Child abuse: 'Anyị anwụchiela di na nwunye megburu nwata -Ndi uweojii Anambra steeti

Olisaemeka

Ebe foto si, Anambra Government

Ndị uweojii Anambra steeti sị na ha anwuchiela di na nwunye megburu nwa nwoke ya na ha bị n'Onicha abalị ole ma ole gara aga.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga bú onye gbara amaa a sị na o nwere ajọ ihe ya bụ nwa nwoke mere ga-enye ndí ya na ya bi ikike imeru ya ahụ otu ahụ.

Cheta na a gbapụtara otu dị afọ iri na asaa, onye Nnewi n'aka nwanne nne ya na nwunye ya dị ji igwe e ji ede akwa d ọkụ nakwa ihe ndí ọzọ dí nkọ boo nwata ahú aba di egwu n'ahụ.

Etu Gọọmentị Anambra si gbapụta nwata a na-emegbu

Azụ nwata a na-emegbu emegbu

Ebe foto si, Anambra Government

Gọọmentị Anambara steeti agbapụtala otu nwata onye Nnewi bụ onye nwunye nwanne nne ya bi n'Ọnicha na-emekpa ahụ na nsonso a.

Kọmishona steeti ahụ na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ Ify Obinabo bụ onye gbapụtara nwata ahụ dị afọ 17 ma kpọta ya n'Ọka, isiobodo Anambara steeti.

Ahụ Olisaemeka

Ebe foto si, Anambra Government

Nke a na-abịa dịka ihe onyonyo fegharịrị na soshal media na nsonso a gosiri nwata apa ọnya juru ahụ.

Nwata ahụ onye kọwara na ọ bụ nne ya kpọnyere ya nwanne ya nwoke bi Ọnicha ka ya na ya biri n'Ọnwa Febụwarị kwuru na ọ na-akwụba ya agụụ ma na-etikwa ya ihe tinka tiri pan.

O kwukwara na kemgbe ọnwa Febụwarị ahụ na ezinaụlọ ahụ ekweghị ebidoro ya akwụkwọ. Kama nwunye nwanne nne ya na-eti ya ihe ma were igwe dị ọkụ , rezọ na ihe ndị ọzọ dị nkọ akụ ya ihe mgbe ọbụla. Ka ọ dị ugbua, a kpụpụla nwoke ahụ na nwunye ya ụlọikpe.

Ahụ Olisaemeka

Ebe foto si, Anambra Government