Okpụrụkpụrụ okwu dị n'akwụkwọ mkpata na mmefụ akụ 2023

Onyeisiala Muhammadu Buhari gụrụ bọjeti ya

Ebe foto si, Presidency/Twitter

Onyeisiala Muhammadu Buhari gụpụtara ihe a ga-eji ego mee na Naịjirịa n'afọ 2023 n'ihu ndị ọgbakọ omeiwu Naịjirịa taa bụ Fraịde 2022.

Nke a bụ bọjetị nke ikpeazụ ya putu ọ pụọ n'ọkwa n'afọ 2023.

Buhari sị na gọọmentị ga-emefụ ego dị tarị Naịra dị N20.51T.

Ego a bụ ego kacha ukwuu Naịjiria mapụtagoro iji rụọ ọrụ kemgbe ụwa.

Aha ya bụ atụmatụ bụ " Budget of Fiscal Sustainability and transition", nke pụtara atụmatụ mkpata na mmefụ akụ nke idozi obodo nakwa nke ngabiga".

Buhari sị na atụmatụ a bụ maka imezi ihe dị oke mkpa nakwa ịme ka inyefe ọchịchị n'aka ndị ọzọ dịkwa nfe.

Ihe a bụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n'ime ya bụ akwụkwọ ọ gụpụtara a ga-eji ego mee n'afọ ọzọ.

Ego mkpata

Onyeisiala Muhammadu Buhari gụrụ bọjeti ya

Ebe foto si, Presidency/Twitter

  • Onyeisiala sị na n'ime ọkpụrụkpụ ego a akpọrọ aha na nke gọọmentị ga-akpatali ha ji aka bụ Tari Naịra 16.87 na 2023.
  • Tari Naịra 11.09 bụ nke a ga-ekesa maka ịkwụ ụgwọ na ndị ọzọ.
  • Ebe Tari Naịra 9.73 bụ nke a ga-etinye n'ọrụ.
  • Ego a rụta n'ọrụ mmanụ agbidi bụ Tari Naịra 1.92.
  • Ego ga-esi be ọzọ naabụghị n'ọrụ mmanụ agbidi bụ Tari Naịra 2.43
  • Nke ga-esizi n'ahịa ndị ọzọ gọọmentị na-azụ pụta buru Tari Naịra 2.21.
  • Ego ga-esikwa ebe ndị ọzọ pụta bụ Ijeri Naịra 762.000 nakwa Ijeri Naịrịa 2.42.

Ego mmefu

Onyeisiala Muhammadu Buhari gụrụ bọjeti ya

Ebe foto si, Presidency/Twitter

  • Nke ha kpọrọ "Statutory Transfer" bụ ijeri Naịra N744.11 ebe ọzọ ha kpọrọ "Non-debt Recurrent Costs" bụ Ijeri Naịra N8.27.
  • Ụgwọ ọnwa ndị ọrụ na ego ndị lara ezumike bụ Tarị Naịra N4.99 na Ijeri Naịra N854.8.
  • Ego a ga-eji rụọ ọrụ ihe mmepe obodo (Ụzọ na ihe ndị ọzọ) traị Naịra N5.35.
  • Ego 'overhead' Tari Naịra N1.11
  • Ego a ga-eji kwụọ ụgwọ bụ Tarị Naịra 6.31.
  • Ego "sinking Fund" ijeria Naịra N247.73

Ego mgbazite

  • Ego niile a ga-azite bụ tarị asatọ na iri asatọ (N8.80).
  • Ego ga-esi ngwogwo na ọrụ gọọmentị ga-ere nke a kpọrọ "Privatization" bụ Ijeri Naịra narị abụọ na isii na ụma (N206.18).
  • Nakwa Ijerị Naịra otu na ụma iri asaa na asaa (N1.77) bụ ega a ga-etibe na mba ofesi.
Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post