ogogo Tebulu Premier League.

Isi Man Utd apụtaghị dịka Wolves ji ọkpụ abụọ asatara otu merie ha nke ugboro abụọ n'ime izu atọ.

Gere akụkọ BBC na nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile