National Assembly: Ndị DSS gbochiri ndị omeiwu ibanye ụlọọrụ ha

Aha onyonyo, National Assembly: Ndị DSS gbochiri ndị omeiwu ibanye ụlọọrụ ha

N'ụtụtụ Tuusde, Ọgọst 7, 2018, ụfọdụ ndị DSS gbochiri ihu ụlọọrụ ndị omeiwu ka ha ghara ịbanye.

Onye na-ekwuchite ọnụ Bukola Saraki bụ Olu Onemola, kwuru na ndị DSS gbochiri ha ibanye maka na ha chọrọ iji ohere ahụ nwee ọgbakọ ga-eme ka ha chutuo Saraki na Ike Ekweremadu bụ osote ya, n'oche.