Etu ọtụtụ ụlọọrụ gọọmentị si fanye ego na Budget 2021

Ebe foto si, Presidency/Twitter
Ụfọdụ ndị ọkachamara n'okwu gbasara akụnụba akatọọla etu ngalaba gọọmentị dị icheiche si afanye ego na bọjeetị n'ụzọ ezighi ezi.
Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ BudgIT, ụlọọrọ kwụụrụ onwe ya na-ahụ maka ikwụba aka ọtọ akụnaụba na Naịjirịa, wepụtara nnyocha ha mere n'ime bọjeetị Naịjirịa nke afọ 2021.
Uchenna Uwaleke, onye bụ ọkammụta n'okwu gbasara Akụnụba, gwara BBC Igbo na ụdị ihe a bụcha ụzọ gọọmentị si emefu ego n'ụzọ enweghị isi, n'agbanyeghị na ha na-ebe akwa na ego adịghị iji rụọ ọrụ.
Uwaleke kwuru sị: "Enweghị ezi nchekwa, oke ọnụahịa ọtụtụ ihe, na enweghị ọrụ, bụcha ụdị ihe ndị a na-akpata ha."
"Ọrụ kwesịrị ịbụ nde naịra iri, ha etinye ya ụzọ abụọ maọbụ atọ, ọ bụrụzie nde naịra iri ise."
"Ego a ga-eji rụọrọ ụmụ mmadụ ọrụ, gọọmentị a na-awufu ya. Nke a jọgburu onwe ya"
Gịnị ka a ga-eme ka ụdị ihe a kwụsị?
Ọkammụta Uwaleke kwuru na otu ụzọ iji kwụsị ihe dị otu a bụ ka gọọmentị mee ka usoro bọjeetị doo onye ọbụ anya, ka ndị ọkachamara soro tinye ya anya.
"N'ụzọ dị otu a ka a ga-esi chọpụta ihe ndị ahụ ekwesịghị ịdị na bọjeetị ma wepu ha."
"Tupu bọjeeti eruo n'aka ndị omeiwu, e kwesịrị ka ndị ọkachamara tinye ya anya."
"E kwesịrị ime ka ụlọọrụ 'Auditor General' sie ike ka o wee nwee ike ịrụ ọrụ ya nke ọma."
Gịnị ka BudgIT kwuru gbasara bọjeetị 2021?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ụlọọrụ BudgIT sị na nnyocha ha mere gosiri na ụfọdụ ọrụ gọọmentị sị na ha ga-arụ n'afọ 2021 pụtara ugboro abụọ n'ime ya bụ bọjeeti.
Ha kwuru na ọrụ dị otu a gbara mkpị n'ime bọjeeti 2021 ruru 316 n'ọnụọgụgụ, nke ga-eri ego dị ijeri naịra iri atọ na itoolu na ụma N39( N39.5bn).
Ọrụ 115 n'ime ọrụ ndị a ndị ahụ e biri ụzọ abụọ si n'aka ministrị na-ahụ maka ahụike.
Nnyocha a gara n'ihu gosi na ego e tinyere na ngalaba nchekwa n'afọ 2021 dị otu tarị naịra na ụma itoolu N1.97tn nke ji pasentị iri na anọ karịa nke afọ 2020 dị N1.78tn.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Akwụkwọ a sị na ngalaba ndị ọzọ na-abụghị maka nchekwa na-asị ka e nye ha ego nchekwa a kpọrọ 'security vote'.
N'afọ 2021 a ọtụtụ ngalaba gọọmentị dị 117 natara ego nchekwa 'security vote' dị N24.3bn na-agbanyeghi na ọtụtụ n'ime ha dị mbụ nwe ego amawapụtara maka nchekwa.
Ụlọọrụ a chọpụtara na mkpata na mmefe ngalaba gọọmentị ndị ọzọ nyere nwechachara ohere ebe a ga-esi zupu ego.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
N'ihi nke a, onyeisi ụlọọrụ a bụ Gabriel Okeowo gwara gọọmentị etiti ka ha gbaa mbọ mechisie ohere ndị a dị na mkpata na mmefu afọ 2021.
Ọ sị na ọ bụrụ na a hapụ ohere ndị a, na mpụ na nrụrụaka ga-ejupụta na mkpata na mmefu nke afọ 2021.
Lee ụfọdụ ngalaba afanyere ego na bọjeetị afọ 2021
I ji ministri na-ahụ maka ahụike maa atụ;

Ebe foto si, BudgIT

Ebe foto si, BudgIT

Ebe foto si, BudgIT

Ebe foto si, BudgIT









