Lokpanta news: Etu nghọtahie dị n'etiti ndị obodo na ndị ọchịehi si mee obodo aga-aga

Ndị ọchiehi na Yaro Danladi

Ebe foto si, Getty/Danladi Yaro

Obodo Lokpanta dị n'Okpuru Ọchịchị Umunneochi Abia steeti aghọọla ebe na-eyi ndị mmadụ egwu dịka okwu nchekwa ebe ahụ kpụrụọla afọ n'ala na nsonso a.

Nke a bụ n'ihi nghọtahie dị n'etiti ndị obodo ahụ na ndị ọchịehi ji ebe ahụ mere ebe ha na-ere ehi n'ihi mkpamkpa nke ndị ntọrị na ndị ekperima na-akpa na mpaghara ahụ.

N'izụka gara aga (abalị 25 nke ọnwa Julai, afọ 2022), ndị ntọrị tọrọ ndị nje nọ n'ụgbọala atọ na Lokpanta, ebe elekere ise na ọkara nke mgbede kpụrụ ha banye ọhịa.

Onye nọ nso ebe ihe mere gwara ndị ntaakụkọ na ebe o mere dị nso n'ebe ndịagha na-anọ nche.

Ndị obodo ahụ gara BBC Igbo na nto na ịbanye n'ala ndị obodo na-arị elu mana ndị ọrụ nchekwa anaghị eme ihe kweịsrị iji beleta ya na-agbanyeghị na ebe nche ha dị n'okporoụzọ awara awara dị na Lokpanta.

N'otu izuụka ahụ (ụbọchị 22 ọnwa Julai, afọ 2022), ndị bu egbe wakporo ahịa ehi ndị Ugwu dị na Lokpata gbagbuo ọtụtụ ehi ma gbuo otu onye ọchịehi.

Ndị ntorobia ndị Ugwu mere ngagharịiwe iji gbarụọ ihu n'ihe a mere.

Ebelebe na-egbu n'obodo ahụ kwamgbe kwamgbe dịka ndị obodo na ndị Ugwu bi na mpaghara ahụ na-arụrịta onwe ha aka n'ebubo igbu ibe ha.

Onyeisi ndị Ugwu n'Abia steeti ma bụrụkwa onye na-agba mgbere ehi na Lokpanta bụ Alhaji Yaro Danladi gwara BBC Igbo na mkparịtaụka sị, "E gbuola ụmụnne anyị ọtụtụ ugbua, ọ dịghị mgbe a ga-asị na o nwere ihe anyị mere nke kpatara ya."

Ọ tụrụ arịrị na na nsonso a," e gburu ehi anyị di 19 ebe ha gara ịṅụ mmiri ma gbukwa nwanne anyị chị ha."

" E gburu ya, gbupụ ya isi."

Ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images

Mana dịka ndị mmadụ ka na-enyo ndị aka ha dị n'ihe mere, otu Ipob wepụtara ozi nke kwuru na ọ bụ alaka ọgụ ha bụ ESN mere nke a.

N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful binyere aka, Ipob kelere otu ESN maka ihe ha kpọrọ "Ilụso ndị oyindu egwu na-edewe ahụ na ha bụ ndị ọchịehi."

Alhaji Danladi kwuru na ya tijuru ndị ntorobia ha iwe dị ha n'obi maka ehi na nwanne ha e gburu.

"Ihe anyị chọrọ bụ udo. Arịọla m ụmụnne m onye agala sị ka o megwara. Ha hapụrụ Gọvanọ Ikpeazụ okwu.".

"Ebe ahụ ihe mere , e gbuola ụmụnne anyị gbuo ụmụnne anyị.

"Onye mbịara mbịara agaghị egbu onye nwe obodo."

Eze ndị Ugwu n'Abia steeti

Ebe foto si, Danladi Yaro

Nkọwa foto, Alhaji Danladi bụ Eze ndị Ugwu n'Abia steeti nakwa onye mgbere ehi

N'ọnwa Mee, Naijiria dere jiji dịka akụkọ gbara na ndị ntọrị tọọrọ onyeisi Ụka Methodist na Naijiria bụ Dr Samuel Kanu Uche n'okporoụzọ Lokpanta.

E mechara tọhapụ ụkọchukwu ahụ na ndị ogbo ya mmadụ abụọ dịka ha kwụchara otu nde narị naira iji gbara isi onwe ha.

Na mkparịtaụka ya na ndị ntakụkọ nwere ka o nwerechara onwe ya, Uche boro ebubo na ọ bụ ndị ọchịehi bụ ndị tọọrọ ya.

Ndị ma ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara ihe na-eme n'ime obodo kọwara na ndị omekome na-ezo n'aha ndị na-agba mgbere eme mpụ.

Mana Alhaji Danladi onye kwuru na " anyị so gọọmenti steeti gaa a kụtusia ebe ndị omekome na-anọ, gara n'ihu kwuo sị, '"Anyị enweghị ike izo onye ohi."

Ndị bi nso ebe ahụ kọwara na ọ bụ ka ala obodo ahụ dị mere ụdị mkpamkpa ahụ ji akpa.

Ndị ntorobịa Ugwu na-eme ngagharịiwe na okporoụzọ Lọkpanta

Ebe foto si, screengrab

Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ihe mere Lokpanta ji bụrụ akwụ ndị ntọrị na ndị omekome bụ maka na "ndagwurugwu dị n'aka nri na aka ekpe n' obodo ahụ nke mere o ji dịị ndị omekome ohere ikpa ike."

N'iji zaa oku ndị mpaghara ahụ na-akpọ maka nsogbu nchekwa, n'ọnwa Juun, Gọọmentị Abia steeti gara kụkpọọ ụlọ ndị akwụna na ụlọ akụrakụ dị n'ahịa Lokpanta.

Gọọmentị kwuru na ihe ha jiri mee nke a bụ na ndị na-ere ọgwụ ike na ndị ntọrị ji ya mere ebe ozuzo.

Nke na-abịa dịka ndị ntoroọbịa mpaghara ahụ mechara ngagharịiwe kpọọ ọkụ ka Gọọmentị bupụ ahịa ehi n'ebe ahụ.

Ha kwuru na ahịa ahụ nyere ohere ka ndị ntọrị na ndị omekome ndị ọzọ na-akpa ike na mpaghara ahụ.

Mbọ BBC Igbo gbara inweta ozi n'ọnụ ndị uweojii Abia steeti amịtaghị mkpụrụ.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Geoffrey Ogbonna azaghị ekwentị ya.

Ihe i kwesịrị ịma maka ahịa ehi Lokpanta

Ahịa ehi Lokpanta, n'Abia steeti dị n'okporoụzọ awara awara si Enugwu gawa Pọtakọt n'agbata Enugwu n'Abia steeti.

Ndị ma ihe ekwe na-akụ kọwara na ọ bụ Gọọmentị Abia steeti oge ọchịchị Orji Uzo Kalu hiwere ahịa ehi na Lokpanta.

Dịka Alhaji Joda si gwa BBC Igbo ọ bụ n'abalị 25 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2005 ka e si Okigwe bute ahịa ehi ahụ na Lokpanta.