'Ọ bụghị odibo m kama ọ bụ nwa nwa m ka m tigburu, tọgbọọ n'ọhịa'

Nwaanyị gburu nwa nwa ya

Ebe foto si, Nigerian Police

Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na ha na-enyocha otu nwaanyị a sị tigburu nwa nwa ya bụ onye binyere ya ma tunye ya n’ọhịa.

Nwaanyị a anyị achọghị ịkpọ aha ya dị afọ 37, onye bi na Nibo, Anambra steeti tigburu nwa nwa dị naanị afọ atọ nke a kpọrọ Ifechukwu Udogu, ma tụnye ozu ya n’ọhịa dị n’Amikwo Ọka, isiobodo Anambara steeti.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na nwaanyị a tigbuuru nwa odibo ya, tunye ozu ya n’ọhịa mana nchọpụta BBC mere gosiri na ọ bụ nwa nwa ya nke ada ya nwaanyị ahụ gbara naanị afọ 19 mụrụ site n’ime mkpuke.

N'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, nwaanyị ahụ kwuru:

“E tiri m ya (Ifechukwu Udogu) ihe, ihe dọwa ya m buga ya ụlọọgwụ, ọ nwụnarị m, m tụrapụ ya ebe a”

Kedụ ka akụkọ a siri gbaa n’ọha?

Nchọpụta BBC Igbo gosiri na nwaada mụrụ nwa ahụ ebinyeghịrị nne ya dịka ọ nọghị ma nne ya ma nwa ọ mụrụ nso.

Ọ bụ ụlọakwụkwọ nwata ahụ gbaara ndị ụlọọrụ gọọmentị na-ebuso ịtụ mgbere mmadu agha na Naijiria ama. Nke a bụ National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP) nke gbara mbọ hụ na aka kpaara nwaanyị ahụ.

Onye nchikọta Naptip n’Anambra steeti bụ Judith Ibadin kọwara BBC Igbo na nwaanyị ahụ “kpọgara nwata ahụ ụlọakwụkwọ ọtaakara maka idebanye aha, yinye ya akwa ekpomọkụ ma gwa ndị nkuzi ha eyipụkwana ya akwa si n’oyi na-ama nwata ahụ.”

“Oge ekpomokụ mewere nwata ahụ, onye nkuzi yipụrụ ya akwa ekpomọkụ ahụ nwere hụ apa nakwa ọnya juru nwata ahụ dị afọ atọ ahụ nke mere ka ha wetara anyị mkpesa otu izu ụka gara aga.”

Naptip maara imi n’ala chọpụta nwaanyị ahụ ma n’akụkụ Nibo dịka ọ kpọọrọ ha gaa n’ọhịa ebe ọ tụfuru ozu nwa nwa ya ahụ.

Ibadin kwuru na Naptip ahanyela nwaanyị ahụ nye n’aka ndị uweojii.

Isaa okwu ebe nwaanyị ahụ nọ, o kwuru:

“Mbụ ọ bụbụ mkpesa nke metụtara ịgba mgbere mmadụ na imerụ nwata nnukwu ahụ bụ ihe kpọbatara anyị n’okwu mana ụgbua ọ ghọọla okwu ịgbụ ọchụ ya mere anyị ji nyefee ya n’aka ndị uweojii.”

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ya bụ ihe mere n’ezie ma kwuo na ha jichiri nwaanyị ahụ dịka nnyocha na-aga n’ihu.

Ikenga kwuru “Nwata ahụ nke a pịagburu dị naanị afọ atọ, anyị anwụchịela nwaanyị a na-enyo n’okwu a dịka anyị na-emezị nnyocha ka ya bụ ihe siri mee.”