Domestic violence: Etu nwoke si tigbuo nwunye mụụrụ ya ụmụ asaa n'Ebonyi Steetị

Aha onyonyo, Domestic violence: Etu nwoke si tigbuo nwunye mụụrụ ya ụmụ asaa n'Ebonyi Steetị

Aka ndị uweojii Ebonyi Steetị akparala otu nwoke a na-ebo ebubo na o tigburu nwunye ya mụụrụ ya ụmụ asaa.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steetị ahụ bụ Loveth Odah sị na nke a mere n'ezie kama na nwoke ahụ agọọla na aka ya adịghị n'ọnwụ nwunye.

Ọ sị na ha emeela nyocha banyere ya ma kpọpụ nwoke ahụ n'ụlọikpe ka ọ gaa zara ọnụ ya.

Kedụ ka ihe a jiri mee?

Anulika Uguru

Sampson Oko Nweke bụ onyeisioche otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye a kpọrọ 'Human Right Defenders' n'Ebonyi

sị na nwaanyị bụ Anulika kpọtụrụ ha na di ya bụ Sunday Uguru na-eti ya ihe n'ụbọchị 19th Eprelụ.

Ọ sị na ọ kpọrọ nwaanyị a n'ekwentị ma sị ya bịa n'ụlọọrụ ha n'ụbọchị 26 Eprelu n'elekere iri na abụọ nke ehihie.

"E chere m nwaanyị a ruo elekere atọ nke ehihie, m wee kpọo ekwentị ya nwa zara ma nyefee ya n'aka nwanne ya bụ onye gwara m na Anulika anwụọla."

Akpọrọ m ndị uweojii anyị gara nwuchie di bụ onye ka nọ n'aka ndị uweojii ugbua.

N'otu aka ahụ nwanne Anulika bụ Chinwe Nwebonyi kọwaara BBC Igbo na ọtụtụ afọ ka di Anulika na-eti ya ihe n'ụzọ dị iche iche.

Ọ sị na o nwere mgbe ndị ezinaụlọ ha mechara gaa kpọrọ Anulika si n'ụlọ di ya pụọ mana di ya mechara bịa rịọ arịrịọ ka Anulika lọghachị maka ụmụaka ya.

"Sunday rịọrọ anyị na ọ gaghị etizi nwunye ya bụ nwanne anyị nwaanyị ihe ọzọ, nke mere anyị jiri kwee ka ọ laghachịkwuru ya.

"Mana anyị pụtaziri n'ụbọchi iri abụọ na isii nke ọnwa Eprelụ, nwa ya kpọọ anyị na e tigbuo nne ha bụ Anulika.

"Anyị chọrọ ka gọọmentị kpee ikpe ziri ezi banyere ọnwụ ya".

Cheta na akụkọ banyere nwoke itinye nwunye ya ihe n'ezinaụlọ bụ akụkọ a na-anụkaarị kwa mgbe kwa mgbe.

Na nso nso a ka akụkọ pụtara na oti egwu ụka a ma ama bụ Osinachi Nwachukwu nwụrụ site n'ihe di ya bụ Peter Nwachukwu tiri ya.

Ugbua di ya ka nọ n'aka ndị uweojii dịka nyocha ka na-aha n'ihu.