Bullying in schools: Etu mmekpa ahụ n'aka 'senior' n'ụlọakwụkwọ si kụọ m ngwọrọ - Victor Nwankwo

Aha onyonyo, Etu mmekpa ahụ n'aka 'senior' n'ụlọakwụkwọ si kụọ m ngwọrọ - Victor Nwankwo

Victor Nwankwo so na ndị nwere ụbụrụ akwụkwọ na klaasị ya oge ọ banyere ụlọakwụkwọ sekọndịrị.

Mana ebumnuche ya niile gbasara agụmakwụkwọ kụrụ afọ n'ala n'otu ụbọchị, n'afọ 2004, dịka otu onye ka ya na klaasị tiri ya ihe ma merụọ ya ahụ.

"Oge m gụrụ akụkọ maka Sylvester Oromoni, anyammiri juru m anya maka na o chetaara m ihe mere m," Nwankwo kwuru.

Sylvester Oromoni bụkwa nwatakwụkwọ akụkọ kwuru n'ọdị nso a na ụmụakwụkwọ tiri ya ihe merụọ ya nnukwu ahụ, nke butere ọnwụ ya.

Nwankwo gara n'ihu kwuo na nwata akwụkwọ ahụ bụ 'senior' buliri ya elu, sụọ ya isi n'ala.

Nke a gbajiri ọkpụkpụ azụ ya nke mere na o nweghị ike ịga ije ọzọ.

Ugbua, Victor Nwankwo alụọla nwaanyị, mụta otu nwa nwaanyị, mana ihe ọ gabigara n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị apụbeghi ya n'obi.

"Ọnọdụ m a napụrụ m ihe niile, mana naanị ihe ọ napụghị m bụ olileanya m na okwukwe m nwere na Chineke," O kwuru.

Nwankwo nyere ndụmọdụ ka ndị nne na nna na azụlite ụmụ ha nke ọma, maka na ọ bụ n'ezinụlọ ka ezi akparamagwa na-amalite.

"Ụlọakwụkwọ abụghị ebe a na-azụ mmadụ maka omume ọma, ọ na-ebido n'ezinụlọ.

Mmekpaahụ n'ụlọakwụkwọ Naijiria

Akụkọ gbasara mmekpa ahụ n'ụlọakwụkwọ, nke a na-akpọ 'school bullying' na bekee, na Naijiria dịka ọ na-agbali elu ugbua.

Nnyocha gosiri na ihe karịrị pasentị 67 n'ụmụakwụkwọ na Naijiria na-agabiga mmekpa ahụ.

Otu nnyocha ahụ gosikwara na ụmụakwụkwọ na-emekpa ibe ha ahụ dị naanị pasentị iri atọ na asaa (37%).