Etu ụlọikpe si tụọ nwaanyị ji ụmụaka ụmụnwaanyị agba mgbere akwụna mkpọrọ afọ 21

Ebe foto si, Phemmie Chidimma
Ụlọikpe majie dị n’Ọka, isiobodo Anambra steeti atụọla otu nwaanyị mkpọrọ maka iji ụmụaka arụ ọrụ nakwa ịkpọta ụmụaka ụmụnwaanyị were ha na-agba mgbere akwụna.
A nwụchiburu Success James gbara afọ 35 n’Ọnịcha n'ọnwa Disemba afọ 2022 ma kpụbụ ya ụlọikpe majie dị n'Ọka maka ebubo asatọ metụtara ịkpa nkata zuru ụmụaka, tinye ha n'ọrụ nakwa iji ha agba mgbere akwụna.

Ebe foto si, Phemmie Chidimma
Majie kpere ya bụ ikpe bụ Genevieve Osakwe mara James ikpe n'asaa n'ime ebubo asatọ ahụ ma nye iwu ka atụọ ya mkpọrọ afọ gbakọtara dị afọ 21; maka ebubo nke mbụ afọ ise, nke abụọ afọ ise; nke atọ afọ abụọ; nke anọ, afọ anọ; nke ise, afọ abụọ; nke asaa, afọ abịọ, nke asatọ otu afọ.
Ọkaikpe Osakwe enyeghị ya ohere ịda nha mana o kwuru na nwaanyị ahụ a tụrụ mkpọrọ ga-anọkọ afọ ndị a ọnụ.

Ebe foto si, Anambra state Government

Ebe foto si, Anambra State Government
Cheta na n’ọnwa Disemba afọ 2022, Ministrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ọdịmma zọpụtara ụmụaka anọ dị n’agbarta afọ 13 na 15 bụ ndị ndị Akwa Ibom nwaanyị lara tinye n’ọrụ akwụna akwụna dịka o kwere ha nkwa ị kpọ ha gaa Agbọ dị na Delta steeti ebe ọ sị ọ na-ere mmanya nke a na-akpọkarị ‘beer parlour”.







