Epidermal Nevus Syndrome: 'Ụmụaka ibe m na-akpọ m anụọhịa n'ihi ọrịa m nwere' - Sopuruchi Okorocha

Aha onyonyo, Sopuruchi Okorocha Nkemakolam

Olileanya na nrọ Sopuruchi Okorocha Nkemakolam bụ na ọ ga-abụ onye na-eme ihe nkiri nakwa onye ọkpa ọchị a ma ama.

Mana ọrịa akpụkpọ ahụ o nwere ekweghị ya jisie ike n'ihe ahụ bụ nrọ ya.

Ndị ọkachamara kwuru na Sopuruchi nwere ọrịa a na-akpọ 'Epidermal Nevus', nke bụ ọrịa na-emetụta akpụkpọ ahụ mmadụ.

Nne Sopuruchi, Anastesia Okorocha, kọọrọ BBC na oge ọ mụrụ ya ọhụrụ, o nwere obere mburupụta ụwa n'aka ya nke na-acha ọbara ọbara.

Ndị dọkịta gwara ya na ya bụ ihe ga-ala ma Sopuru na-etolite.

Mana, ọ dịghị etu ahụ. Ya bụ ihe gara n'ihu na-eto dịka afọ Sopuru na-agbalite.

N'ime afọ abụọ gara, ọ gbasara nke ukwuu n'ahụ Sopuru niile: ihu ya, aka ya, afọ ya, obi ya, azụ ya, ebe niile.

"Ọ na-akọ m ụkọ nke ukwuu, ọ na-ekpo m ọkụ, na-esikwa isi," Sopuru kwuru.

"Ụmụaka ibe m ji ya akparị m, na-akpọ m anụọhịa nakwa iyi ndị ọzọ."

"Nke a mere ka m na-ewe iwe ọkụ oge niile, obi anaghị adị m mma."

"Ugbua, anaghị m apụzi ezi, n'ime ụlọ ka m na-anọ oge niile, achọghị m mkparị mmadụ."

Gịnị bụ 'Epidermal Nervus'?

Ụlọọrụ 'National Library of Medicine' nke mba Amerịka kọwara ọnọdụ a dịka "ụdị akpụ maọbụ akpụkpa na-apụta n'ahụ mmadụ, mana ọ bụghị kansa."

Ihe na-akpata ya bụ oge akụrụngwa 'cell' dị n'akpụkpọ ahụ mmadụ adịchaghị etu o kwesịrị ịdị.

A na-ahụkwarị ọnọdụ a ngwa ngwa a mụpụtara nwata, maọbụ ọ pụta oge nwata ka dị obere.

N'ime otu puku ụmụaka a mụrụ n'ụwa, naani ihe dịka atọ n'ime ha nwere ike inwe ụdị ọnọdụ a, ya mere e ji akpọ ya ọnọdụ anaghị ahụ kwadaa (rare disorder).

Ọrịa a abụghị ọrịa na-esi n'aka nne na nna efesara ụmụ ha, kama ọ bụ mgbanwe dị na 'gene' ma nwaanyị dị ime nwere ike ibute ya.

Gịnị ka dọkịta kwuru maka ọnọdụ Sopuru

BBC kpọtụụrụ Dọkịta Nkiru Onodugo, onye bụ ọkachamara n'ahụike akpụkpọ ahụ mmadụ n'ụlọọgwụ nkuzi nke Mahadum Naịjirịa dị na Ituku, Enugwu Steeti.

Ọ kọwara na 'Epidermal Nevus' abụghị ọrịa a na-ahụ kwadaa.

"N'ime afọ iri m rugoro ọrụ dịka dọkịta, ndị m hụrụla nwere ụdị ọrịa erubeghị mmadụ iri," Dkt Onodugo kwuru.

"Ụzọ ka mma iji gwọọ ọnọdụ a bụ 'plastic surgery', n'ihi na ọ gbasaala n'ahụ ya niile."

"E nwekwara ọgwụ nwata a nwere ike ịṅụ, mana amabeghị kpọmkwem ma ya bụ ọgwụ ọ ga-arụ ọrụ."

Nne Sopuru sị na ha agaala hụ ndị ọkacha mara ndị kwuru na a ga-awa Sopuru ahụ iji wepụ ihe ndị ahụ.

"Mana ha sị na ego ya ga-eru nde naịra iri," Anastesia kwuru.

Ọ sị na ezinụlọ ha na-arịọ ndị ọbụla ọnọdụ Sopuruchi metụrụ n'obi, ka ha biko gbatara ya ọsọ enyemaka.