Ụlọomeiwu ga-agbakọ n'izuụka n'abịa

Ebe foto si, AFP
Ụlọomeiwu nta na ukwu ga-apụta n'ezumike afọ ha n'izuụka n'abịa ma nwee ọgbakọ maka bọọjetị nta akpọrọ 'Supplementary budget' na bekee.
Osote onye na-ekwuchitere ọnụ ụlọomeiwu nta bụ Yusuff Lasun bụ onye gwara ndị ntaakụkọ ihe a n'Abuja
O kwuru "anyị na ngalaba n'ahụ maka ntulika bụ Inec enwela nzụkọ imeụlọ, ya mere n'anyị nwereike ị gbakọ n'ụbọchị tuusde maọbụ wensde n'izuụka n'abịa"
Ihe ndị ha ga-eleba anya n'ọgbakọ ha gụnyere ego INEC ga-eji hazi ntuliaka nke 2019, nakwa mwakpo ndị DSS mere ụlọomeiwu n'ụbọchị ole na ole gara aga.
Laolu kọwara na ezumike ndị ụlọomeiwu gara bụ nke kwesiri ekwesi n'ọbụghị nke aghụghọ dịka ụfọdụ mmadụ na-eche.
Cheta na ndị uweojii pụrụiche bụ DSS gbochiri ụfọdụ ndị omeiwu ị banye n'ụlọọrụ ha n'ụbọchị Tuusde nke bụtere ọchụchụ onyeisi ha bụ Lawal Daura.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









